Samuel nke Mbụ 13:1-23
13 Sọl dị afọ . . .* mgbe ọ malitere ịchị.+ Ọ chịkwara Izrel afọ abụọ.
2 Sọl họpụtara puku ụmụ nwoke atọ (3,000) n’Izrel, ya na puku abụọ (2,000) n’ime ha anọrọ na Mikmash nakwa n’ala Betel bụ́ ugwu ugwu, Jonatan na otu puku (1,000) anọrọ+ na Gibia+ dị n’ebo Benjamin. Sọl wee gwa ndị Izrel fọrọnụ ka onye ọ bụla n’ime ha lawa n’ụlọikwuu ya.
3 Jonatan wee gaa gbuo ndị agha Filistia+ na-eche nche na Giba.+ Ndị Filistia nụkwara ya. Ma, Sọl kwuru ka a fụọ opi+ n’ala ahụ niile, sị: “Ndị Hibru, nụrụnụ!”
4 Ndị Izrel niile nụkwara ka a na-asị: “Sọl egbuola ndị agha Filistia na-eche nche. Ugbu a, ndị Filistia ga-akpọ ndị Izrel asị.” Ndị na-eje ozi kpọkọtaziri ndị Izrel ka ha soro Sọl nọrọ na Gilgal.+
5 Ndị Filistia zukọtakwara ka ha lụso ndị Izrel agha. Ụgbọ ịnyịnya agha ha ji dị puku iri atọ (30,000). Ndị agha ha ndị na-agba ịnyịnya dị puku mmadụ isii (6,000). Ha nwekwara ndị agha ndị ọzọ dị ọtụtụ ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Ha gawara maa ụlọikwuu na Mikmash n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-even.+
6 Ndị Izrel wee hụ na ha nọ ná nsogbu, n’ihi na ha tọrọ atọ. N’ihi ya, ha gara na-ezo n’ọgba,+ n’oghere dị na nkume, ná nnukwu nkume, n’olulu ndị dị n’ime ala, nakwa n’olulu mmiri.
7 Ụfọdụ ndị Hibru gafedịrị Osimiri Jọdan rute n’ala Gad nakwa na Gilied.+ Ma, Sọl ka nọ na Gilgal. Ndị Izrel niile so ya nọkwa na-ama jijiji.
8 Sọl cheere ruo ụbọchị asaa, ruokwa oge Samuel kwuru na ọ ga-abịa na Gilgal, ma Samuel abịaghị. Ndị Izrel nọkwa na-ahapụ Sọl na-agbasasị.
9 N’ikpeazụ, Sọl sịrị: “Wetaranụ m anụmanụ ndị a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo.” Ọ chụziri àjà ahụ a na-esu ọkụ.+
10 Ma ozugbo ọ chụchara àjà ahụ a na-esu ọkụ, Samuel bịara. Sọl wee gaa izute ya ka ọ nabata ya.
11 Samuel asị ya: “Gịnị ka i mere?” Sọl asị ya: “Ahụrụ m na ndị Izrel na-ahapụ m na-agbasasị.+ Ị bịaghịkwa n’oge i kwuru na ị ga-abịa. Ndị Filistia nọkwa na-ezukọta na Mikmash.+
12 Mụ asị onwe m, ‘Ndị Filistia ga-abịa na Gilgal ịlụso m agha, emebeghịkwa m ihe ga-eme ka Jehova kwado m.’ N’ihi ya, m chere na ihe m kwesịrị ime bụ ịchụ àjà a na-esu ọkụ.”
13 Samuel wee sị Sọl: “I zuzuru nzuzu. I debeghị iwu Jehova Chineke gị nyere gị.+ A sị na i debere ya, Jehova gaara eme ka alaeze gị sie ike n’Izrel ruo mgbe ebighị ebi.
14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọta nwoke obi ya nabatara.+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị ya,+ n’ihi na i meghị ihe Jehova gwara gị.”+
15 Samuel wee si na Gilgal gawa Gibia dị n’ebo Benjamin. Sọl gụrụ ndị ka so ya ọnụ, gụta ihe dị ka narị mmadụ isii (600).+
16 Sọl na Jonatan nwa ya, na ndị ka so ha, bi na Giba+ dị n’ebo Benjamin. Ma ndị Filistia mara ụlọikwuu na Mikmash.+
17 Ndị agha Filistia, ndị na-akwakọrọ ihe ndị ọzọ, na-eke onwe ha ụzọ atọ. Otu ụzọ na-esi ebe ha mara ụlọikwuu gawa ụzọ e si aga Ọfra na Shual.
18 Ndị nke abụọ na-aga ụzọ gara Bet-horọn,+ ndị nke atọ agaa ụzọ gara ebe chere ndagwurugwu Zeboyim ihu, ebe ala ịkpa.
19 N’oge ahụ, e nweghị onye na-akpụ ụ́zụ́ n’ala Izrel niile, n’ihi na ndị Filistia sịrị: “Anyị achọghị ka ndị Hibru na-akpụ mma agha ma ọ bụ ube.”
20 Ndị Izrel niile na-aga na nke ndị Filistia amụ mma ogè ha, ọ́gụ̀ ha, anyụike ha nakwa mma ndị ha ji ewe ihe ubi.
21 Ihe ha na-akwụ iji mụọ mma ogè, ọ́gụ̀, ndụdụ nwere ezé atọ, anyụike, nakwa iji rụzie ndụdụ e ji achị ehi bụ otu mkpụrụ ego pim.*
22 N’oge ọ bụla a na-aga agha, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile ha na Sọl na Jonatan nọ na-eji mma agha ma ọ bụ ube.+ Naanị Sọl na Jonatan nwa ya na-eji ngwá agha.
23 Ndị agha ndị Filistia ndị na-eche nche gara nọrọ n’ụzọ e si aga na ndagwurugwu Mikmash.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Afọ ole Sọl dị adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e si sụgharịa amaokwu a.
^ Pim bụ ego ndị mgbe ochie na-adị ihe dị ka gram 8 n’arọ.