Samuel nke Mbụ 15:1-35

  • Sọl nupụrụ isi hapụ igbu Egag (1-9)

  • Samuel baara Sọl mba (10-23)

    • “Ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà” (22)

  • Jehova jụrụ Sọl ka ọ gharazie ịbụ eze (24-29)

  • Samuel gburu Egag (30-35)

15  Samuel wee sị Sọl: “Jehova ziri m, mụ abịa tee gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya Izrel.+ Ugbu a, nụrụ ihe Jehova ga-agwa gị.+  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ndị Amalek zaa ajụjụ maka agha ha lụsoro ndị Izrel n’ụzọ mgbe ha si Ijipt na-apụta.+  Gaa gbuo ndị Amalek,+ laakwa ha na ihe niile ha nwere n’iyi.+ Ahapụkwala ha ndụ.* Gbuo ha niile,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma jakị.’”+  Sọl wee kpọkọta ndị agha ya ma gụọ ha ọnụ na Telem. Ọ gụtara puku ụmụ nwoke iri (10,000) si n’ebo Juda na narị puku ndị agha abụọ (200,000) ji ụkwụ aga si n’ebo ndị ọzọ n’Izrel.+  Sọl wee gaa n’otu obodo dị n’Amalek ma zoo chebiri ha n’akụkụ ndagwurugwu.  Sọl gwaziri ndị Kenaịt,+ sị: “Sinụ n’obodo ndị Amalek pụọ, ka m ghara ikpochapụ unu na ha.+ Unu gosiri ndị Izrel niile na unu hụrụ ha n’anya,*+ meekwara ha ebere mgbe ha si Ijipt na-apụta.” Ndị Kenaịt wee si n’obodo ndị Amalek pụọ.  Mgbe ha pụrụ, Sọl gburu ndị Amalek+ malite na Havila+ ruo na Shọọ+ nke dị nso n’Ijipt.  O jidere Egag,+ eze ndị Amalek ná ndụ. Ma, o ji mma agha gbuo ndị ọzọ niile.+  Ma, Sọl na ndị agha ya hapụrụ Egag ndụ,* ya na ewu na atụrụ na ehi ndị kacha mma, ndị gbakwara agba, nakwa ebule niile na ihe niile dị mma.+ Ha achọghịkwa ibibi ha. Ma, ha bibiri ihe niile na-abaghị uru na ihe ndị ha na-achọghị. 10  Jehova wee sị Samuel: 11  “Ọ na-ewute m na m mere Sọl eze, n’ihi na ọ kwụsịla iso m. O meghịkwa ihe m kwuru.”+ Ihe a nyekwara Samuel nsogbu n’obi, ya ana-ebesara Jehova ákwá abalị ahụ niile.+ 12  Mgbe Samuel biliri n’isi ụtụtụ ka ọ gaa hụ Sọl, a gwara Samuel, sị: “Sọl gara Kamel,+ rụọ ihe a ga-eji na-echeta ya ebe ahụ,+ sikwa ebe ahụ gawa Gilgal.” 13  Mgbe Samuel mechara bịakwute Sọl, Sọl sịrị ya: “Ka Jehova gọzie gị. Emeela m ihe Jehova kwuru.” 14  Ma Samuel sịrị: “Ebeekwanụ ka ewu na atụrụ na ehi ndị a m na-anụ olu ha si?”+ 15  Sọl wee sị: “Ndị agha m si n’ala ndị Amalek chịta ha, n’ihi na ha egbughị ewu na atụrụ na ehi ha ndị kacha mma, ka e jiri ha chụọrọ Jehova bụ́ Chineke gị àjà. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọrọnụ.” 16  Samuel wee sị Sọl: “O zuola! Ka m gwa gị ihe Jehova gwara m n’abalị ụnyaahụ.”+ Ya asị ya: “Kwuwe.” 17  Samuel asị: “Mgbe e mere gị onyeisi ebo niile n’Izrel nakwa mgbe Jehova tere gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel,+ ọ̀ kwa i weere na o nweghị ihe ị bụ?+ 18  Jehova mechakwara dunye gị ozi, sị, ‘Gaa bibie ndị Amalek bụ́ ndị mmehie.