Samuel nke Mbụ 8:1-22

  • Ndị Izrel gwara Samuel ka ọ họpụtara ha eze (1-9)

  • Samuel gwara ndị Izrel ihe eze ha ga na-eme ha (10-18)

  • Jehova họpụtaara ndị Izrel eze otú ha chọrọ (19-22)

8  Mgbe Samuel mere agadi, ọ họpụtara ụmụ ya ndị nwoke ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel.  Aha ọkpara ya bụ Joel. Aha nwa ya nwoke nke abụọ bụ Abaịja.+ Ha nọ na Bia-shiba na-ekpe ikpe.  Ma, ụmụ ya anaghị eme ka ya. Ha nọ na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru,+ na-ana aka azụ,*+ na-ekpekwa ikpe arụrụala.+  Ka oge na-aga, ndị okenye niile n’Izrel zukọtara wee bịakwute Samuel na Rema.  Ha sịrị ya: “I meela agadi, ma ụmụ gị anaghị eme ka gị. Họpụtara anyị eze ga na-ekpere anyị ikpe otú mba niile ọzọ na-eme.”+  Ma, obi adịghị Samuel mma maka na ha sị ya họpụtara ha eze ga na-ekpere ha ikpe. Samuel wee kpee ekpere gwa Jehova ihe a.  Jehova asị Samuel: “Mee ihe niile ha na-agwa gị. Ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ka m ghara ịbụ eze ha.+  Otu ihe ahụ ha na-eme m kemgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha ruo taa ka ha na-emekwa gị. Ha na-ahapụ m+ gaa na-efe chi ọzọ dị iche iche.+  Mee ihe ha kwuru. Ma, dọsie ha aka ná ntị ike, gwakwa ha ihe eze ga na-achị ha nwere ikike ịgwa ha ka ha na-emere ya.” 10  Samuel wee gwa ndị ahụ na-achọ ka ọ họpụtara ha eze ihe niile Jehova kwuru. 11  Ọ sịrị: “Ihe a ka eze ga na-achị unu nwere ikike ime:+ Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwoke,+ ha abụrụ ndị agha ga na-agba ụgbọ ịnyịnya ya,+ na-agbakwa ịnyịnya ya.+ Ụfọdụ ga na-agbakwa ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya. 12  Ọ ga-ahọpụtakwara onwe ya ndị isi agha ga na-edu otu puku otu puku ndị agha+ na ndị nke ga na-edu ndị agha iri ise iri ise.+ Ọ ga-ahọpụtakwa ụfọdụ ka ha na-akọrọ ya ubi,+ na-ewekwara ya ihe ubi,+ na-akpụkwara ya ngwá agha na ngwá ụgbọ ịnyịnya.+ 13  Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwaanyị ka ha na-esi mmanụ otite,* na-esi nri, na-emekwa achịcha.+ 14  Ọ ga-enye ndị na-ejere ya ozi ala unu ndị kacha mma na ubi vaịn unu ndị kacha mma nakwa ubi oliv unu ndị kacha mma.+ 15  Ọ ga-enye ndị na-eje ozi n’obí ya nakwa ndị na-ejere ya ozi otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe unu wetara n’ubi ọka wit unu nakwa n’ubi vaịn unu. 16  Ọ ga-akpọrọ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị na-ejere unu ozi, kpụrụkwa ehi unu ndị kacha mma, na jakị unu. Ọ ga-ejikwa ha na-arụ ọrụ ya.+ 17  Ọ ga-akpụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ewu na atụrụ unu.+ Unu ga na-agbakwara ya ohu. 18  Otu ụbọchị, unu ga-eti mkpu, beekwa ákwá n’ihi ihe eze unu ji aka unu họrọ na-eme unu,+ ma Jehova agaghị atụpụrụ unu ọnụ.” 19  Ma, ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị: “Nsogbu adịghị. Anyị chọrọ eze ga na-achị anyị. 20  Anyị ga-adịzi ka mba niile ọzọ. Eze anyị ga na-ekpere anyị ikpe, na-edukwa anyị ma na-alụrụ anyị agha.” 21  Mgbe Samuel nụchara ihe niile ha kwuru, ọ gwara ya Jehova. 22  Jehova asị Samuel: “Mee ihe ha kwuru, họpụtakwara ha eze ga na-achị ha.”+ Samuel wee sị ndị Izrel: “Onye ọ bụla n’ime unu laa n’obodo ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-eri ngarị.”
Ma ọ bụ “na-emepụta ihe na-esi ísì ọma.”