Samuel nke Mbụ 5:1-12

  • Mgbe ndị Filistia bu Igbe Ọgbụgba Ndụ laa n’ala ha (1-12)

    • E menyere Degọn ihere (1-5)

    • A tara ndị Filistia ahụhụ (6-12)

5  Mgbe ndị Filistia buuru Igbe+ ezi Chineke, ha si n’Ebeniza buga ya n’Ashdọd.  Ndị Filistia bubatakwara Igbe ezi Chineke n’ụlọ* Degọn ma dọwa ya n’akụkụ Degọn.+  N’echi ya, mgbe ndị Ashdọd pụtara n’isi ụtụtụ, ha hụrụ na Degọn adaala kpuo ihu n’ala n’ihu Igbe Jehova.+ Ha wee bughachi Degọn ebe ọ na-adị.+  Mgbe ha biliri n’isi ụtụtụ echi ya, ha hụrụ na Degọn adaala kpuo ihu n’ala n’ihu Igbe Jehova. E gbupụkwala isi Degọn na ọbụ aka ya abụọ, ha atọgbọrọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. Naanị ahụ́ ya* fọziri.  Ọ bụ ya mere na ruo taa, ndị nchụàjà Degọn na ndị niile na-abanye n’ụlọ Degọn anaghị azọ ụkwụ n’ọnụ ụzọ ụlọ Degọn nke dị n’Ashdọd.  Jehova wee tawa ndị Ashdọd ahụhụ, mesiekwa ha ike. O mere ka ọkpụ ikè nyewe ndị bi n’Ashdọd nakwa ndị bi n’obodo ndị dị ya nso nsogbu.+  Mgbe ndị Ashdọd hụrụ otú ihe si kwụrụ, ha sịrị: “Unu ekwela ka Igbe Chineke Izrel ka dịrị n’obodo anyị, n’ihi na ọ taala anyị na Degọn, bụ́ chi anyị, ezigbo ahụhụ.”  N’ihi ya, ha ziri ozi kpọkọta ndị isi ndị Filistia niile, jụọ ha, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme Igbe Chineke Izrel?” Ha asị: “Ka e buru Igbe Chineke Izrel gaa Gat.”+ Ha wee buru Igbe Chineke Izrel gaa ebe ahụ.  Mgbe ha bugara ya ebe ahụ, Jehova tawara obodo ahụ ahụhụ, ezigbo ụjọ ejide ha. O mekwara ka ọkpụ ikè nyewe ndị obodo ahụ nsogbu, ma onye ukwu ma onye nta.+ 10  N’ihi ya, ha bugara Igbe ezi Chineke n’Ekrọn.+ Ma, ozugbo ha butere Igbe ezi Chineke n’Ekrọn, ndị Ekrọn malitere iti mkpu, sị: “Ha ebuterela anyị Igbe ezi Chineke Izrel ka anyị niile nwụọ!”+ 11  Ha wee zie ozi kpọkọta ndị isi ndị Filistia niile, sị ha: “Bupụnụ Igbe Chineke Izrel ebe a. Bughachinụ ya ebe o si ka anyị na ndị obodo anyị ghara ịnwụ.” Ụjọ ọnwụ nọkwa na-atụ ndị obodo ahụ niile. Ezi Chineke nọkwa na-ata ha ahụhụ.+ 12  Ọkpụ ikè nyewekwara ndị nke na-anwụghị nsogbu. Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-eti mkpu ka e nyere ha aka, nke na mkpu ha na-eti ruru eluigwe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ụlọ arụsị.”
Ma ọ bụ “ebe yiri azụ̀ n’ahụ́ ya.” Na Hibru, “Naanị Degọn.”