Samuel nke Mbụ 3:1-21

  • Jehova họpụtara Samuel ka ọ bụrụ onye amụma (1-21)

3  N’oge ahụ, nwata ahụ bụ́ Samuel nọ na-ejere Jehova ozi,+ na-enyekwara Ịlaị aka. Ma, ọ na-esi ike ịnụ okwu Jehova n’oge ahụ. A naghị ahụkarịkwa ọhụụ.+  Anya Ịlaị na-ahụzi inyoghi inyoghi. Ọ naghịkwa ahụ ụzọ nke ọma.+ Otu ụbọchị, o dina ebe ọ na-edinakarị.  E menyụbeghịkwa ọkụ* dị n’ụlọ Chineke.+ Samuel dinakwa n’ụlọ nsọ*+ Jehova, ebe Igbe Chineke dị.  Jehova wee kpọọ Samuel. Ya asị: “Lee m ebe a.”  Ya agbara gakwuru Ịlaị, sị: “Lekwa m! Ọ̀ kwa ị kpọrọ m?” Ya asị: “Akpọghị m gị. Gaa hiwe ụra ị na-ehi.” Ya agaghachi hiwe ụra.  Jehova kpọkwara ya ọzọ, sị: “Samuel!” Samuel ebilie gakwuru Ịlaị, sị: “Lekwa m! Ọ̀ kwa ị kpọrọ m?” Ya asị: “Akpọghị m gị, nwa m. Gaa hiwe ụra ị na-ehi.”  (N’oge a, Samuel amatachabeghị Jehova, Jehova ezitụbeghịkwa ya ozi ọ bụla.)+  Jehova kpọkwara ya nke ugboro atọ, sị: “Samuel!” Samuel ebilie gakwuru Ịlaị, sị: “Lekwa m! Ọ̀ kwa ị kpọrọ m?” Ọ bụ mgbe ahụ ka Ịlaị matara na ọ bụ Jehova na-akpọ nwata ahụ.  N’ihi ya, Ịlaị sịrị Samuel: “Gaa dinara ala, ya kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Jehova, biko kwuwe, ohu gị na-ege ntị.’” Samuel wee gaa dinara ala n’ebe ọ na-edina. 10  Jehova kpọkwara ya ọzọ, sị: “Samuel, Samuel!” Samuel asị: “Biko, kwuwe, ohu gị na-ege ntị.” 11  Jehova wee sị Samuel: “O nwere ihe m ga-eme n’Izrel. Ntị ọ bụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.+ 12  N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ihe niile m kwuru gbasara Ịlaị na ezinụlọ ya, si n’isi ruo ná ngwụcha.+ 13  Gwa ya na m ga-ata ezinụlọ ya ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi maka mmehie ọ ma gbasara ya,+ n’ihi na ụmụ ya na-akparị mụnwa bụ́ Chineke,+ ma ọ baraghị ha mba.+ 14  Ọ bụ ya mere m ji ṅụọ iyi na o nweghị àjà ma ọ bụ onyinye ga-eme ka a gbaghara ezinụlọ Ịlaị mmehie ha.”+ 15  Samuel hiweziri ụra chi abọọ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ụzọ ụlọ Jehova. Ụjọ nọkwa na-atụ Samuel ịkọrọ Ịlaị ọhụụ ahụ. 16  Ma Ịlaị kpọrọ Samuel, sị: “Samuel, nwa m!” Ya asị: “Lekwa m.” 17  Ya ajụọ ya, sị: “Gịnị ka ọ gwara gị? Biko, ezochirila m ya. Ka Chineke taa gị ahụhụ, ka ọ tasiekwa gị ahụhụ ike ma i zochiere m ihe ọ bụla n’ihe niile ọ gwara gị.” 18  Samuel wee gwa ya ihe niile. O nweghị ihe o zochiiri ya. Ịlaị asị: “Ọ bụ Jehova kwuru ya. Ya mee ihe ọ bụla dị mma n’anya ya.” 19  Samuel nọ na-eto. Jehova nọnyeere ya,+ meekwa ka ihe niile Samuel kwuru mezuo. 20  Ndị Izrel niile, malite na Dan ruo Bia-shiba, matara na Samuel abụrụla onye amụma Jehova. 21  Jehova nọkwa na-apụta na Shaịlo, n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka Jehova na-agwa Samuel ihe gbasara yanwa bụ́ Jehova.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “oriọna.”
Ya bụ, n’ụlọikwuu.