Samuel nke Mbụ 14:1-52

  • Ike Jonatan nọ na Mikmash kpaa (1-14)

  • Chineke mere ka ndị Izrel merie ndị iro ha (15-23)

  • Sọl ebughị ụzọ chee echiche tupu ya emee ka ndị Izrel ṅụọ iyi (24-46)

    • Ndị mmadụ nọ na-erikọta anụ na ọbara ya (32-34)

  • Ezinụlọ Sọl na agha Sọl lụrụ (47-52)

14  Otu ụbọchị, Jonatan+ nwa Sọl gwara onye na-ejere ya ozi, nke bu ngwá agha ya, sị: “Bịa ka anyị gafee ma gaa nso ebe ndị Filistia nọ na-eche nche n’akụkụ nke ọzọ.” Ma ọ gwaghị nna ya.  N’oge ahụ, Sọl nọ n’okpuru osisi pomigranet dị na Migrọn, ná ngwụcha ngwụcha Gibia.+ Ndị ya na ha nọ dị ihe dị ka narị ụmụ nwoke isii (600).+  (Ahaịja yikwa efọd+ n’oge ahụ. Ọ bụ nwa Ahaịtọb,+ nwanne Ịkabọd,+ nwa Finihas,+ nwa Ịlaị,+ onye nchụàjà Jehova na Shaịlo.)+ Ma ndị Izrel amaghị na Jonatan apụọla.  E nwere nnukwu nkume ndị pịrị ọnụ dị n’ụzọ Jonatan chọrọ isi gafee gaa lụso ndị Filistia ahụ na-eche nche agha. Otu dị n’otu akụkụ, ọzọ adịrị n’akụkụ nke ọzọ. Aha otu bụ Bozez, aha nke ọzọ abụrụ Sine.  Otu nnukwu nkume ahụ dị n’ebe ugwu. Ọ dịkwa ka ogidi, chee ihu na Mikmash. Nke ọzọ dị n’ebe ndịda, ma chee ihu na Giba.+  Jonatan wee gwa onye na-eburu ya ngwá agha, sị: “Bịa ka anyị gafee ma gaa nso ebe ndị ahụ a na-ebighị úgwù nọ na-eche nche.+ Jehova nwere ike inyere anyị aka, n’ihi na Jehova chọọ ka anyị merie, o nweghị ihe ga-egbochi ya ime ya, ma ànyị hiri nne ma anyị ehighị nne.”+  Onye na-eburu ya ngwá agha asị ya: “Mee ihe ọ bụla obi gị gwara gị. Gaa ebe ọ bụla masịrị gị. Aga m eso gị aga ebe ọ bụla ị na-aga.”  Jonatan asị ya: “Anyị ga-agafe gaa nso ebe ụmụ nwoke ndị ahụ nọ, mee ka ha hụ anyị.  Ọ bụrụ na ha asị anyị, ‘Kwụrụnụ ebe ahụ ka anyị bịakwute unu,’ anyị ga-akwụrụ ebe anyị kwụ. Anyị agaghịkwa aga ebe ha nọ. 10  Ma ọ bụrụ na ha asị, ‘Bịanụ lụso anyị agha,’ anyị ga-aga, n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na Jehova ga-enyefe ha n’aka anyị.”+ 11  Ha abụọ wee mee ka ndị agha Filistia na-eche nche hụ ha. Ndị Filistia asị: “Lee ndị Hibru ka ha si n’ọgba ha zoro na-apụta.”+ 12  Ndị nche ahụ wee sị Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha: “Bịawanụ, ka anyị zi unu ihe ọkụ ji ntị òké eme.”+ Ozugbo ahụ, Jonatan sịrị onye na-eburu ya ngwá agha: “Sowe m, n’ihi na Jehova ga-enyefe ha n’aka ndị Izrel.”+ 13  Jonatan wee huru ehuru jiri aka ya na ụkwụ ya na-agbago, onye na-eburu ya ngwá agha sokwa ya n’azụ. Jonatan ebido gbuwe ndị Filistia, onye na-eburu ya ngwá agha anọrọkwa n’azụ ya na-egbu ha. 14  Ndị mbụ Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha gburu gburugburu ebe ahụ ha nọ* dị ihe dị ka ụmụ nwoke iri abụọ. 15  Ezigbo ụjọ jidekwara ndị Filistia niile nọ ebe ha mara ụlọikwuu n’ọhịa, ha na ndị niile na-eche nche nakwa ndị agha ndị na-akwakọrọ ihe ndị ọzọ.+ Ala malitekwara ịma jijiji. Ihe a niile si n’aka Chineke. 16  Ndị nche Sọl, ndị nọ na Gibia+ nke dị n’ebo Benjamin, hụkwara na ebe niile ndị iro ha mara ụlọikwuu na-agba ghara ghara.