+ Lụsokwa ha agha ruo mgbe i kpochapụrụ ha.’+ 19  Gịnịzi mere na i meghị ihe Jehova kwuru? Kama ime ya, anyaukwu gị emee ka ị gbara ọsọ gaa na-amaburu ihe ndị unu kwatara,+ n’agbanyeghị na ọ dịghị Jehova mma.” 20  Ma, Sọl sịrị Samuel: “Emeela m ihe Jehova gwara m. Agara m ozi Jehova dunyere m, kpọrọ Egag eze Amalek lọta, ma bibie ndị Amalek.+ 21  Ma, ndị agha m si n’ihe ndị ha kwatara kpụrụ atụrụ na ehi ndị kacha mma n’ime ihe ndị e kwesịrị ibibi ebibi, ka e jiri ha chụọrọ Jehova bụ́ Chineke gị àjà na Gilgal.”+ 22  Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule. 23  N’ihi na nnupụisi+ dị njọ otú ịgba afa dị.+ Mmadụ ime ihe a na-enyeghị ya ikike ime na mmadụ ime anwansi* nakwa mmadụ ife arụsị bụ otu ihe. Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Jehova kwuru,+ yanwa ajụkwala gị ka ị gharazie ịbụ eze.”+ 24  Sọl wee sị Samuel: “Emehiela m, n’ihi na emeghị m ihe Jehova gwara m mee. Emeghịkwa m ihe i kwuru, maka na m tụrụ ụjọ ndị agha m wee mee ihe ha kwuru. 25  Biko, gbaghara m mmehie m, sorokwa m laghachi ka m kpọọrọ Jehova isiala.”+ 26  Ma Samuel sịrị Sọl: “Agaghị m eso gị laghachi, n’ihi na ị jụrụ ime ihe Jehova kwuru. Jehova ajụkwala gị ka ị gharazie ịbụ eze Izrel.”+ 27  Ka Samuel na-atụgharị ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe ya na-enweghị aka, uwe ahụ adọkapụ. 28  Samuel asị ya: “Jehova anapụla gị ọchịchị Izrel taa otú a i si dọkapụ uwe a. Ọ ga-enyekwa ya onye ka gị mma.+ 29  Onye Ukwu bụ́ Chineke Izrel+ agaghịkwa agha ụgha+ ma ọ bụ gbanwee obi ya,* n’ihi na ọ bụghị mmadụ nke na ọ ga-agbanwe obi ya.”*+ 30  Sọl wee sị ya: “Emehiela m. Ma, biko, kwanyere m ùgwù n’ihu ndị okenye ndị m nakwa n’ihu ndị Izrel. Soro m laghachi. M ga-akpọkwara Jehova bụ́ Chineke gị isiala.”+ 31  Samuel wee soro Sọl n’azụ laghachi, Sọl akpọọrọ Jehova isiala. 32  Samuel sịkwara: “Kpọtaranụ m Egag eze ndị Amalek.” Egag wee jiri ụjọ* gakwuru ya. Egag nọbu na-agwa onwe ya, sị: ‘Oge m gaara anwụ agafeela.’ 33  Ma, Samuel sịrị: “Otú ahụ i si jiri mma agha gị mee ka ụmụ nwaanyị gbara aka ụmụ, ka nne gị ga-agbarakwa aka nwa.” Samuel wee nọrọ na Gilgal ebe ahụ gbukasịa Egag n’ihu Jehova.+ 34  Samuel wee lawa Rema, ma Sọl lawara n’ụlọ ya dị na Gibia. 35  Samuel ahụghị Sọl anya ọzọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. Obi nọkwa na-ajọ Samuel njọ n’ihi ihe Sọl mere.+ O wutekwara Jehova na o mere Sọl eze Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Emetekwarala ha ebere.”
Ma ọ bụ “gosiri ndị Izrel niile ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “meteere Egag ebere.”
Ma ọ bụ “ime majik.”
Ma ọ bụ “kwaa ụta.”
Ma ọ bụ “ọ ga-akwa ụta.”
O nwere ike ịbụ, “kata obi.”