Samuel nke Mbụ 29:1-11

  • Ndị Filistia atụkwasịghị Devid obi (1-11)

29  Ndị Filistia+ wee kpọkọta ndị agha ha niile n’Efek. Ma ndị Izrel mara ụlọikwuu ha n’akụkụ isi iyi dị na Jezril.+  Ndị isi ndị Filistia nọ na-agafe n’ìgwè n’ìgwè. E nwere ndị nke dị otu narị mmadụ otu narị mmadụ, nwee ndị nke dị otu puku mmadụ otu puku mmadụ. Ma, Devid na ndị agha ya nakwa Ekish nọ n’azụ azụ na-eso ha.+  Ma, ndị isi ndị Filistia sịrị: “Gịnị mere ndị Hibru a ji soro anyị?” Ekish asị ha: “Onye a bụ Devid onye na-ejere Sọl eze Izrel ozi. Mụ na ya anọọkwala kemgbe ihe karịrị otu afọ ugbu a.+ O nweghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla m hụrụ o mere malite n’ụbọchị ọ gbakwutere m ruo taa.”  Ma, ndị isi ndị Filistia wesara ya iwe ma sị ya: “Gwa nwoke a ka ọ laghachi.+ Ya laghachi ebe i nyere ya. Ekwela ka o soro anyị jee agha, ka ọ ghara ịgbanwe obi ya lụsowezie anyị agha n’agha ahụ.+ È nwere otú ọzọ ka mma ya na onyenwe ya ga-esi kpezie ma e wezụga i bugara ya isi ndị agha anyị?  Ọ́ bụghị Devid a ka ndị mmadụ ji maka ya na-agba egwú, na-agụkwa egwú, sị: ‘Sọl egbuola puku kwuru puku,Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku’?”+  Ekish+ wee kpọọ Devid, sị ya: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na ị bụ ezigbo mmadụ. Achọkwara m ka i soro mụ na ndị agha m gaa agha a,+ n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m hụrụ i mere malite n’ụbọchị ị bịakwutere m ruo taa.+ Ma, ndị isi ndị ọzọ atụkwasịghị gị obi.+  Laghachi n’udo. Emekwala ihe ọ bụla na-adịghị ndị isi ndị Filistia mma.”  Ma, Devid sịrị Ekish: “Gịnịkwanụ ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụrụ ohu gị mere malite n’ụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị mere na m gaghị eso gị gaa lụso ndị iro onyenwe m eze agha?”  Ekish wee sị Devid: “Ị bụ ezigbo mmadụ n’anya m. Ị dịkwa ka mmụọ ozi Chineke.+ Ma ndị isi ndị Filistia sịrị m, ‘Ekwela ka o soro anyị gaa agha.’ 10  N’ihi ya, gị na ndị na-ejere onyenwe gị ozi, ndị so gị bịa, bilie n’isi ụtụtụ lawa ozugbo unu hụwara ìhè.” 11  Devid na ndị so ya wee bilie n’isi ụtụtụ, ka ha laghachi Filistia. Ma ndị Filistia gawara Jezril.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji