Samuel nke Mbụ 20:1-42

  • Jonatan akwụsịghị ịna-akwado Devid (1-42)

20  Devid wee si na Nayọt nke dị na Rema gbapụ. Ma, ọ bịara gwa Jonatan, sị: “Gịnị ka m mere?+ Gịnị ka m mejọrọ? Olee otú m si mejọọ nna gị, nke mere o ji na-achọ igbu m?”  Jonatan asị ya: “Tụfịakwa!+ Ị gaghị anwụ. Nna m agaghị eme ihe ọ bụla ma ghara ịkọrọ m, ma ọ̀ bụ nnukwu ihe ma ọ̀ bụ ntakịrị ihe. Nna m ọ̀ ga-ejikwanụ maka gịnị zochiere m ihe a? Ihe a agaghị eme.”  Ma Devid gwara ya, sị: “Nna gị ma na ihe m dị gị mma.+ O nwekwara ike ịbụ na o kwuola n’obi ya, sị, ‘M gaghị ekwe ka Jonatan mata ihe a ka ọ ghara iwute ya.’ N’eziokwu, otú ahụ o doro anya na Jehova, bụ́ Chineke, dị ndụ nakwa na gịnwa dị ndụ, ka o doro anya na ọ gaghị ete aka ugbu a nke m agaa.”+  Jonatan asị Devid: “M ga-emere gị ihe ọ bụla i kwuru.”*  Devid asị Jonatan: “Echi bụ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.+ Ekwesịkwara m iso eze nọdụ ala rie nri. Ma, ihe a ka m ga-achọ ka anyị mee: ị ga ahapụ m ka m pụọ gaa zoo n’ọhịa ruo mgbede ụbọchị nke atọ.  Ọ bụrụ na e nwee ka nna gị si chọọ m, ị ga-asị ya, ‘Devid rịọrọ m ka m kwe ya gaa ebe ha bụ́ Betlehem n’egbughị oge,+ ka o nwee ike soro ndị ezinụlọ ha maka àjà a na-achụ ebe ahụ n’afọ ọ bụla.’+  Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ ọ pụtara na ohu gị ekwesịghị ịtụwa ụjọ. Ma ọ bụrụ na o wee iwe, mara na o nwere ihe dị ya n’obi ime m.  Gosi ohu gị na ị hụrụ ya n’anya,*+ n’ihi na gị na ohu gị gbara ndụ n’ihu Jehova.+ Ma ọ bụrụ na e nwere ihe m mejọrọ,+ jiri aka gị gbuo m. Gịnị mere ị ga-eji nyefee m n’aka nna gị?”  Jonatan asị ya: “Echela ụdị ihe ahụ. Ọ bụrụ na mụ amata na o nwere ihe nna m bu n’obi ime gị, m̀ ga-ahapụ ịgwa gị?”+ 10  Devid asị Jonatan: “Ònye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị na-ewere m iwe?” 11  Jonatan asị Devid: “Bịagodị, ka anyị gaa n’ọhịa.” Ha abụọ wee gaa n’ọhịa. 12  Jonatan asị Devid: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye akaebe na m ga-ajụta nna m ihe o chere n’okwu a ụdị ugbu a echi ma ọ bụ nwanne echi. Ọ bụrụkwa na o bughị n’obi ime gị ihe ọjọọ, m ga-eme ka ị mara. 13  Ma ọ bụrụ na nna m bu n’obi ime gị ihe ọjọọ, mụ ahapụ ịgwa gị ka i nwee ike gbalaga n’udo, ka Jehova taa mụnwa bụ́ Jonatan ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike. Ka Jehova nọnyere gị+ otú ọ nọnyeere nna m.+ 14  Hụ m n’anya* otú Jehova si ahụ mmadụ n’anya, ma m̀ dị ndụ ma m̀ nwụrụ anwụ.+ 15  Akwụsịkwala ịhụ ezinụlọ m n’anya,*+ ọbụnadị mgbe Jehova bibiri ndị iro gị niile n’ụwa.” 16  Jonatan na Devid* gbakwara ndụ, Jonatan asị, “Jehova ga-atakwa ndị iro Devid ahụhụ.” 17  Jonatan wee mee ka Devid ṅụọrọ ya iyi ọzọ maka na Devid hụrụ ya n’anya, yanwa ahụkwa ya n’anya otú o si hụ onwe ya.*+ 18  Jonatan gwakwara Devid, sị: “Echi bụ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ.+ A ga-achọkwa gị achọ, n’ihi na oche gị ga-atọgbọ nkịtị. 19  Nwanne echi, a ga-achọsi gị ike. Gaakwa ebe i zoro n’ụbọchị ahụ,* nọrọkwa nkume a dị ebe a nso. 20  M ga-agba akụ́ atọ n’otu akụkụ ya, ka à ga-asị na o nwere ihe m chọrọ ịgbata. 21  M ga-agwa onye na-ejere m ozi, sị, ‘Gaa chọta akụ́ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na mụ agwa onye ahụ na-ejere m ozi, sị, ‘Akụ́ ndị ahụ dị gị nso, weta ha,’ mgbe ahụ, ị ga-alọta. Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na ọ pụtara na nsogbu adịghị. E nweghịkwa ihe ga-eme gị. 22  Ma ọ bụrụ na mụ asị nwa ahụ, ‘Akụ́ ndị ahụ dị ebe ihu ihu,’ gbalaga, n’ihi na Jehova agwala gị ka ị gbalaga. 