Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 25:1-31

  • Ndị na-abụ abụ n’ụlọ Chineke (1-31)

25  Devid na ndị isi ìgwè dị iche iche na-eje ozi họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ Esaf, ụmụ Himan, na ụmụ Jedutọn+ ka ha na-eji une,+ ụbọ akwara, na ájà+ na-eto Chineke ma na-ebu amụma. Ndị a họpụtara maka ọrụ a bụ:  A bịa n’ụmụ Esaf, a họpụtara Zakọ, Josef, Netanaya, na Asharila. Ọ bụ Esaf na-eduzi ha. Ha na-ebukwa amụma otú eze haziri ka ha si na-ebu ya.  A bịa n’ụmụ Jedutọn,+ a họpụtara Gedalaya, Ziraị, Jesheya, Shimiaị, Hashabaya, na Matitaya.+ Ha dị isii. Ọ bụ Jedutọn nna ha na-eduzi ha. Ha na-eji ụbọ akwara ekele Jehova, na-eto ya ma na-ebu amụma.+  A bịa n’ụmụ Himan,+ a họpụtara Bọkaya, Matanaya, Ọziel, Shebuel, Jerimọt, Hananaya, Hanenaị, Elayata, Gidaltaị, Romamtaị-iza, Joshbekasha, Malotaị, Hotia, na Maheziọt.  Ndị a niile bụ ụmụ Himan, onye na-ahụrụ eze ọhụụ, na-agwa ya ihe ezi Chineke kwuru nke na-eme ka e too Chineke. Ọ bụ ya mere ezi Chineke ji nye Himan ụmụ nwoke iri na anọ na ụmụ nwaanyị atọ.  Ọ bụ nna ha na-eduzi ha ka ha ji ájà, ụbọ akwara,+ na une na-abụ abụ n’ụlọ Jehova, nke bụ́ ozi ha na-eje n’ụlọ ezi Chineke. Ọ bụkwa eze na-agwa Esaf, Jedutọn, na Himan ihe ha na-eme.  Ha na ụmụnne ha dị narị abụọ na iri asatọ na asatọ (288). Ha niile bụ ndị ọkà n’ịbụrụ Jehova abụ. A zụkwara ha azụ maka ya.  Ha fekwara nza+ ka a mata ndị ga-arụ ihe ha ga-arụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma onye bụ́ aka ochie ma onye ka na-amụ amụ.  Nza nke mbụ dabaara Josef nwa Esaf,+ nke abụọ adabara Gedalaya+ (ya na ụmụnne ya na ụmụ ya dị mmadụ iri na abụọ). 10  Nke atọ dabaara Zakọ,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 11  Nke anọ dabaara Izraị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 12  Nke ise dabaara Netanaya,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 13  Nke isii dabaara Bọkaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 14  Nke asaa dabaara Jesharila, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 15  Nke asatọ dabaara Jesheya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 16  Nke itoolu dabaara Matanaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 17  Nke iri dabaara Shimiaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 18  Nke iri na otu dabaara Azarel, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 19  Nke iri na abụọ dabaara Hashabaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 20  Nke iri na atọ dabaara Shubael,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 21  Nke iri na anọ dabaara Matitaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 22  Nke iri na ise dabaara Jeremọt, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 23  Nke iri na isii dabaara Hananaya, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 24  Nke iri na asaa dabaara Joshbekasha, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 25  Nke iri na asatọ dabaara Hanenaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 26  Nke iri na itoolu dabaara Malotaị, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 27  Nke iri abụọ dabaara Elayata, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 28  Nke iri abụọ na otu dabaara Hotia, ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 29  Nke iri abụọ na abụọ dabaara Gidaltaị,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 30  Nke iri abụọ na atọ dabaara Maheziọt,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ. 31  Nke iri abụọ na anọ dabaara Romamtaị-iza,+ ụmụ ya na ụmụnne ya. Ha dị mmadụ iri na abụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji