Samuel nke Mbụ 22:1-23

  • Devid gara Adọlam, gaakwa Mizpe (1-5)

  • Sọl nyere iwu ka e gbuo ndị nchụàjà nọ na Nọb (6-19)

  • Abayata gbara ọsọ (20-23)

22  Devid wee si ebe ahụ gbaga+ n’ọgba dị n’Adọlam.+ Mgbe ụmụnne ya na ezinụlọ nna ya niile nụrụ ya, ha gakwuuru ya ebe ahụ.  Ndị niile nọ ná nsogbu, ndị niile nwere onye ha ji ụgwọ nakwa ndị niile nwere ihe na-ewute ha gakwukwaara ya, ya abụrụ onyeisi ha. Ụmụ nwoke ya na ha nọ dị ihe dị ka narị anọ (400).  E mechaa, Devid si ebe ahụ gaa Mizpe dị na Moab wee sị eze Moab:+ “Biko, ka nne m na nna m biri na nke gị ruo mgbe m matara ihe Chineke ga-emere m.”  Devid wee hapụ ha na nke eze Moab, ha na ya ebiri n’oge niile Devid nọ ebe o zoro.+  Ka oge na-aga, Gad+ onye amụma sịrị Devid: “Ezozila ebe a ị na-ezo. Gaa n’ala Juda.”+ Devid wee si ebe ahụ gaa n’oké ọhịa dị na Hiret.  Sọl wee nụ na a hụla Devid na ụmụ nwoke ya na ha nọ. Mgbe Sọl nụrụ ihe a, ọ nọ ọdụ n’okpuru osisi tamarisk dị n’elu ugwu na Gibia.+ O ji ube ya n’aka, ndị niile na-ejere ya ozi guzokwa ya gburugburu.  Ọ gwaziri ndị ahụ na-ejere ya ozi, sị: “Unu ndị Benjamin, biko, geenụ ntị. Nwa Jesi+ ọ̀ ga-enye unu niile ala na ubi vaịn? Ọ̀ ga-ahọpụta unu niile ka unu bụrụ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha?+  Unu niile agbaalara m izu. O nweghị onye gwara m mgbe nwa m na nwa Jesi gbara ndụ.+ O nweghịkwa onye n’ime unu na-emetere m ebere, gwakwa m na nwa m emeela ka onye na-ejere m ozi lụsowa m agha otú ọ na-eme taa.”  Doeg+ onye Ịdọm, onyeisi ndị na-ejere Sọl ozi, wee sị:+ “Ahụrụ m nwa Jesi mgbe ọ bịara Nọb, gakwuru Ahimelek nwa Ahaịtọb.+ 10  Ahimelek jụụrụ ya Jehova ase, nyekwa ya ihe oriri. O nyedịrị ya mma agha Golayat onye Filistia.”+ 11  Eze ziri ozi ozugbo ahụ ka a kpọọ Ahimelek nwa Ahaịtọb onye nchụàjà na ndị nchụàjà niile bụ́ ndị ezinụlọ nna ya nọ na Nọb. Ha niile wee bịakwute eze. 12  Sọl asị: “Biko, nwa Ahaịtọb, gee ntị!” Ya asị: “Onyenwe m ana m ege ntị.” 13  Sọl asị ya: “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaara m izu? Gịnị mere i ji nye ya achịcha na mma agha, jụọkwara ya Chineke ase? Ọ na-emegide m, na-akpakwa nkata ihe ọ ga-eme m, otú ọ na-eme ugbu a.” 14  Ahimelek asị eze: “Ònye n’ime ndị niile na-ejere gị ozi ka e kwesịrị ịtụkwasị obi ka Devid?+ Ọ bụ ọgọ eze,+ bụrụ onyeisi ndị nche gị, bụrụkwa onye a na-akwanyere ùgwù n’ụlọ gị.+ 15  Nke a ọ̀ bụ nke mbụ m na-ajụrụ ya Chineke ase?+ O nweghị ihe ga-eme ka m gbaara gị izu. Ka eze ghara ịsị na o nwere ihe mụnwa bụ́ ohu ya nakwa ezinụlọ nna m niile mere, n’ihi na ohu gị amaghị ihe ọ bụla gbasara okwu a.”+ 16  Ma eze sịrị: “Ahimelek, ị ga-anwụrịrị,+ gị na ezinụlọ nna gị niile.”+ 17  Eze gwaziri ndị nche* nọ ya nso, sị: “Gaanụ gbuo ndị nchụàjà Jehova, n’ihi na ha dụnyeere Devid úkwù. Ha ma na ọ gbara ọsọ ma ha agwaghị m.” Ma, ndị nche ahụ achọghị ịkpa ndị nchụàjà Jehova aka. 18  Eze sịziri Doeg:+ “Gaa gbuo ndị nchụàjà a.” Ozugbo ahụ, Doeg onye Ịdọm+ gara gbuo ndị nchụàjà ahụ. N’ụbọchị ahụ, o gburu mmadụ iri asatọ na ise yi efọd e ji ákwà linin kwaa.+ 19  O jikwa mma agha gbuo ndị Nọb,+ bụ́ obodo ndị nchụàjà bi. O gburu ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma jakị ma atụrụ. 20  Ma, otu nwa Ahimelek, nwa Ahaịtọb, gbapụrụ soro Devid. Aha ya bụ Abayata.+ 21  Abayata kọọrọ Devid, sị: “Sọl egbuola ndị nchụàjà Jehova.” 22  Devid wee sị Abayata: “N’ụbọchị ahụ, ama m+ na ebe ọ bụ na Doeg onye Ịdọm hụrụ m ebe ahụ, ọ ga-agwarịrị Sọl. Ọ bụ m mere e ji gbuo onye* ọ bụla nọ n’ezinụlọ nna gị. 23  Ka mụ na gị nọrọ. Atụla egwu, n’ihi na onye ọ bụla nke na-achọ igbu gị* ga-ebugodị ụzọ gbuo m.* M ga-echebe gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”