Samuel nke Mbụ 26:1-25

  • Devid ekweghịkwa ọzọ ka e gbuo Sọl (1-25)

    • Devid kwanyeere onye Jehova tere mmanụ ùgwù (11)

26  Ka oge na-aga, ndị Zif+ chọọrọ Sọl gaa Gibia,+ sị ya: “Ị̀ makwa na Devid zoro n’ugwu Hakaịla nke chere Jeshaịmọn* ihu?”+  N’ihi ya, Sọl họọrọ puku ụmụ nwoke ndị Izrel atọ (3,000) gawa ịchọ Devid n’ala ịkpa Zif.+  Sọl mara ụlọikwuu ya n’ugwu Hakaịla, n’akụkụ ụzọ e si aga Jeshaịmọn. Ma Devid nọ n’ala ịkpa. Ọ nụkwara na Sọl achụrụla ya bata n’ala ịkpa.  Devid wee zipụ ndị gara ịchọpụta ma Sọl ọ̀ bịala ebe ahụ n’eziokwu.  Devid mechara gaa ebe Sọl mara ụlọikwuu, hụ ebe Sọl na Abna+ nwa Nee, onyeisi ndị agha ya, dina na-ehi ụra. Sọl dina n’ime ụlọikwuu, ndị agha ya makwara ụlọikwuu gburugburu ya.  Devid wee jụọ Ahimelek onye Het+ nakwa Abishaị+ nwa Zeruya,+ nwanne Joab, sị: “Ònye ga-eso m gaa ebe Sọl nọ n’ụlọikwuu ya?” Abishaị asị ya: “M ga-eso gị gaa.”  Devid na Abishaị wee gaa ebe ndị agha ahụ nọ n’abalị, hụ ebe Sọl dina na-arahụ ụra n’ime ụlọikwuu ahụ. E gwunyekwara ube ya n’ala n’akụkụ isi ya. Abna na ndị agha ahụ dinakwa gburugburu ya.  Abishaị wee sị Devid: “Chineke enyefeela onye iro gị n’aka gị taa.+ Biko, hapụ m ka m jiri ube a magide ya n’ala naanị otu ugboro. Agaghị m ama ya ugboro abụọ.”  Ma, Devid sịrị Abishaị: “Akpakwala ya aka, n’ihi na a gaghị asị na aka mmadụ ka dị ọcha+ ma ọ bụrụ na onye ahụ kpara onye Jehova tere mmanụ aka.”+ 10  Devid kwukwara, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ma ọ́ bụghị na Jehova ga-eji aka ya gbuo ya,+ ya abụrụ na otu ụbọchị+ ọ ga-anwụ otú ndị ọzọ si anwụ, ma ọ bụkwanụ na ọ ga-aga agha, agha ahụ ataa isi ya.+ 11  Ma, ebe ọ bụ na m na-akwanyere Jehova ùgwù, agaghị m anwa anwa kpaa onye Jehova tere mmanụ aka.+ N’ihi ya, biko, weta ube ahụ dị n’akụkụ isi ya na ihe mmiri ahụ, ka anyị pụwa.” 12  Devid wee were ube ahụ na ihe mmiri ahụ dị n’akụkụ isi Sọl, ha apụwa. E nweghị onye hụrụ ha+ ma ọ bụ mata ihe ha mere. Ndị agha ahụ niile nọ n’ụra. E nweghịkwa onye tetara, n’ihi na Jehova mere ka ha rahụ ezigbo ụra. 13  Devid wee gafee n’akụkụ nke ọzọ ma kwụrụ n’elu ugwu, ebe dị anya n’ebe Sọl nọ. 14  Devid wee kpọọ ndị agha Sọl na Abna+ nwa Nee, sị: “Abna, zaa m.” Abna asị ya: “Onye na-akpọ eze, ị̀ bụ onye?” 15  Devid asị Abna: “Ọ̀ kwa ị bụ dike? Ònye dịkwa ka gị n’Izrel? Gịnịzi mere na i cheghị onyenwe gị eze nche? N’ihi na otu onye agha batara ka o gbuo eze bụ́ onyenwe gị.+ 16  Ihe i mere adịghị mma. Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na i kwesịrị ịnwụ, n’ihi na i cheghị onyenwe unu, bụ́ onye Jehova tere mmanụ, nche.+ Legharịgodị anya ebe ahụ ị nọ. Olee ebe ube eze na ihe mmiri ya,+ ndị dịbu n’akụkụ isi ya, dị?” 17  Sọl wee mata na ọ bụ olu Devid. Ya asị ya: “Devid nwa m, ọ̀ bụ gị nwe olu a?”+ Devid asị ya: “Ọ bụ olu m, onyenwe m eze.” 18  O kwukwara, sị: “Gịnị mere onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya?+ Gịnị ka m mere? Oleekwa ihe ọjọọ m mere?+ 19  Biko, onyenwe m eze, gee ohu gị ntị: Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova mere ka ị na-emegide m, ya nabata* àjà ọka m ga-achụrụ ya. Ma ọ bụrụ ndị mmadụ,+ ka Jehova taa ha ahụhụ, n’ihi na ha achụpụla m taa. Ha ekweghị ka m soro ndị Jehova nọrọ.+ Ha na-asịkwa m, ‘Gaa fewe chi ọzọ.’ 20  Ma ugbu a, ekwela ka ọbara m tasa n’ala n’ebe dị anya n’ebe Jehova nọ. Onye eze Izrel pụrụ na-achụgharị bụ onye dị ka otu àkpịrị́.+ Ọ na-achụgharịkwa ya otú mmadụ si achụgharị ọkwà n’elu ugwu.” 21  Sọl wee sị: “Emehiela m.+ Devid nwa m, lọta, n’ihi na agaghịzi m akpa gị aka, ebe ọ bụ na i gosiri taa na i jighị ndụ* m egwu egwu.+ N’eziokwu, ezuzuola m nzuzu. Emehiekwala m ezigbote ihe.” 22  Devid asị ya: “Lekwa ube eze. Ka otu n’ime ndị agha gị gafeta were ya. 23  Ọ bụ Jehova ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ maka ezi omume o mere+ nakwa isi o rubere. Jehova nyefere gị n’aka m taa, ma obi ekweghị m kpaa onye Jehova tere mmanụ aka.+ 24  Ma, ebe ọ bụ na m mere ihe gosiri na ejighị m ndụ* gị egwu egwu taa, ka Jehova jirikwa ndụ* m kpọrọ ihe, ka ọ napụtakwa m ná mkpagbu niile.”+ 25  Sọl asị Devid: “Ka Chineke gọzie gị, Devid nwa m. Ị ga na-akpa ike. Ihe ga na-agazikwara gị.”+ Devid wee pụwa, Sọl alaghachi n’ụlọ ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ọzara; ala ịkpa.”
Na Hibru, “nụrụ ísì.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”