Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 26:1-32

  • Otú e si kee ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche (1-19)

  • Ndị na-elekọta akụ̀ na ndị na-elekọta ọrụ ndị ọzọ (20-32)

26  Otú a ka e si kee ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá+ n’ìgwè n’ìgwè: a bịa ná ndị si n’agbụrụ Kora, Meshelemaya+ so na ha. Ọ bụ nwa Kore, onye si n’agbụrụ Esaf.  Meshelemaya mụrụ ụmụ nwoke ndị a: Zekaraya bụ ọkpara ya. Jedayel bụ nwa ya nke abụọ. Zebadaya bụ nwa ya nke atọ. Jatniel bụ nwa ya nke anọ.  Ịlam bụ nwa ya nke ise. Jehohenan bụ nwa ya nke isii. Elaịho-inaị bụ nwa ya nke asaa.  Obed-ịdọm mụrụ ụmụ nwoke ndị a: Shemaya bụ ọkpara ya. Jehozabad bụ nwa ya nke abụọ. Joa bụ nwa ya nke atọ. Seka bụ nwa ya nke anọ. Netanel bụ nwa ya nke ise.  Amiel bụ nwa ya nke isii. Ịsaka bụ nwa ya nke asaa. Piuletaị bụ nwa ya nke asatọ. Otú a ka Chineke si gọzie Obed-ịdọm.  A mụụrụ Shemaya nwa ya ụmụ nwoke ndị dike gbasiri ike. Ha bụkwa ndị isi ọnụmara ha.  Ụmụ Shemaya bụ Ọtnaị, Refael, Obed, na Elzebad. Ụmụnne ya bụ Elaịhu na Semakaya, ha bụkwa ndị gbasiri ike.  Ndị a niile bụ ụmụ Obed-ịdọm. Ha na ụmụ ha na ụmụnne ha bụ ndị nwoke gbasiri ike, ndị rukwara eru ịrụ ọrụ e nyere ha. Ha dị mmadụ iri isii na abụọ si n’ezinụlọ Obed-ịdọm.  Meshelemaya+ mụrụ ụmụ nwoke, nweekwa ụmụnne ndị nwoke. Ha gbasiri ike. Ha dị mmadụ iri na asatọ. 10  Hosa, onye si n’agbụrụ Meraraị, mụrụ ụmụ nwoke. Shimraị bụ onyeisi ha. N’agbanyeghị na ọ bụghị ya bụ ọkpara, nna ya mere ya onyeisi. 11  Hilkaya bụ onye nke abụọ, Tebalaya bụ onye nke atọ, Zekaraya bụ onye nke anọ. Ụmụ Hosa niile na ụmụnne ya ndị nwoke dị iri na atọ. 12  N’ime ìgwè ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ọrụ ndị isi ha na-arụ ka ụmụnne ha na-arụ, ya bụ, ije ozi n’ụlọ Jehova. 13  Ha fekwara nza+ n’ọnụmara n’ọnụmara, n’isi onye ukwu na onye nta, ka a mara onye ga-anọ n’ọnụ ụzọ ámá nke ọ ga-anọ. 14  Mgbe ha fere nza maka ebe ọwụwa anyanwụ, ọ dabaara Shelemaya. Mgbe ha fere nza maka Zekaraya nwa ya, bụ́ onye ndụmọdụ ma ihe, nke dabaara ya bụ nke dị n’ebe ugwu. 15  Nke dabaara Obed-ịdọm bụ nke dị n’ebe ndịda. E kenyekwara ụmụ ya+ ụlọ ndị a na-akwasa ihe. 16  Nke dabaara Shọpim na Hosa+ bụ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị nso n’Ọnụ Ụzọ Ámá Shaleket, n’akụkụ okporo ụzọ dị ebe mgbago. Otu ìgwè ndị nche na-anọ n’akụkụ ìgwè ndị nche ọzọ. 17  Ndị Livaị isii na-anọ n’ebe ọwụwa anyanwụ. Anọ na-anọ n’ebe ugwu n’otu ụbọchị, anọ ọzọ na-anọ n’ebe ndịda n’otu ụbọchị. Ndị nche anọ na-anọkwa abụọ abụọ n’ụlọ ndị a na-akwasa ihe.