Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 7:1-40

  • Ụmụ Ịsaka na ụmụ ụmụ ya (1-5), ụmụ Benjamin na ụmụ ụmụ ya (6-12), ụmụ Naftalaị na ụmụ ụmụ ya (13), ụmụ Manase na ụmụ ụmụ ya (14-19), ụmụ Ifrem na ụmụ ụmụ ya (20-29), ụmụ Asha na ụmụ ụmụ ya (30-40)

7  Ụmụ Ịsaka bụ Tola, Pua, Jeshọb, na Shimrọn.+ Ha dị anọ.  Ụmụ Tola bụ Ọzaị, Refeya, Jiriel, Jamaị, Ibsam, na Shemuel. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche. Ndị si n’ezinụlọ Tola bụ ndị dike n’agha. Ha dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị isii (22,600) n’oge Devid na-achị.  Izrahaya bụ nwa Ọzaị. Ụmụ Izrahaya bụ Maịkel, Obedaya, Joel, na Ịs-shaya. Ha ise bụ ndị isi.  Ha na ụmụ ha lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị, mụọkwa ọtụtụ ụmụ. Ọ bụ ya mere na a bịa ná ndị si n’ọnụmara ha, e nwere puku mmadụ iri atọ na puku isii (36,000) ndị na-aga agha.  Ụmụnne ha ndị si n’ezinụlọ Ịsaka bụ ndị dike n’agha. E debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche. Ha dị puku iri asatọ na puku asaa (87,000).+  Ụmụ Benjamin+ bụ Bila,+ Bika,+ na Jedayel.+ Ha dị atọ.  Ụmụ Bila bụ Ezbọn, Ọzaị, Ọziel, Jerimọt, na Aịraị. Ha dị ise. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche, bụrụkwa ndị dike n’agha. E debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche. Ha dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na mmadụ iri atọ na anọ (22,034).+  Ụmụ Bika bụ Zemaịra, Joash, Eliiza, Elio-inaị, Ọmraị, Jeremọt, Abaịja, Anatọt, na Alemet. Ha niile bụ ụmụ Bika.  Ndị isi ọnụmara ha, ndị bụ́ dike n’agha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, dị puku mmadụ iri abụọ na narị abụọ (20,200). 10  Bilhan bụ nwa Jedayel.+ Ụmụ Bilhan bụ Jiọsh, Benjamin, Ehud, Keneana, Zitan, Tashish, na Ahishaha. 11  Ndị a niile bụ ụmụ Jedayel. Ha bụ ndị isi ezinụlọ ndị nna nna ha. Ha nwere puku mmadụ iri na asaa na narị abụọ (17,200) ndị na-aga agha, ndị bụ́kwa dike n’agha. 12  Ụmụ Iye bụ Shọpim na Họpim.+ Ndị Hushim bụ ụmụ Eha. 13  Ụmụ Naftalaị+ ndị nwoke bụ Jaziel, Gunaị, Jiza, na Shalọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Bilha.+ 14  Ụmụ Manase bụ:+ Asriel, onye iko ya bụ́ nwaanyị Siria, mụụrụ ya. (Ọ bụ nwaanyị ahụ mụrụ Mekia+ nna Gilied. 15  Mekia lụụrụ Họpim nwaanyị, lụọkwara Shọpim. Aha nwanne ya nwaanyị bụ Meaka.) Aha nwa Manase nke abụọ bụ Zelofehad.+ Ma, ọ bụ ụmụ nwaanyị ka Zelofehad mụrụ.+ 16  Meaka, nwunye Mekia, mụrụ nwa nwoke, gụọ ya Piresh. Aha nwanne ya nwoke bụ Shiresh. Ụmụ ya bụ Yulam na Rikem. 17  Nwa* Yulam bụ Bidan. Ndị a bụ ụmụ Gilied nwa Mekia nwa Manase. 