Samuel nke Mbụ 24:1-22

  • Devid ekweghị ka e gbuo Sọl (1-22)

    • Devid kwanyeere onye Jehova tere mmanụ ùgwù (6)

24  Ozugbo Sọl chụchara ndị Filistia ọsọ lọta, ndị mmadụ bịara gwa ya, sị: “Devid nọ n’ala ịkpa En-gedi.”+  N’ihi ya, Sọl họọrọ puku ụmụ nwoke atọ (3,000) n’Izrel, kpọrọ ha gawa ịchọ Devid na ndị agha ya n’elu ugwu nke nkume juru, ebe ewu ọhịa na-ebi.  Mgbe Sọl ruru n’otu ogige atụrụ e ji nkume rụọ nke dị n’akụkụ ụzọ, ọ banyere n’ọgba dị ebe ahụ ka ọ gaa mposi. Ma, Devid na ndị agha ya nọ ọdụ n’ime ime ọgba ahụ.+  Ndị agha Devid wee sị ya: “Jehova na-asị gị taa, ‘M na-enyefe onye iro gị n’aka gị.+ I nwekwara ike ime ya ihe ọ bụla dị gị mma.’” Devid wee gaa jiri nwayọọ bekara ala ala uwe elu na-enweghị aka Sọl yi.  Ma obi* Devid mechara na-apịa ya ụtarị+ maka na o bekaara ala ala uwe elu na-enweghị aka Sọl yi.  Ọ gwara ndị agha ya, sị: “Ekwesịghị m ime onyenwe m ihe a n’ihi na ọ bụ onye Jehova tere mmanụ. Obi agaghị adị Jehova mma ma m mee onye Jehova tere mmanụ ihe ọjọọ.”+  Ihe a Devid kwuru mere ka ndị agha ya jide onwe ha.* Devid ekweghịkwa ka ha kpa Sọl aka. Ma Sọl si n’ọgba ahụ pụta gawa ebe ọ na-aga.  Devid wee si n’ọgba ahụ pụta ma jiri oké olu kpọọ Sọl, sị: “Onyenwe m eze!”+ Mgbe Sọl lere anya n’azụ, Devid hulatara kpọọrọ ya isiala.  Devid asị Sọl: “Gịnị mere i ji ege ndị mmadụ ntị mgbe ha na-ekwu na Devid na-achọ imesi gị ike?+ 10  Ị hụla otú Jehova si nyefee gị n’aka m taa mgbe anyị nọ n’ọgba. Ma, mgbe mmadụ gwara m ka m gbuo gị,+ m meere gị ebere wee sị, ‘Agaghị m eme onyenwe m ihe ọ bụla n’ihi na ọ bụ onye Jehova tere mmanụ.’+ 11  Nna m, m bekaara ala ala uwe elu gị na-enweghị aka. Lee ka m ji ya n’aka. Egbughị m gị mgbe m bekaara ya. Ị hụlanụ ya ugbu a na o nweghị ihe ọjọọ m chọrọ ime gị. Achọghịkwa m inupụrụ gị isi. O nweghịkwa ihe m mere gị.+ Ma, ị na-achụgharị m ka i gbuo m.+ 12  Ka Jehova kpee ikpe mụ na gị.+ Ka Jehova megwara gị ihe niile ị na-eme m.+ Aka m agaghị emetụ gị.+ 13  Ndị oge ochie na-atụ ilu, sị: ‘Ọ bụ ndị ajọ omume na-eme ajọ omume.’ N’ihi ya, aka m agaghị emetụ gị. 14  Ònye ka eze Izrel na-achụgharị? Ònyedị ka ị na-achụ ọsọ? Ọ̀ bụ mụnwa dị ka nkịta nwụrụ anwụ na àkpịrị́?+ 15  Ka Jehova bụrụ onyeikpe. Ọ ga-eleba okwu mụ na gị anya, kpeekwa ikpe mụ na gị.+ Ọ ga-ekpere m ikpe ma kpepụta m n’aka gị.” 16  Mgbe Devid gwachara Sọl ihe a, Sọl sịrị: “Devid nwa m, ọ̀ bụ gị nwee olu a?”+ Sọl wee malite ibesi ákwá ike. 17  Ya asị Devid: “Ị ka m bụrụ onye ezi omume, n’ihi na i meere m ihe ọma, ma m mere gị ihe ọjọọ.+ 18  Taa, ihe ọma ka i meere m n’ihi na i gbughị m mgbe Jehova nyefere m n’aka gị.+ 19  Ò nwere onye ga-ahụ onye iro ya, hapụ ya ka ọ gbalaga n’emeghị ya ihe ọ bụla? Jehova ga-eji ihe ọma kwụọ gị ụgwọ,+ n’ihi ihe ọma a i meere m taa. 20  Ama m na ị ga-abụrịrị eze,+ nakwa na ọ bụ gị na ezinụlọ gị ga na-achị alaeze Izrel. 21  Ugbu a, jiri aha Jehova ṅụọrọ m iyi+ na ị gaghị egbu ụmụ* m ndị ga-anọchi m, nakwa na ị gaghị eme ka a gharazie ịnụ aha m n’ezinụlọ nna m.”+ 22  Devid wee ṅụọrọ Sọl iyi, Sọl alawa n’ụlọ ya.+ Ma Devid na ndị agha ya gara nọrọ n’ebe a rụsiri ike.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “akọnuche.”
O nwere ike ịbụ, “laghachi azụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”