Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 8:1-40

  • Ụmụ Benjamin na ụmụ ụmụ ya(1-40)

    • Ndị ezinụlọ Sọl (33-40)

8  Benjamin+ mụrụ Bila+ bụ́ ọkpara ya, Ashbel+ nwa ya nke abụọ, Ahara nwa ya nke atọ,  Noha nwa ya nke anọ, na Refa nwa ya nke ise.  Bila mụrụ Ada, Gira,+ Abaịhọd,  Abishua, Neeman, Ahoa,  Gira, Shefufan, na Huram.  E nwekwara ụmụ Ehud, ndị bụ́ ndị isi ọnụmara ndị bi na Giba,+ ndị a dọọrọ n’agha laa Manahat. Ha bụ:  Neeman, Ahaịja, na Gira. Ọ bụ Gira nọ na-edu ha mgbe a dọọrọ ha n’agha. Ọ bụkwa ya mụrụ Ọza na Ahaịhọd.  Shahareyim mụrụ ụmụ na Moab mgbe ọ chụpụchara ndị nwunye ya. Hushim na Beara bụ ndị nwunye ya.*  Hodesh nwunye ya mụkwaara ya Jobab, Zibia, Misha, Malkam, 10  Jiọz, Sakaya, na Mema. Ọ bụ ha bụ ụmụ ya. Ha bụkwa ndị isi ọnụmara dị iche iche. 11  Hushim mụụrụ ya Abaịtọb na Elpel. 12  Ụmụ Elpel bụ Iba, Maịsham, na Shimed, (onye rụrụ Ono,+ Lọd+ na ime obodo ndị dị ya nso),* 13  Beraya, na Shima. Ha bụ ndị isi ọnụmara ndị bi n’Aịjalọn.+ Ọ bụkwa ha chụpụrụ ndị bi na Gat. 14  Ndị ọzọkwa bụ Ahayo, Sheshak, Jeremọt, 15  Zebadaya, Erad, Ịda, 16  Maịkel, Ishpa, na Joha, ụmụ Beraya. 17  Ndị ọzọkwa bụ Zebadaya, Meshọlam, Hizkaị, Hiba, 18  Ishmeraị, Izlaya, na Jobab, ụmụ Elpel. 19  Ndị ọzọkwa bụ Jekim, Zikraị, Zabdaị, 20  Eliinaị, Ziletaị, Iliel, 21  Adaya, Bereya, na Shimrat, ụmụ Shimiaị. 22  Ndị ọzọkwa bụ Ishpan, Iba, Iliel, 23  Abdọn, Zikraị, Henan, 24  Hananaya, Ịlam, Antọtaịja, 25  Ifdiya, na Penuel, ụmụ Sheshak. 26  Ndị ọzọkwa bụ Shamsheraị, Sheharaya, Atalaya, 27  Jeareshaya, Ịlaịja, na Zikraị, ụmụ Jeroham. 28  Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ọnụmara dị iche iche n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ha biri na Jeruselem. 29  Jeayel biri na Gibiọn.+ Ọ bụ ya bụ nna ndị Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Meaka.+ 30  Ọkpara ya bụ Abdọn. Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Zọọ, Kish, Bel, Nedab, 31  Gidọ, Ahayo, na Zika. 32  Miklọt mụrụ Shimea. Ha niile bikwa ụmụnne ha* nso na Jeruselem, ha na ụmụnne ha ndị nke ọzọ. 33  Nee+ mụrụ Kish, Kish amụọ Sọl,+ Sọl amụọ Jonatan,+ Malkaị-shua,+ Abinadab,+ na Eshbel.*+ 34  Jonatan mụrụ Merib-bel.*+ Merib-bel amụọ Maịka.+ 35  Ụmụ Maịka bụ Paịtọn, Melek, Taria, na Ehaz. 36  Ehaz mụrụ Jehoada, Jehoada amụọ Alemet, Azmavet, na Zimraị. Zimraị mụrụ Moza, 37  Moza amụọ Binia, Binia amụọ Refa, Refa amụọ Eliesa, Eliesa amụọ Ezel. 38  Ezel mụrụ ụmụ isii. Aha ha bụ Azraịkam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Obedaya, na Henan. Ha niile bụ ụmụ Ezel. 39  Ụmụ Ishek nwanne ya bụ Yulam bụ́ ọkpara ya, Jiọsh nwa ya nke abụọ, na Elifelet nwa ya nke atọ. 40  Ụmụ Yulam bụ ndị dike n’agha. Ha ma otú e si agba ụta. Ha nwekwara ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ, ndị dị otu narị mmadụ na iri ise (150). Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Benjamin.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Shahareyim mụrụ ụmụ na Moab mgbe ọ chụpụchara ndị nwunye ya bụ́ Hushim na Beara.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Ya bụ, ndị ebo Benjamin ibe ha.
A na-akpọkwa ya Ish-boshet.
A na-akpọkwa ya Mefiboshet.