+ 17  Sọl wee sị ndị agha ya na ha so: “Biko, gụọnụ mmadụ niile ọnụ ma mara onye n’ime anyị na-anọghị ebe a.” Mgbe ha gụrụ ndị mmadụ ọnụ, ha chọpụtara na Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha anọghị ebe ahụ. 18  Sọl gwaziri Ahaịja,+ sị: “Bute Igbe ezi Chineke ebe a.” (N’ihi na ndị Izrel bu Igbe ezi Chineke n’oge ahụ.*) 19  Ka Sọl nọ na-agwa onye nchụàjà ahụ okwu, ebe ahụ ndị Filistia mara ụlọikwuu nọ na-agbakwu ghara ghara. Sọl asịzie onye nchụàjà ahụ: “Hapụwa.” 20  Sọl na ndị niile ya na ha so wee gbakọọ ma gawa n’ọgbọ agha. Mgbe ha rutere, ha hụrụ na ndị Filistia ji mma agha ha na-egburịta ibe ha. Ebe ahụ niile nọkwa na-agba nnọọ ghara ghara. 21  Ndị Hibru, ndị dụnyeere ndị Filistia úkwù na mbụ, ndị sokwa ha gaa ebe ha mara ụlọikwuu, nọkwa na-agakwuru ndị Izrel so Sọl na Jonatan. 22  Mgbe ndị Izrel niile, ndị zoro+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, nụrụ na ndị Filistia agbaala ọsọ, ha sooro ndị ibe ha chụwa ha. 23  Jehova wee zọpụta ndị Izrel n’ụbọchị ahụ.+ Ha lụkwaara agha ahụ ruo Bet-even.+ 24  Ma, ike mechara gwụ ndị Izrel n’ụbọchị ahụ, n’ihi na Sọl mere ka ha ṅụọ iyi, sị: “O nweghị onye ga-eri ihe* ruo anyasị, ruokwa mgbe m ga-egbucha ndị iro m. Onye ọ bụla riri ihe, a ga-abụ ya ọnụ.” Ọ bụ ya mere na o nweghị onye n’ime ha riri ihe ọ bụla.+ 25  Ndị agha ahụ niile wee gawa n’ọhịa. Mmanụ aṅụ dịkwa n’ala ebe ahụ. 26  Mgbe ha banyere n’ọhịa ahụ, ha hụrụ na mmanụ aṅụ nọ na-atasị, ma o nweghị onye n’ime ha detụrụ ya ọnụ, n’ihi na ụjọ nọ na-atụ ha maka iyi ahụ ha ṅụrụ. 27  Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị agha ahụ ṅụọ iyi.+ Ọ matịrị aka rụnye ọnụ mkpara o ji n’aka na mmanụ aṅụ ahụ, rachaa ya. Mgbe ọ rachara ya, o nwetara ume.* 28  Otu n’ime ndị agha ahụ sịrị ya: “Nna gị mere ka ndị Izrel ṅụọ iyi, sị, ‘Onye ọ bụla riri ihe taa, a ga-abụ ya ọnụ.’+ Ọ bụ ya mere ike ji gwụchaa ndị mmadụ.” 29  Ma, Jonatan sịrị ya: “Nna m akpatarala ndị mmadụ ezigbo nsogbu. Ị̀ makwa na enwetara m ume ná ntakịrị mmanụ aṅụ a m metụrụ ọnụ? 30  Marazie ihe gaara eme ma a sị na e nweghị ihe gbochiri ndị agha anyị iri ihe+ ha kwatara n’aka ndị iro ha taa. Anyị gaara egbu ndị Filistia karịa otú anyị gburu ha.” 31  N’ụbọchị ahụ, ha si na Mikmash gburu ndị Filistia ruo Aịjalọn.+ Ezigbo ike gwụkwara ha. 32  Ma, anyaukwu mere ka ha jiri ọsọ na-ebukọrọ ihe ha kwatara n’agha. Ha kpụụrụ atụrụ na ehi na ụmụ ehi, gbuo ha n’ala nkịtị, rikọtakwa ha na ọbara ha.+ 33  A gakwara kọọrọ Sọl, sị: “Ndị Izrel emehiela Jehova. Ha na-erikọta anụ na ọbara ya.”+ Sọl wee sị: “Unu akpaala àgwà ka ndị na-enweghị okwukwe. Kwataranụ m otu nnukwu nkume ozugbo.” 34  Ọ sịkwara: “Gaanụ ebe niile ndị Izrel nọ, sịkwanụ ha, ‘Ọ bụ n’elu nkume a ka onye ọ bụla n’ime unu ga na-egbu ehi ya na atụrụ ya tupu unu erie ha. Unu emehiezila Jehova, na-erikọta anụ na ọbara ya.”+ N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime ndị agha Izrel kpụtara ehi ya n’abalị ahụ gbuo ya n’elu nkume ahụ. 35  Sọl wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà.