Pita Nke Mbụ 1:1-25

  • Ekele (1, 2)

  • A mụrụ anyị ọzọ ka anyị nwee ezigbo olileanya (3-12)

  • Dịrịnụ nsọ ebe unu bụ ụmụ na-erubere Chineke isi (13-25)

1  Mụnwa, bụ́ Pita, onyeozi+ Jizọs Kraịst, na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị bi nwa oge n’ụwa a, ndị bi ebe dị iche iche na Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia,+ Eshia, na Bitinia. Unu bụ ndị Chineke họọrọ.  Ọ bụ ya bụ Nna anyị. Ọ họọrọ unu maka na ọ bụ ihe o bu n’obi ime kemgbe.+ O ji mmụọ nsọ doo unu nsọ,+ ka unu wee na-erubere ya isi, dịkwa ọcha n’ihi ọbara Jizọs Kraịst.+ Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Ka e too Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ọ bụ maka nnukwu ebere o meere anyị mere o ji mụọ anyị ọzọ+ ka anyị nwee ezigbo olileanya+ maka na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ.+  Olileanya a bụ inweta ndụ* a na-enweghị ike ịla n’iyi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-anaghịkwa emebi emebi.+ E doweere unu ya n’eluigwe.+  Chineke ji ike ya na-echebe unu maka na unu nwere okwukwe. Ọ na-echebe unu ka ọ zọpụta unu. A ga-eme ka a mata ihe niile gbasara nzọpụta a n’oge ikpeazụ.  Ihe ndị a mere unu ji na-aṅụrị ezigbo ọṅụ, n’agbanyeghị na unu ataala ahụhụ obere oge ugbu a n’ihi ọnwụnwa dị iche iche bịaara unu.+  Ihe mere ọnwụnwa ndị a ji bịara unu bụ ka a mara na okwukwe unu siri ezigbo ike.+ Ụdị okwukwe a bara uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya. Ọ ga-emekwa ka e too unu, sọpụrụ unu, unu adịkwa ebube mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst.+  Ọ bụ eziokwu na unu ahụtụbeghị Kraịst, ma unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ eziokwu na unu anaghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kweere na ya, na-aṅụrịkwa ezigbo ọṅụ, ọṅụ nke ọnụ na-agaghị akọwali, nke dịkwa ebube.  N’ihi na o doro unu anya na okwukwe unu ga-eme ka a zọpụta unu.*+ 10  Ndị amụma, ndị buru amụma banyere amara Chineke meere unu, jụsiri ajụjụ ike gbasara nzọpụta a, chọsiekwa ike ịmata gbasara ya.+ 11  Chineke ji mmụọ nsọ gwa ha na Kraịst ga-ata ahụhụ+ nakwa na ọ ga-emecha dịrị ebube. Ọ bụ ya mere ha ji na-agba mbọ ka ha chọpụta ihe ga-eme Kraịst na mgbe ihe ahụ ga-eme ya.+ 12  Chineke mere ka ha ghọta na ọ bụghị onwe ha ka ha na-ejere ozi, kama, na ọ bụ unu ka ha na-ejere ozi. Ọ bụ ha dere gbasara ihe ndị ahụ e kwusaara unu. Ọ bụkwa mmụọ nsọ e si n’eluigwe zite nyeere ndị zisaara unu ozi ọma aka.+ Ọ na-agụsikwa ndị mmụọ ozi ike ịma gbasara ihe ndị a. 13  N’ihi ya, keenụ ájị̀ n’ume maka ọrụ.+ Na-echenụ echiche nke ọma n’ihe niile.+ Nweenụ olileanya na Chineke ga-emere unu amara mgbe Jizọs Kraịst ga-egosi ike ya. 14  Unu bụzi ụmụ Chineke, ndị na-erubere ya isi. Kwụsịnụ ịna-eme ihe ọjọọ na-agụ unu agụụ oge ahụ unu na-amaghị ihe ọ bụla gbasara Chineke. 15  Kama ịna-eme ihe ọjọọ, dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme,+ otú ahụ onye kpọrọ unu dị nsọ. 16  N’ihi na e dere, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.”+ 17  Ọ bụrụkwa na unu na-arịọ Nna anyị arịrịọ, onye na-ekpe onye ọ bụla ikpe maka otú o si kpaa àgwà, onye na-anaghịkwa ele mmadụ anya n’ihu,+ na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu na-atụ egwu Chineke+ n’oge unu bi nwa oge n’ụwa a. 18  N’ihi na unu ma na ọ bụghị ihe ndị nwere ike imebi emebi, dị ka ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji napụta unu,*+ unu akwụsị ibi ndụ na-enweghị isi na ọdụ nna nna unu hà kụziiri unu. 19  Kama ihe e ji napụta unu bụ ọbara+ Kraịst,+ nke pụrụ iche, nke dị ka nke nwa atụrụ a na-emerụghị emerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ.+ 20  N’eziokwu, Chineke ahọpụtala Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa,+ ma e mere ka a mara gbasara ya n’ọgwụgwụ oge a n’ihi unu.+ 21  A kpọlitere ya n’ọnwụ,+ meekwa ka ọ dịrị ebube.+ Unu sikwa n’aka ya kwere na Chineke.+ N’ihi ya, nweenụ okwukwe ma chere Chineke. 22  N’ihi otú unu si na-eme ihe okwu Chineke bụ́ eziokwu kwuru, unu asachaala onwe unu,* unu hụkwara nnọọ ibe unu n’anya ka ụmụnne.+ Ugbu a, jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.+ 23  N’ihi na a mụọla unu ọzọ.+ E si ná mkpụrụ na-enweghị ike ịnwụ anwụ* mụọ unu, ọ bụghị mkpụrụ nwere ike ịnwụ anwụ.+ E ji okwu Chineke, onye dị ndụ, onye na-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi, mụọ unu.+ 24  N’ihi na “mmadụ* niile dị ka ahịhịa. Ebube ha niile dịkwa ka ifuru ahịhịa. Ahịhịa na-akpọnwụ, okooko ya na-adapụkwa, 25  ma okwu Jehova* na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ “okwu” a bụ ozi ọma e zisaara unu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ihe nketa.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Grik, “gbapụta unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ya bụ, mkpụrụ nke na-eme ka a dị ndụ.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Gụọ A5.