18  Hamoleket bụ nwanne nwaanyị Gilied. Ọ bụ ya mụrụ Ish-họd, Abi-iza, na Mala. 19  Ụmụ Shemaịda bụ Ahayan, Shikem, Likhaị, na Anayam. 20  Ifrem+ mụrụ Shutela,+ Shutela amụọ Bired, Bired amụọ Tehat, Tehat amụọ Elieda, Elieda amụọ Tehat, 21  Tehat amụọ Zebad, Zebad amụọ Shutela. Ifrem mụkwara Iza na Iliad. Ndị Gat+ gburu ha n’ihi na ha gara ịchịrị anụ ụlọ ha. 22  Ifrem nna ha ruuru ha uju ọtụtụ ụbọchị, ụmụnne ya nọkwa na-abịa akasi ya obi. 23  Ya na nwunye ya mechara nwee mmekọahụ, nwunye ya atụrụ ime mụọ nwa nwoke. Ma, ọ gụrụ ya Beraya* n’ihi na nwunye ya mụrụ ya n’oge ọdachi dakwasịrị ezinụlọ ya. 24  Nwa ya nwaanyị bụ Shiera. Ọ bụ ya rụrụ Bet-horọn Ndịda+ na nke Mgbago,+ rụọkwa Ọzen-shiera. 25  Rifa na Rishef si n’agbụrụ Ifrem. Rishef mụrụ Tila, Tila amụọ Tehan. 26  Tehan amụọ Ledan, Ledan amụọ Amaịhọd, Amaịhọd amụọ Elishama, 27  Elishama amụọ Nọn, Nọn amụọ Joshụa.*+ 28  Ebe ụmụ Ifrem bi bụ Betel+ na ime obodo ndị dị ya nso,* na Neeran nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, na Giza nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ na ime obodo niile dị ya nso, na Shikem na ime obodo niile dị ya nso, ruokwa Aya* na ime obodo niile dị ya nso. 29  Obodo ndị dị nso n’ala ụmụ Manase bụ Bet-shian+ na ime obodo niile dị ya nso, Teanak+ na ime obodo niile dị ya nso, Megido+ na ime obodo niile dị ya nso, na Dọọ+ na ime obodo niile dị ya nso. Ebe ndị a ka ụmụ Josef nwa Izrel biri. 30  Ụmụ Asha ndị nwoke bụ Imna, Ishva, Ishvaị, na Beraya.+ Aha nwanne ha nwaanyị bụ Sira.+ 31  Ụmụ Beraya bụ Hiba na Malkiel. Malkiel bụ nna Biezeit. 32  Hiba mụrụ Jaflet, Shoma, Hotam, nakwa Shua nwanne ha nwaanyị. 33  Ụmụ Jaflet bụ Pesak, Bimhal, na Ashvat. Ọ bụ ha bụ ụmụ Jaflet. 34  Ụmụ Shima* bụ Ehaị, Roga, Jehọba, na Eram. 35  Ụmụ Hilem* nwanne ya bụ Zofa, Imna, Shilesh, na Emal. 36  Ụmụ Zofa bụ Sua, Hanifa, Shual, Biraị, Imra, 37  Biza, Họd, Shama, Shilsha, Itran, na Beira. 38  Ụmụ Jita bụ Jefune, Pispa, na Era. 39  Ụmụ Ọla bụ Era, Haniel, na Rizaya. 40  Ndị a niile bụ ụmụ Asha. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche. A họrọ ha ahọ. Ha bụkwa ndị dike n’agha nakwa ndị isi kacha nwee agba. Ha na-aga agha. E debakwara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche.+ Ha dị puku iri abụọ na puku isii (26,000).+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ụmụ.”
Beraya pụtara “Oge Ọdachi.”
Ma ọ bụ “Jehoshụa,” nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
O nwere ike ịbụ, “Gaza,” ma, ọ bụghị Gaza nke dị na Filistia.
A kpọrọ ya Shoma n’amaokwu nke 32.
O nwere ike ịbụ ya ka a kpọrọ “Hotam” n’amaokwu nke 32.