Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 27:1-34

  • Ndị isi ndị na-elekọtara eze ọrụ (1-34)

27  Ndị a bụ ndị Izrel e kere n’ìgwè n’ìgwè, ndị so ná ndị agha eze. N’ìgwè ndị a, e nwere ndị isi ọnụmara, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị nke otu narị otu narị ndị agha.+ E nwekwara ndị isi ọrụ ha bụ ilekọtara eze ìgwè ndị ahụ.+ Ìgwè nke ọ bụla dị puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000). N’afọ ọ bụla, ọ na-abụ, otu ìgwè jee ozi n’ọnwa nke a, ìgwè ọzọ ejee n’ọnwa nke ọzọ.  E kenyere ìgwè nke mbụ ije ozi n’ọnwa nke mbụ. Onyeisi ha bụ Jashobiam+ nwa Zabdiel. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọ n’ìgwè ya.  Jashobiam a bụ nwa nwa Pirez,+ bụrụkwa onyeisi nke ndị niile bụ́ ndị isi n’ìgwè ahụ e kenyere ije ozi n’ọnwa nke mbụ.  Ọ bụ Dodaị,+ onye Ahohaị,+ bụ onyeisi ìgwè e kenyere ije ozi n’ọnwa nke abụọ. Miklọt bụkwa osote ya. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè nke ya.  Onyeisi ìgwè nke atọ bụ Benaya+ nwa Jehoyada,+ onyeisi nchụàjà. E kenyere ha ije ozi n’ọnwa nke atọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya.  Benaya a bụ otu n’ime mmadụ iri atọ bụ́ dike n’agha, bụrụkwa onyeisi ha. Ọ bụkwa Amịzabad nwa ya ka e mere onyeisi ìgwè ya.  Onyeisi nke anọ bụ Asahel+ nwanne Joab.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke anọ. Zebadaya nwa ya na-esote ya. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya.  Onyeisi nke ise bụ Shamhọt onye si n’ezinụlọ Izra. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke ise. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya.  Onyeisi nke isii bụ Aịra+ nwa Ikesh, onye Tekoa.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke isii. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 10  Onyeisi nke asaa bụ Hilez+ onye Pelọnaịt si n’ebo Ifrem. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke asaa. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 11  Onyeisi nke asatọ bụ Sibekaị+ onye Husha. O si n’ezinụlọ Zira.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke asatọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 12  Onyeisi nke itoolu bụ Abi-iza+ onye Anatọt+ nke dị n’ebo Benjamin. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke itoolu. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 13  Onyeisi nke iri bụ Meharaị+ onye Netofa si n’agbụrụ Zira.+ E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 14  Onyeisi nke iri na otu bụ Benaya+ onye Piratọn nke dị n’ebo Ifrem. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri na otu. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 15  Onyeisi nke iri na abụọ bụ Heldaị onye Netofa si n’agbụrụ Ọtniel. E kenyere ya ije ozi n’ọnwa nke iri na abụọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya. 16  Ndị a bụ ndị ndú ebo dị iche iche n’Izrel: Eliiza nwa Zikraị bụ nke ebo Ruben, Shefataya nwa Meaka abụrụ nke ebo Simiọn. 17  Hashabaya nwa Kemuel bụ nke ebo Livaị, Zedọk abụrụ nke ụmụ Erọn. 18  Elaịhu,+ otu n’ime ụmụnne Devid, bụ nke ebo Juda, Ọmraị nwa Maịkel abụrụ nke ebo Ịsaka. 19  Ishmeya nwa Obedaya bụ nke ebo Zebulọn, Jerimọt nwa Azriel abụrụ nke ebo Naftalaị. 20  Hoshia nwa Azazaya bụ nke ebo Ifrem, Joel nwa Pedaya abụrụ nke ọkara ebo Manase. 21  Ido nwa Zekaraya bụ nke ọkara ebo Manase, bụ́ ndị bi na Gilied. Jaasayel nwa Abna+ abụrụ nke ebo Benjamin. 22  Azarel nwa Jeroham bụ nke ebo Dan. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ebo dị iche iche n’Izrel. 23  Devid agụghị ndị gbara afọ iri abụọ gbadawa ọnụ, n’ihi na Jehova kwere nkwa ime ka ndị Izrel dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ 24  Joab nwa Zeruya malitere ịgụ ha ọnụ, ma ọ gụchaghị ha. Chineke wesakwara ndị Izrel iwe n’ihi ọnụ ahụ a gụrụ ha.+ E denyeghịkwa mmadụ ole a gụtara n’ebe e denyere ihe ndị mere n’oge Eze Devid na-achị. 25  Onye na-elekọta akụ̀ eze+ bụ Azmavet nwa Adiel. Ma, Jonatan nwa Ọzaya na-elekọta akụ̀ ndị dị n’ubi nakwa ndị dị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta dị iche iche nakwa n’ụlọ elu dị iche iche. 26  Ezraị nwa Kilọb bụ onyeisi ndị na-akọ ihe n’ubi. 27  Onye na-ahụ maka ubi vaịn bụ Shimiaị onye Rema. Onye na-ahụ maka ebe a na-adọwa mmanya e mepụtara ná mkpụrụ a ghọtara n’ubi vaịn bụ Zabdaị onye Sifmọt. 28  Onye na-elekọta ubi oliv na osisi sịkamọ+ ndị dị na Shefila*+ bụ Belhenan onye Gida. Onye na-ahụ maka ebe mmanụ na-adị bụ Joash. 29  Onye na-elekọta ehi ndị na-ata ahịhịa na Sharọn+ bụ Shitraị onye Sharọn. Onye na-elekọta ehi ndị na-anọ na ndagwurugwu bụ Shefat nwa Adlaị. 30  Onye na-elekọta kamel bụ Obil onye Ishmel. Onye na-elekọta jakị* bụ Jediya onye Merọnọt. 31  Onye na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ bụ Jeziz onye Hega. Ọ bụ ndị a niile bụ ndị isi na-elekọta ihe ndị Eze Devid nwere. 32  Jonatan+ nwa nwanne Devid bụ onye ndụmọdụ, bụrụkwa odeakwụkwọ. Ọ bụ nwoke na-aghọta ihe nke ọma. Jehayel nwa Hakmọnaị na-ahụ maka ihe gbasara ụmụ eze.+ 33  Ahitofel+ bụ onye ndụmọdụ eze. Hushaị+ onye Akaịt bụ enyi eze.* 34  Ndị na-esote Ahitofel bụ Jehoyada nwa Benaya+ na Abayata.+ Joab+ bụ onyeisi ndị agha eze.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Na Hibru, “nne jakị.”
Ma ọ bụ “onye eze na-akọrọ ihe dị ya n’obi.”