Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 4:1-43

  • Ndị ọzọ bụ́ ụmụ Juda na ụmụ ụmụ ya (1-23)

    • Jebez na ekpere ya (9, 10)

  • Ụmụ Simiọn na ụmụ ụmụ ya (24-43)

4  Ụmụ Juda bụ Pirez,+ Hezrọn,+ Kamaị, Họọ,+ na Shobal.+  Reeya nwa Shobal mụrụ Jehat. Jehat amụọ Ahumaị na Lehad. Ndị Zora si n’ezinụlọ ha.+  Nna ndị Itam+ mụrụ ndị a: Jezril, Ishma, na Idbash, (aha nwanne ha nwaanyị bụ Hazelelponaị).  Penuel bụ nna Gidọ. Iza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Họọ,+ ọkpara Efrata na nna Betlehem.+  Ash-họ+ nna Tekoa+ lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Hila na Neara.  Neara mụụrụ ya Ahọzam, Hifa, Timenaị, na Haahashtaraị. Ndị a bụ ụmụ Neara.  Ụmụ Hila bụ Ziret, Izha, na Etnan.  Kọz mụrụ Enọb na Zọbiba. Ọ bụkwa nna ochie ndị si n’ezinụlọ Ahahel nwa Herọm.  A na-akwanyere Jebez ùgwù karịa ụmụnne ya. Ọ bụ nne ya gụrụ ya Jebez,* sị: “Atara m ahụhụ mgbe m na-amụ ya.” 10  Jebez rịọrọ Chineke Izrel, sị: “Biko gọzie m, meekwa ka ala m hikwuo nne. Biko, na-anọnyere m mgbe niile. Ekwekwala ka ọdachi dakwasị m, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime m.” Chineke mekwaara ya ihe a ọ rịọrọ. 11  Kilọb nwanne Shuha mụrụ Miha, nna Eshtọn. 12  Eshtọn mụrụ Betrefa, Pasia, na Tehina, nna Iye-nehash. Ọ bụ ndị a bụ ndị Rika. 13  Ụmụ Kinaz bụ Ọtniel+ na Seraya. Nwa* Ọtniel bụ Hetat. 14  Meonotaị mụrụ Ọfra, Seraya amụọ Joab nna ndị Ge-harashim.* A na-akpọ ha ndị Ge-harashim n’ihi na ha bụ ndị omenkà. 15  Ụmụ Keleb+ nwa Jefune bụ Aịru, Ịla, na Neem. Nwa* Ịla bụ Kinaz. 16  Ụmụ Jehalelel bụ Zif, Zaịfa, Tiria, na Asarel. 17  Ụmụ Ezra bụ Jita, Mired, Ife, na Jelọn. Otu n’ime ndị nwunye Mired* mụrụ Miriam, Shamaị, na Ishba nna Eshtemoa. 18  (Nwunye Mired, bụ́ onye Juu, mụrụ Jired nna Gidọ, Hiba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa.) Ndị a* bụ ụmụ Bitaya, nwa Fero, nwunye Mired. 19  Ụmụ nwunye Hodaya, nwanne Neham, bụ ndị nna Kaịla onye Gerem na ndị nna Eshtemoa onye Meakat. 20  Ụmụ Shaịmọn bụ Amnọn, Rina, Ben-henan, na Taịlọn. Ụmụ Ịshaị bụ Zohet na Ben-zohet. 21  Ụmụ Shila+ nwa Juda bụ Ea nna Lika na Leada nna Marisha. Ụmụ ụmụ ya bụ ndị si n’ezinụlọ Ashbia, ndị na-akpa ákwà ọma. 22  Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Jokim, ndị Koziba, Joash, na Seraf. Ha lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. Nwa ya ọzọ bụ Jashubi-lihem. E dekọrọ ihe ndị a n’oge ochie.* 23  Ha bụ ndị ọkpụite bi na Neteyim nakwa na Gedira. Ha bi ebe ahụ na-arụrụ eze ọrụ. 24  Ụmụ Simiọn+ bụ Nemuel, Jemin, Jerib, Zira, Sheọl.+ 25  Sheọl mụrụ Shalọm, Shalọm amụọ Mibsam, Mibsam amụọ Mishma. 26  Mishma mụrụ Hamuel, Hamuel amụọ Zakọ, Zakọ amụọ Shimiaị. 27  Shimiaị mụrụ ụmụ nwoke iri na isii na ụmụ nwaanyị isii. Ma, ụmụnne ya amụghị ọtụtụ ụmụ. O nweghịkwanụ onye ọ bụla ná ndị ezinụlọ ha nke mụrụ ọtụtụ ụmụ ka ndị ebo Juda.+ 28  Ha biri na Bia-shiba,+ Moleda,+ Heza-shual,+ 29  Bilha, Izem,+ Tolad, 30  Betuel,+ Họma,+ Ziklag,+ 31  Bet-makabọt, Heza-susim,+ Bet-biraị, na Shearem. Obodo ndị a bụ obodo ha ruo mgbe Devid malitere ịchị. 32  Ime obodo ha bụ Itam, Eyin, Rimọn, Token, na Eshan.+ Ha niile dị obodo ise. 33  Ha nwekwara ime obodo ndị ọzọ dị ime obodo ise a nso ruo Bel. Ndị a bụ aha ndị ezinụlọ ha dị iche iche e debara n’akwụkwọ nakwa aha ebe ndị ha biri. 34  Ụmụ ụmụ Simiọn ndị ọzọ bụ Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya, 35  Joel, Jihu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel, 36  Elio-inaị, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel, Benaya, 37  Zaịza nwa Shaịfaị, nwa Alọn, nwa Jedeya, nwa Shimraị, nwa Shemaya. 38  Ndị a a kpọrọ aha bụ ndị isi n’ọnụmara ha. Ọnụmara ndị nna nna ha bịakwara hikwuo nne. 39  Ha gara n’ụzọ e si abanye Gido, n’ebe ọwụwa anyanwụ otu ndagwurugwu, ka ha chọta ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa. 40  Ha mechakwara chọta ala dị mma, nke dara jụụ, bụrụ ahịhịa ahịhịa, saakwa mbara, e nweghịkwa nsogbu na ya. Ọ bụ ụmụ Ham bibu ebe ahụ.+ 41  Mgbe Hezekaya+ bụ eze Juda, ndị a a kpọrọ aha gara bibie ụlọikwuu ụmụ Ham, gbuo ndị Meyunim bi ebe ahụ, bibiekwa ha ruo taa. Ha bichiziri ebe ahụ n’ihi na e nwere ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa. 42  Ụfọdụ n’ime ụmụ Simiọn gbagoro n’Ugwu Sia.+ Ha dị narị ụmụ nwoke ise (500). Ndị du ha gbagoo bụ Pelataya, Nearaya, Refeya, na Ọziel, bụ́ ụmụ Ịshaị. 43  Ha gbukwara ndị Amalek fọrọnụ,+ birizie ebe ahụ ruo taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na aha a bụ nwanne okwu Hibru nke pụtara “ịta ahụhụ.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
Ge-harashim pụtara “Ndagwurugwu Ndị Omenkà.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
O nwere ike ịbụ Bitaya a kpọrọ aha n’amaokwu nke 18.
O nwere ike ịbụ ndị nke a kpọrọ aha ná ngwụcha amaokwu nke 17.
Ma ọ bụ “Okwu ndị a bụ okwu oge ochie.”