Samuel nke Mbụ 13:1-23

  • Sọl họpụtara ndị ga na-aga agha (1-4)

  • Sọl mere ihe a na-enyeghị ya ikike ime (5-9)

  • Samuel baara Sọl mba (10-14)

  • Ndị Izrel enweghị ngwá agha (15-23)

13  Sọl dị afọ . . .* mgbe ọ malitere ịchị.+ Ọ chịkwara Izrel afọ abụọ.  Sọl họpụtara puku ụmụ nwoke atọ (3,000) n’Izrel, ya na puku abụọ (2,000) n’ime ha anọrọ na Mikmash nakwa n’ala Betel bụ́ ugwu ugwu, Jonatan na otu puku (1,000) anọrọ+ na Gibia+ dị n’ebo Benjamin. Sọl wee gwa ndị Izrel fọrọnụ ka onye ọ bụla n’ime ha lawa n’ụlọikwuu ya.  Jonatan wee gaa gbuo ndị agha Filistia+ na-eche nche na Giba.+ Ndị Filistia nụkwara ya. Ma, Sọl kwuru ka a fụọ opi+ n’ala ahụ niile, sị: “Ndị Hibru, nụrụnụ!”  Ndị Izrel niile nụkwara ka a na-asị: “Sọl egbuola ndị agha Filistia na-eche nche. Ugbu a, ndị Filistia ga-akpọ ndị Izrel asị.” Ndị na-eje ozi kpọkọtaziri ndị Izrel ka ha soro Sọl nọrọ na Gilgal.+  Ndị Filistia zukọtakwara ka ha lụso ndị Izrel agha. Ụgbọ ịnyịnya agha ha ji dị puku iri atọ (30,000). Ndị agha ha ndị na-agba ịnyịnya dị puku mmadụ isii (6,000). Ha nwekwara ndị agha ndị ọzọ dị ọtụtụ ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Ha gawara maa ụlọikwuu na Mikmash n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-even.+  Ndị Izrel wee hụ na ha nọ ná nsogbu, n’ihi na ha tọrọ atọ. N’ihi ya, ha gara na-ezo n’ọgba,+ n’oghere dị na nkume, ná nnukwu nkume, n’olulu ndị dị n’ime ala, nakwa n’olulu mmiri.  Ụfọdụ ndị Hibru gafedịrị Osimiri Jọdan rute n’ala Gad nakwa na Gilied.+ Ma, Sọl ka nọ na Gilgal. Ndị Izrel niile so ya nọkwa na-ama jijiji.  Sọl cheere ruo ụbọchị asaa, ruokwa oge Samuel kwuru na ọ ga-abịa na Gilgal, ma Samuel abịaghị. Ndị Izrel nọkwa na-ahapụ Sọl na-agbasasị.  N’ikpeazụ, Sọl sịrị: “Wetaranụ m anụmanụ ndị a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo.” Ọ chụziri àjà ahụ a na-esu ọkụ.+ 10  Ma ozugbo ọ chụchara àjà ahụ a na-esu ọkụ, Samuel bịara. Sọl wee gaa izute ya ka ọ nabata ya. 11  Samuel asị ya: “Gịnị ka i mere?” Sọl asị ya: “Ahụrụ m na ndị Izrel na-ahapụ m na-agbasasị.+ Ị bịaghịkwa n’oge i kwuru na ị ga-abịa. Ndị Filistia nọkwa na-ezukọta na Mikmash.+ 12  Mụ asị onwe m, ‘Ndị Filistia ga-abịa na Gilgal ịlụso m agha, emebeghịkwa m ihe ga-eme ka Jehova kwado m.’ N’ihi ya, m chere na ihe m kwesịrị ime bụ ịchụ àjà a na-esu ọkụ.” 13  Samuel wee sị Sọl: “I zuzuru nzuzu. I debeghị iwu Jehova Chineke gị nyere gị.+ A sị na i debere ya, Jehova gaara eme ka alaeze gị sie ike n’Izrel ruo mgbe ebighị ebi. 14  Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọta nwoke obi ya nabatara.+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị ya,+ n’ihi na i meghị ihe Jehova gwara gị.”+ 15  Samuel wee si na Gilgal gawa Gibia dị n’ebo Benjamin. Sọl gụrụ ndị ka so ya ọnụ, gụta ihe dị ka narị mmadụ isii (600).+ 16  Sọl na Jonatan nwa ya, na ndị ka so ha, bi na Giba+ dị n’ebo Benjamin. Ma ndị Filistia mara ụlọikwuu na Mikmash.+ 17  Ndị agha Filistia, ndị na-akwakọrọ ihe ndị ọzọ, na-eke onwe ha ụzọ atọ. Otu ụzọ na-esi ebe ha mara ụlọikwuu gawa ụzọ e si aga Ọfra na Shual. 18  Ndị nke abụọ na-aga ụzọ gara Bet-horọn,+ ndị nke atọ agaa ụzọ gara ebe chere ndagwurugwu Zeboyim ihu, ebe ala ịkpa. 19  N’oge ahụ, e nweghị onye na-akpụ ụ́zụ́ n’ala Izrel niile, n’ihi na ndị Filistia sịrị: “Anyị achọghị ka ndị Hibru na-akpụ mma agha ma ọ bụ ube.” 20  Ndị Izrel niile na-aga na nke ndị Filistia amụ mma ogè ha, ọ́gụ̀ ha, anyụike ha nakwa mma ndị ha ji ewe ihe ubi. 21  Ihe ha na-akwụ iji mụọ mma ogè, ọ́gụ̀, ndụdụ nwere ezé atọ, anyụike, nakwa iji rụzie ndụdụ e ji achị ehi bụ otu mkpụrụ ego pim.* 22  N’oge ọ bụla a na-aga agha, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile ha na Sọl na Jonatan nọ na-eji mma agha ma ọ bụ ube.+ Naanị Sọl na Jonatan nwa ya na-eji ngwá agha. 23  Ndị agha ndị Filistia ndị na-eche nche gara nọrọ n’ụzọ e si aga na ndagwurugwu Mikmash.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Afọ ole Sọl dị adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e si sụgharịa amaokwu a.
Pim bụ ego ndị mgbe ochie na-adị ihe dị ka gram 8 n’arọ.