23  A bịa ná nkwa mụ na gị kwere ibe anyị,+ ka Jehova bụrụ onye akaebe mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”+ 24  Devid wee zoo n’ọhịa. Mgbe ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ruru, eze nọdụrụ ala n’oche ya ka o rie ihe.+ 25  Eze nọ ọdụ n’oche ọ na-anọ, nke dị n’akụkụ ahụ́ ụlọ. Jonatan nọ n’oche chere ya ihu, Abna+ anọrọ n’akụkụ Sọl. Ma, oche Devid tọgbọ nkịtị. 26  Sọl ekwughị ihe ọ bụla n’ụbọchị ahụ, n’ihi na ọ gwara onwe ya, sị: ‘Ọ ga-abụ na e nwere ihe mere ka Devid ghara ịdị ọcha.+ Ọ ga-abụrịrị na ọ dịghị ọcha.’ 27  N’ụbọchị na-esote ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ, n’ụbọchị nke abụọ, oche Devid ka tọgbọ nkịtị. Sọl asị Jonatan nwa ya: “Gịnị mere nwa Jesi+ abịaghị rie nri ma ụnyaahụ ma taa?” 28  Jonatan asị Sọl: “Devid rịọrọ m ka m hapụ ya ka ọ gaa Betlehem.+ 29  Ọ sịrị m, ‘E nwere àjà ezinụlọ anyị ga-achụ n’obodo anyị, nwanne m nwoke kpọkwara m. Biko, hapụ m ka m gaa. Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, biko, ka m mịpụ gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ ya mere na ọ bịabeghị na tebụl eze.” 30  Sọl wee wesa Jonatan iwe, sị ya: “Gị, nwa nwaanyị na-enupụ isi, ì chere na mụ amaghị na ị na-adụnyere nwa Jesi úkwù? Ihe a ga-eme ka ihere mee gị na nne gị. 31  Ọ bụrụhaala na nwa Jesi dị ndụ, ị gaghị abụ eze.+ N’ihi ya, zie mmadụ ka ọ gaa kpọtara m ya, n’ihi na ọ ga-anwụrịrị.”+ 32  Ma, Jonatan sịrị Sọl nna ya: “Gịnị mere a ga-eji egbu ya?+ Gịnị ka o mere?” 33  Sọl wee tụọ ya ube ka ọ tụgbuo ya,+ nke mere ka Jonatan mata na nna ya ekpebiela igbu Devid.+ 34  Jonatan ji ezigbo iwe si ebe ahụ ha nọ na-eri nri bilie ozugbo. O righịkwa nri n’ụbọchị ahụ na-esote ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ, maka na nna ya kpasuru ya iwe n’ihi Devid,+ menyekwa Devid ihere. 35  N’ụtụtụ echi ya, Jonatan gara n’ọhịa, ebe ya na Devid kwekọrịtara na ha ga-ahụ. Nwatakịrị na-ejere ya ozi sokwa ya.+ 36  O wee sị onye ahụ na-ejere ya ozi: “Biko, gbara ọsọ gaa chọta akụ́ ndị m ga-agba.” Mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi gbaara ọsọ gawa, ọ gbara akụ́ ahụ ka ọ gafee ya. 37  Mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi ruru ebe akụ́ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan tiri mkpu, sị ya: “Akụ́ ahụ dara n’ihu ihu.” 38  Jonatan sịkwara ya: “Egbula oge, gbara ọsọ gaa ngwa ngwa!” Onye ahụ na-ejere Jonatan ozi gara tụtụta akụ́ ndị ahụ, bịakwutekwa nna ya ukwu. 39  Onye ahụ na-ejere ya ozi aghọtaghị ihe garanụ. Naanị Jonatan na Devid ma ihe garanụ. 40  Jonatan chịnyeziri onye ahụ na-ejere ya ozi ngwá agha ya, sị ya: “Lawa, chịlaa ihe ndị a n’ụlọ.” 41  Mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi lawara, Devid si ebe dị nso ebe ahụ, n’ebe ndịda pụta, gbuo ikpere n’ala, kpọọkwa isiala ugboro atọ. Ha susuru ibe ha ọnụ,* bekwaara ibe ha ákwá, ma Devid bekarịrị. 42  Jonatan wee sị Devid: “Laa n’udo. Anyị ejirila aha Jehova ṅụọrọ ibe anyị iyi,+ sị, ‘Ka Jehova bụrụ onye akaebe ndụ mụ na gị gbara nke gbasara ụmụ m* na ụmụ gị* ruo mgbe ebighị ebi.’”+ Devid wee lawa, Jonatan alawakwa n’ụlọ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ọ bụla mkpụrụ obi gị kwuru.”
Ma ọ bụ “Gosi ohu gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “igosi ezinụlọ m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “ụlọ Devid.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “n’ụbọchị a na-arụ ọrụ.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.
Ma ọ bụ “mkpụrụ m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ gị.”