+ 18  A bịa n’ebe e si abanye n’ebe ọdịda anyanwụ ụlọ nsọ, mmadụ anọ na-anọ n’okporo ụzọ,+ mmadụ abụọ ana-anọ n’ebe ahụ e si abanye. 19  Otú a ka e si kee ndị si n’agbụrụ Kora na ndị si n’agbụrụ Meraraị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, n’ìgwè n’ìgwè. 20  A bịa n’ụmụ Livaị, Ahaịja na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke, na-elekọtakwa akụ̀ ndị e doro nsọ.+ 21  A bịa n’ụmụ Ledan, ndị si n’agbụrụ Geshọn, ndị Ledan mụrụ, Jehayelaị+ so ná ndị isi n’ọnụmara dị iche iche n’ezinụlọ Ledan, onye agbụrụ Geshọn. 22  Jehayelaị na ụmụ ya bụ́ Zitam na Joel nwanne ya na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ụlọ Jehova.+ 23  A bịa n’ụmụ Amram, ụmụ Izha, ụmụ Hebrọn, na ụmụ Ọziel,+ 24  Shebuel nwa Geshọm nwa Mosis bụ onye ndú na-elekọta ụlọ ndị a na-akwasa ihe. 25  Ụmụnne Shebuel, bụ́ ụmụ ụmụ Eliiza,+ bụ Rehabaya,+ Jesheya, Zikraị, Joram, na Shelomọt. 26  Shelomọt a na ụmụnne ya na-elekọta akụ̀ niile e doro nsọ.+ Ndị doro akụ̀ ndị a nsọ bụ Eze Devid,+ ndị isi ọnụmara dị iche iche,+ ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị nke otu narị otu narị ndị agha, nakwa ndị isi ìgwè ndị agha. 27  Ha doro ụfọdụ n’ime ihe ndị a kwatara n’agha+ nsọ ka e jiri ha na-elekọta ụlọ Jehova. 28  Shelomit na ụmụnne ya na-elekọtakwa ihe niile Samuel onye ọhụ ụzọ,+ Sọl nwa Kish, Abna+ nwa Nee, na Joab+ nwa Zeruya+ doro nsọ. Ọ bụ ha na-ahụ maka ihe onye ọ bụla doro nsọ. 29  A bịa n’ụmụ Izha,+ Kenanaya na ụmụ ya na-ahụ maka ọrụ ndị a na-anaghị anọ n’ụlọ nsọ arụ, ndị dị ka ịbụ ndị isi ọrụ na ndị na-ekpere Izrel ikpe.+ 30  A bịa n’ụmụ Hebrọn,+ Hashabaya na ụmụnne ya, bụ́ ndị nwoke gbasiri ike, ndị dị otu puku mmadụ na narị asaa (1,700), na-elekọta ndị Izrel bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan, n’ihe gbasara ọrụ niile a na-arụrụ Jehova nakwa ozi a na-ejere eze. 31  A bịa n’ụmụ Hebrọn, Jeraịja+ bụ onyeisi ọnụmara ha. N’afọ nke iri anọ n’ọchịchị Devid,+ a nọ na-achọ ndị dike gbasiri ike, mechaa nweta ha na Jeza+ nke dị na Gilied. 32  Ụmụnne Jeraịja, ndị gbasiri ike, dị puku mmadụ abụọ na narị asaa (2,700). Ha bụ ndị isi ọnụmara dị iche iche. Eze Devid họpụtakwara ha ka ha na-elekọta ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase, ka ha na-ahụkwa maka okwu ọ bụla gbasara ezi Chineke na okwu ọ bụla gbasara eze.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji