Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 21:1-30

  • Mgbe Devid gụrụ ndị Izrel ọnụ ọ na-ekwesịghị ịgụ ha (1-6)

  • Jehova tara ndị Izrel ahụhụ (7-17)

  • Devid rụrụ ebe ịchụàjà (18-30)

21  N’otu oge, Setan* kpebiri imesi ndị Izrel ike. O mere ka Devid chọọ ịgụ ndị Izrel ọnụ.+  Ọ bụ ya mere Devid ji gwa Joab+ na ndị isi ndị Izrel, sị: “Gaanụ gụọ ndị Izrel ọnụ, malite na Bia-shiba ruo Dan.+ Unu gụchaa, unu abịa gwa m, ka m mara ole ha dị.”  Ma Joab sịrị: “Ka Jehova mee ka ndị ya hikwuo nne otu narị (100) okpukpu. Onyenwe m eze, ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị na-ejere gịnwa bụ́ onyenwe m ozi? Olee ihe mere onyenwe m ji chọọ ime ihe a? Gịnị mere ị ga-eji mee ka ndị Izrel mehie?”  Ma, eze siri ọnwụ ka Joab mee ihe o kwuru. N’ihi ya, Joab pụrụ gaa ebe niile n’Izrel, mechaakwa lọghachi Jeruselem.+  Joab wee gwa Devid mmadụ ole e debara aha ha n’akwụkwọ. Ndị Izrel niile, ndị ga-agali agha, dị otu nde na otu narị puku (1,100,000), ndị Juda adịrị narị puku anọ na puku iri asaa (470,000).+  Ma e debaghị aha ndị ebo Livaị na Benjamin n’akwụkwọ,+ n’ihi na ihe a eze kwuru ka e mee adịghị Joab mma.+  Ihe a merenụ were ezi Chineke ezigbote iwe, ya ataa ndị Izrel ahụhụ.  Devid gwaziri ezi Chineke, sị: “Emeela m ezigbote mmehie.+ Ma ugbu a, biko, gbaghara ohu gị mmehie ya,+ n’ihi na ezuzuola m nnọọ nzuzu.”+  Jehova gwaziri Gad,+ bụ́ onye na-ahụrụ Devid ọhụụ, sị: 10  “Gaa sị Devid, ‘Jehova kwuru, sị: “Họrọ nke m ga-eme gị n’ime ihe atọ a.”’” 11  Gad wee gakwuru Devid sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Họrọ nke ị chọrọ n’ihe ndị a. 12  Ị̀ chọrọ ka ụnwụ daa afọ atọ?+ Ka ị̀ chọrọ ka ndị iro gị na-emeri gị n’agha, jirikwa mma agha na-egbu unu ruo ọnwa atọ?+ Ka ị̀ chọrọ ka e jiri mma agha Jehova taa unu ahụhụ, ya bụ, ka unu na-arịa ọrịa na-efe efe,+ mmụọ ozi Jehova ana-egbukwa ndị mmadụ+ n’ebe niile n’Izrel ruo ụbọchị atọ.’ Chebara ya echiche gwa m nke ị chọrọ ka m gaa gwa Chineke, onye ziri m ozi a.” 13  Devid asị Gad: “Ihe a na-agbawa m obi. Biko, ka m daba n’aka Jehova, n’ihi na ọ na-eme ebere nke ukwuu.+ Ma, ka m ghara ịdaba n’aka mmadụ.”+ 14  Jehova wee mee ka e nwee ọrịa na-efe efe+ n’Izrel, puku mmadụ iri asaa (70,000) nwụkwara n’Izrel.+ 15  Ezi Chineke zigakwara otu mmụọ ozi ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem. Ma, ozugbo Jehova hụrụ na mmụọ ozi ahụ ebidola igbu ha, o meteere ndị ya ebere.+ Ọ gwaziri mmụọ ozi ahụ chọrọ igbuchapụ ha, sị: “O zuola!+ Wetuo aka gị.” Mmụọ ozi Jehova nọ nso n’ebe Ọnan+ onye Jebus+ na-azọcha ọka. 16  Mgbe Devid leliri anya, ọ hụrụ mmụọ ozi Jehova n’elu ka o ji mma agha*+ matịa aka ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem. Devid na ndị okenye gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.+ Ha yikwa ákwà iru uju.+ 17  Devid gwakwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụ m kwuru ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ. Ọ bụ m mehiere. Ọ bụkwa m mejọrọ ihe.+ Gịnị ka atụrụ ndị a mere? Jehova bụ́ Chineke m, biko, bịa gbuo mụ na ndị ezinụlọ nna m. Atazila ndị gị ahụhụ a ị na-ata ha.”+ 18  Mmụọ ozi Jehova gwaziri Gad+ ka ọ gwa Devid ka ọ gaa rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà n’ebe Ọnan onye Jebus+ na-azọcha ọka. 19  Devid gawakwara ka o mee ihe Jehova si n’ọnụ Gad gwa ya. 20  Ka Ọnan nọ na-azọcha ọka wit, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ. Ụmụ ya anọ, ndị ya na ha nọ, gakwara zoo. 21  Mgbe Devid ruru ebe Ọnan nọ, Ọnan lepụrụ anya hụ ya, si ebe ahụ ọ na-azọcha ọka pụta ozugbo gbuo ikpere n’ala, kpọọrọ Devid isiala. 22  Devid asị Ọnan: “Resị* m ebe a a na-azọcha ọka, ka m rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà na ya. Resị m ya, m ga-akwụzu gị ego ya, ka e wee kwụsị ịta ndị Izrel ahụhụ.”+ 23  Ma Ọnan sịrị Devid: “Onyenwe m eze, were ya mee ihe dị gị mma. Lee ehi ị ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ nakwa ihe e ji eticha ọka,+ nke ị ga-eji mere nkụ, nakwa ọka wit ị ga-eji chụọ àjà ọka. M na-enye gị ha niile.” 24  Ma, Eze Devid sịrị Ọnan: “Mba, m ga-azụrịrị ya azụ, kwụzuokwa gị ụgwọ ya, n’ihi na agaghị m ewere ihe gị nye Jehova ma ọ bụ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’emefughị ihe ọ bụla.”+ 25  Devid kwụziri Ọnan ọlaedo dị narị shekel* isii (600) n’arọ maka ebe ahụ. 26  Devid wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, chụọkwa àjà a na-esu ọkụ na àjà udo. Ọ kpọkukwara Jehova, ya aza ya. Otú o si za ya bụ na ọkụ+ si n’eluigwe bịa rechapụ àjà ahụ a na-esu ọkụ nke dị n’elu ebe ịchụàjà ahụ. 27  Jehova gwaziri mmụọ ozi ahụ+ ka ọ mịghachi mma agha ya n’ọbọ. 28  Mgbe Devid hụrụ na Jehova zara ya n’ebe ahụ Ọnan onye Jebus na-azọcha ọka, ọ nọgidere na-aga achụ àjà ebe ahụ. 29  Ma n’oge ahụ, ụlọikwuu Jehova nke Mosis nọ n’ala ịkpa rụọ nakwa ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ dị n’ebe dị elu na Gibiọn.+ 30  Ma, Devid enwebeghị ike ịga ebe ahụ jụọ Chineke ase, maka na ụjọ mma agha ahụ mmụọ ozi Jehova ji na-atụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “onye mmegide.”
Na Hibru, “ka o guzo n’agbata eluigwe na ụwa, jiri mma agha.”
Na Hibru, “Nye.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.