Samuel nke Mbụ 27:1-12

  • Ndị Filistia nyere Devid Ziklag (1-12)

27  Ma, Devid gwara onwe ya, sị: “Otu ụbọchị aka Sọl ga-akpara m, ya egbuo m. Ihe ga-akara m mma bụ ịgbaga+ n’ala ndị Filistia. Ike ga-agwụkwa Sọl ịna-achụgharị m ebe niile n’Izrel.+ M ga-enwerekwa onwe m.”  Devid na narị ụmụ nwoke isii (600)+ so ya wee gakwuru Ekish+ nwa Meyọk, eze Gat.  Devid wee biri na Gat na nke Ekish, ya na ụmụ nwoke so ya, onye nke ọ bụla na ezinụlọ ya. Devid kpọ ndị nwunye ya abụọ. Aha otu bụ Ahịnoam+ nwaanyị Jezril, aha nke ọzọ abụrụ Abigel+ nwaanyị Kamel, onye bụ́bu nwunye Nebal.  Mgbe a gwara Sọl na Devid agbagala Gat, ọ kwụsịrị ịchọ ya.+  Devid wee sị Ekish: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, nye m otu ebe n’otu n’ime ime obodo ndị dị n’obodo a, ka m biri. Olee otú ohu gị ga-esi biri n’obodo gịnwa bụ́ eze bi?”  Ekish wee nye ya Ziklag+ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ndị eze Juda nwe Ziklag ruo taa.  Devid biri n’ime ime obodo ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.+  Devid na ndị agha ya na-aga alụso ndị Geshọ,+ ndị Gazaịt, na ndị Amalek+ agha. Ndị a bi si na Tilam ruo Shọọ,+ ruokwa Ijipt.  Devid gaa ịlụso ndị a agha, ọ na-egbu ma nwoke ma nwaanyị.+ Ma ọ na-achịrị ewu na atụrụ, ehi, jakị, kamel, na uwe. Ya mechaa, ya alaghachikwuru Ekish. 10  Ya lọta, Ekish asị ya: “Olee ebe unu gara agha taa?” Devid asị ya: “Ọ bụ na ndịda Juda”+ ma ọ bụ ya asị, “N’ebe ndịda nke ndị Jeramiel”+ ma ọ bụkwanụ ya asị, “N’ebe ndịda nke ndị Kenaịt.”+ 11  Ma ọ dịghị onye Devid na-ahapụ ndụ, ma nwoke ma nwaanyị, ka a ghara ịkpọrọ ha lọta Gat, n’ihi na ọ na-asị: “Ka ha ghara ịgbabọ anyị, sị, ‘Lekwa lekwa ihe Devid mere.’” (Ihe a ka ọ na-eme n’oge niile o bi n’ime ime obodo ndị Filistia.) 12  N’ihi ya, Ekish na-ekweta ihe Devid na-ekwu, na-agwa onwe ya, sị: “N’eziokwu, ndị Izrel, bụ́ ndị nke ya, ga-akpọzi ya asị. N’ihi ya, ọ gaghịzi akwụsị ịna-ejere m ozi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji