Samuel nke Mbụ 16:1-23

  • Samuel tere Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl (1-13)

    • “Jehova na-ahụ ihe dị n’obi” (7)

  • Mmụọ Chineke si n’ime Sọl pụọ (14-17)

  • Devid ghọrọ onye na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara (18-23)

16  N’ikpeazụ, Jehova gwara Samuel, sị: “Olee mgbe obi ga-akwụsị ịjọ gị njọ maka Sọl,+ n’ihi na m jụla ya ka ọ gharazie ịbụ eze Izrel?+ Were otu mpi, gbajuo ya mmanụ+ gawa na nke Jesi+ onye Betlehem, n’ihi na ahọrọla m otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ eze.”+  Ma Samuel sịrị: “Olee otú m ga-esi gaa? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.”+ Jehova asị ya: “Kpụrụ otu ehi gawa. Ị garuo, gị asị, ‘Abịara m ịchụrụ Jehova àjà.’  Kpọọ Jesi ka ọ bịa ebe ị ga-achụ àjà. M ga-agwazi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etere m onye m ga-egosi gị mmanụ.”+  Samuel mekwara ihe Jehova kwuru. Mgbe o ruru Betlehem,+ ndị okenye obodo ahụ mawara jijiji mgbe ha hụrụ ya. Ha jụkwara ya, sị: “Nke a ị bịara, udo ọ̀ dịkwa?”  Ya asị: “Udo dị. Abịara m ịchụrụ Jehova àjà. Doonụ onwe unu nsọ. Unu ga-esokwa m jee ebe ahụ m ga-achụ àjà.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị nwoke nsọ, kpọọkwa ha ka ha bịa ebe ahụ ọ ga-achụ àjà.  Mgbe ha batara, ya ahụ Elayab,+ ọ sịrị: “N’eziokwu, onye a bụ onye Jehova tere mmanụ.”  Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela otú ọ dị n’anya na otú o toruru ogologo,+ maka na ọ bụghị ya ka m họọrọ. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ. Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+  Jesi kpọziri Abinadab,+ kpọta ya n’ihu Samuel. Ma, ọ sịrị: “Ọ bụghịkwa onye a ka Jehova họọrọ.”  Jesi kpọtakwara Shama,+ ma Samuel sịrị: “Ọ bụghịkwa onye a ka Jehova họọrọ.” 10  Jesi kpọpụtara mmadụ asaa n’ime ụmụ ya ndị nwoke n’ihu Samuel, ma Samuel sịrị Jesi: “O nweghị onye n’ime ha Jehova họọrọ.” 11  N’ikpeazụ, Samuel sịrị Jesi: “Ụmụ gị ndị nwoke hà agwụla?” Ya asị: “Onye fọrọnụ ugbu a bụ nke ọdụdụ.+ Ọ na-azụ atụrụ.”+ Samuel asị ya: “Zie ozi ka a gaa kpọọ ya, n’ihi na anyị agaghị eri nri ruo mgbe ọ bịara ebe a.” 12  O wee zie ozi, a gaa kpọta ya. Ọ na-acha ọbara ọbara, nwee ọmarịcha anya, maakwa mma nwoke.+ Jehova asị: “Ọ bụ ya ka m họọrọ. Tee ya mmanụ.”+ 13  Samuel wee were mpi mmanụ ahụ+ tee ya mmanụ n’ihu ụmụnne ya. Mmụọ Jehova malitekwara inye Devid ike pụrụ iche si n’ụbọchị ahụ gawa.+ Samuel mechakwara bilie lawa Rema.+ 14  Ma, mmụọ Jehova si n’ime Sọl pụọ.+ Jehova kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara ịna-ezu ya ike.*+ 15  Ndị na-ejere Sọl ozi wee sị ya: “Eze, Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara ịna-ezu gị ike. 16  Biko, onyenwe anyị, gwa anyị, bụ́ ndị na-ejere gị ozi guzo n’ihu gị, ka anyị chọọ nwoke bụ́ ọkà n’ịkpọ ụbọ akwara.+ Mgbe ọ bụla Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu gị ike, nwoke ahụ ga-akpọrọ gị ụbọ, obi ga-adịkwa gị mma.” 17  Sọl wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Biko, chọtaranụ m nwoke na-akpọ ụbọ nke ọma. Kpọtakwaranụ m ya.” 18  Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi sịrị ya: “Ahụla m otú nwa Jesi onye Betlehem si akpọ ụbọ ka aka ochie. Obi kara ya. Ọ bụkwa dike n’agha.+ Ọ ma ka e si ekwu okwu, maakwa mma.+ Jehova nọnyekwaara ya.”+ 19  Sọl wee ziga ndị ozi ya ka ha zie Jesi, sị: “Biko, zitere m Devid nwa gị, onye na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ.”+ 20  Jesi wee kpụrụ otu jakị, dọkwasị achịcha na otu karama akpụkpọ mmanya n’elu ya, kpụrụkwa nwa ewu, zigara ha Sọl. Ọ kpọkwaara Devid nwa ya kpọnye ya. 21  Otú a ka Devid si bịa biri n’ụlọ Sọl na-ejere ya ozi.+ Sọl bịakwara hụ ya n’anya nke ukwuu, ya ana-eburu ya ngwá agha. 22  Sọl zigakwaara Jesi ozi, sị: “Biko, ka Devid nọrọ na-ejere m ozi, n’ihi na ihe ya masịrị m.” 23  Mgbe ọ bụla Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu Sọl ike,* Devid na-ewere ụbọ akwara kpọwa, ahụ́ adajụọ ya, obi adịkwa ya mma, mmụọ ahụ na-adịghị mma esikwa n’ahụ́ ya pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Jehova nọ menyewere ya ụjọ.”
Na Hibru, “Mgbe ọ bụla mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Chineke nọ dakwasịrị Sọl.”