+ Ọ bụ ya bụ ebe ịchụàjà mbụ ọ rụụrụ Jehova. 36  Sọl mechara sị: “Ka anyị chụwa ndị Filistia n’abalị ma na-ebukọrọ ihe ha ruo ụtụtụ. Anyị agaghị ahapụ onye ọ bụla n’ime ha ndụ.” Ha asị: “Mee ihe ọ bụla dị gị mma.” Onye nchụàjà asị: “Ka anyị jụọ ezi Chineke ase ebe a.”+ 37  Sọl wee jụọ Chineke ase, sị: “Ọ̀ bụ m gaa chụwa ndị Filistia?+ Ị̀ ga-enyefe ha n’aka ndị Izrel?” Ma Chineke azaghị ya n’ụbọchị ahụ. 38  Sọl wee sị: “Bịanụ nso ebe a, unu ndị isi Izrel, chọpụtanụ ihe anyị mehiere taa. 39  Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye napụtara ndị Izrel, na-aṅụ iyi, na ọ bụrụgodị na ọ bụ Jonatan nwa m mehiere, ọ ga-anwụrịrị.” Ma ha niile gbara nkịtị. 40  Ya agwazie ndị Izrel niile, sị: “Nọrọnụ n’otu akụkụ, ka mụ na Jonatan nwa m nọrọ n’akụkụ nke ọzọ.” Ha asị Sọl: “Mee ihe dị gị mma.” 41  Sọl asị Jehova: “Chineke Izrel, biko, jiri Tọmịm+ gwa anyị onye ọ bụ.” A họọrọ Jonatan na Sọl, ya abụrụ na aka ndị Izrel ndị ọzọ dị ọcha. 42  Sọl wee sị: “Feenụ nza+ iji mara ma ọ̀ bụ m ka ọ̀ bụ Jonatan nwa m.” Nza mara Jonatan. 43  Sọl asị Jonatan: “Gwa m ihe i mere.” Jonatan asị ya: “Naanị ihe m mere bụ ịracha ntakịrị mmanụ aṅụ dị n’ọnụ mkpara m ji n’aka.+ Lekwa m, adị m njikere ịnwụ.” 44  Sọl wee sị: “Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na gịnwa bụ́ Jonatan anwụghị.”+ 45  Ma ndị Izrel sịrị Sọl: “Gịnị mere Jonatan ga-eji anwụ, ebe o mere ka ndị Izrel merie ezigbo mmeri?*+ Nke a agaghị eme! Anyị ji Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ọbụnadị otu ntutu isi ya agaghị esi n’isi ya dapụ, n’ihi na Chineke nyeere ya aka ya akpaa ike ọ kpara taa.”+ Otú a ka ndị Izrel si napụta Jonatan. Ọ nwụghịzi. 46  Sọl wee kwụsị ịchụ ndị Filistia, ndị Filistia alaa n’obodo ha. 47  Sọl wee mee ka alaeze ya sie ike n’Izrel. Ọ na-aga alụso ndị iro ya niile agha n’ebe niile, ma ndị Moab+ ma ndị Amọn+ ma ndị Ịdọm+ ma ndị eze Zoba+ ma ndị Filistia.+ Ebe ọ bụla ọ gara, ya emerie ha. 48  Ọ bụ dike n’agha. O meriri ndị Amalek,+ napụtakwa ndị Izrel n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ha. 49  Aha ụmụ Sọl ndị nwoke bụ Jonatan, Ishvaị, na Malkaị-shua.+ Ụmụ ya ndị nwaanyị dị abụọ. Aha nke ada bụ Mirab.+ Aha nke ọ tọrọ bụ Maịkal.+ 50  Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, nwa Ahimaz. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Abna,+ nwa Nee, nwanne nna Sọl. 51  Kish+ bụ nna Sọl. Ma, Nee+ nna Abna bụ nwa Abayel. 52  Sọl na ndị Filistia nọ na-alụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge niile ọ chịrị.+ Ọ na-abụ Sọl hụ nwoke ọ bụla siri ike ma ọ bụ nwoke ọ bụla obi kara, ya akpọrọ ya ka o soro ná ndị agha ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “gburu n’ọkara ala ebe ehi abụọ nwere ike ịkọ ihe n’ụbọchị.”
Na Hibru, “n’ụbọchị ahụ.”
Na Hibru, “achịcha.”
Na Hibru, “anya ya nwuru gbaa.”
Ma ọ bụ “ebe ọ zọpụtara ndị Izrel?”