Pita Nke Mbụ 5:1-14
5 Ebe mụnwa bụkwa okenye, na-agbakwa àmà gbasara ahụhụ Kraịst tara, sorokwa ná ndị a ga-eme ka a hụ na ha dị ebube,+ ana m agba ndị bụ́ okenye n’ime unu ume, sị:
2 Ebe unu bụ ndị nlekọta, na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke+ ndị e nyefere unu n’aka ka unu na-elekọta. Unu azụla ha ka à manyere unu amanye, kama jirinụ obi unu niile na-azụ ha otú ga-amasị Chineke.+ Unu azụkwala ha ka unu rigbuo ha,+ kama ka ịzụ ha na-anụ unu ọkụ n’obi.
3 Unu emekwala ka ọ̀ bụ unu nwe ndị Chineke,+ kama na-akpanụ àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.+
4 Mgbe a ga-eme ka onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ+ pụta ìhè, unu ga-enweta ihe nrite* dị ebube nke na-enweghị ike imebi emebi.+
5 Ụmụ okorobịa, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ndị okenye.+ Ma unu niile, dịrịnụ umeala n’obi* n’otú unu si emeso ibe unu ihe, n’ihi na ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke, ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+
6 N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ,* ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.+
7 Na-akọrọnụ ya* ihe niile na-echegbu unu,+ n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.+
8 Na-echenụ echiche nke ọma, na-echekwanụ nche.+ Ekwensu, bụ́ onye iro unu, na-ejegharị ka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri.+
9 Ma na-alụsonụ ya ọgụ,+ siekwanụ ike n’okwukwe, ebe unu ma na ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.+
10 Ma mgbe unu tatụchara ahụhụ, Chineke, onye na-eme amara n’ụzọ niile, onye kpọrọ unu ka unu na Kraịst dịrị n’otu nakwa ka unu dịrị ebube ruo mgbe ebighị ebi,+ ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike.+ Ọ ga-eme ka unu sie ike,+ meekwa ka unu kwụrụ chịm.
11 Ọ bụ ya nwe ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
12 Ọ bụ Silvenọs,*+ nwanna e kwesịrị ịtụkwasị obi, nyeere m aka dee akwụkwọ ozi a dị nkenke. Edetaara m ya unu iji gbaa unu ume na iji mee ka unu mara ezigbote amara Chineke meere unu. Jirikwanụ amara a kpọrọ ihe.
13 Nwanna nwaanyị ahụ nke nọ na Babịlọn, onye a họọrọ otú a họọrọ unu, na-ekele unu. Mak+ nwa m na-ekelekwa unu.
14 Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu* iji gosi na unu hụrụ ha n’anya.
Ka udo dịrị unu niile ndị ha na Kraịst dị n’otu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “okpueze.”
^ Ma ọ bụ “yirinụ umeala n’obi ka uwe.”
^ Na Grik, “wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.”
^ Ma ọ bụ “Nyefeenụ ya.”
^ Aha ya ọzọ bụ Saịlas.
^ Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.