Samuel nke Mbụ 9:1-27

  • Samuel na Sọl nọkọrọ (1-27)

9  E nwere otu nwoke, onye ebo Benjamin, bara ezigbo ọgaranya. Aha ya bụ Kish,+ nwa Abayel, nwa Ziroa, nwa Bikorat, nwa Afaya, onye ebo Benjamin.+  O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl.+ Nwa ya a mara mma okorobịa. O nweghịkwa nwoke ọ bụla n’Izrel ka ya mma. Ọ kacha mmadụ niile ogologo. Ndị na-esote ya n’ogologo na-eru ya n’ubu.  Mgbe ụfọdụ jakị* Kish nna Sọl furu, Kish sịrị Sọl nwa ya: “Biko, kpọrọ otu n’ime ndị na-ejere m ozi gaa chọọ jakị ndị ahụ.”  Ha gara chọọ ha n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, gaakwa Shalisha, ma ha ahụghị ha. Ha gakwara chọọ jakị ndị ahụ na Shealim, ma ha anọghị ebe ahụ. Ha gakwara chọọ ha ebe niile n’ala ebo Benjamin, ma ha ahụghị ha.  Mgbe ha rutere Zọf, Sọl gwara onye na-ejere ya ozi ya na ya so, sị: “Bịa ka anyị lawa, ka nna m ghara ichegbuwe onwe ya banyere anyị kama ichewe banyere jakị ndị ahụ.”+  Ma onye na-ejere ya ozi sịrị ya: “Onye nke Chineke nọ n’obodo dị nso ebe a. Ọ bụ nwoke a na-akwanyere ùgwù. Ihe niile ọ na-ekwu na-emezu.+ Ka anyị gaa ebe ahụ ugbu a. O nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme.”  Ma Sọl gwara onye na-ejere ya ozi, sị: “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Achịcha agwụla n’akpa anyị. Ọ dịghị ihe anyị ga-enye onye nke ezi Chineke. Gịnị ka anyị ji anyị ga-enye ya?”  Onye ahụ na-ejere Sọl ozi gwaziri ya, sị: “M ji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke shekel* ọlaọcha. M ga-enyekwa ya onye nke ezi Chineke. Ọ ga-agwakwa anyị ihe anyị ga-eme.”  (N’oge ochie n’Izrel, ọ bụrụ na mmadụ na-aga ịjụta Chineke ihe, ọ ga-asị: “Bịanụ, ka anyị gakwuru onye ọhụ ụzọ.”+ N’ihi na onye a na-akpọ onye amụma taa ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ n’oge ochie.) 10  Sọl wee gwa onye na-ejere ya ozi, sị: “Ihe i kwuru dị mma. Bịa ka anyị gawa.” Ha agawazie n’obodo ahụ onye nke ezi Chineke nọ. 11  Ka ha na-aga n’ụzọ e si aga obodo ahụ, ha hụrụ ụmụ agbọghọ na-aga isere mmiri. Ha asị ha: “Onye ọhụ ụzọ+ ọ̀ nọ ebe a?” 12  Ụmụ agbọghọ ahụ asị ha: “Ọ nọ ya. Ebe ọ nọ ka dị n’ihu. Gawanụ ngwa ngwa. Ọ bịara n’obodo a taa, n’ihi na e nwere àjà a ga-achụ+ maka ndị Izrel taa n’ebe dị elu+ a na-anọ efe Chineke. 13  Ozugbo unu banyere n’obodo, unu ga-ahụ ya. Gawanụ ngwa ngwa tupu ya agbagoo iri ihe n’ebe ahụ dị elu. Ndị mmadụ agaghị eri ihe ruo mgbe ọ bịara, n’ihi na ọ bụ ya ga-agọzi anụ e ji chụọ àjà. Ya gọzichaa ya, ndị a kpọrọ òkù ga-eriwezi ihe. Gawanụ ugbu a. Unu ga-ahụ ya.” 14  Ha wee gawa n’obodo ahụ. Ka ha na-abata n’obodo ahụ, Samuel nọ na-apụta ka ya na ha hụ ka ọ kpọrọ ha gawa n’ebe ahụ dị elu. 15  N’ụbọchị bọtara ụbọchị Sọl bịara, Jehova gwara Samuel, sị: 16  “Ụdị oge a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin.+ Tee ya mmanụ ka ọ bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+ Ọ ga-anapụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia. N’ihi na ahụla m ahụ́ a na-emekpa ndị m. Anụkwala m ákwá ha na-ebe.”+ 17  Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Jehova sịrị ya: “Onye a bụ nwoke ahụ m gwara gị maka ya, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-achị ndị m.’”+ 18  Sọl wee bịakwute Samuel n’ọnụ ụzọ ámá, sị ya: “Biko, gwa m, olee ụlọ onye ọhụ ụzọ?” 19  Samuel asị Sọl: “Ọ bụ m bụ onye ọhụ ụzọ ahụ. Buru m ụzọ gbagowe n’ebe dị elu, mụ na gị ga-eri nri taa.+ M ga-ahapụkwa gị n’ụtụtụ ka ị lawa. M ga-agwakwa gị ihe niile ị chọrọ ịma.* 20  Echegbuzila onwe gị gbasara jakị ndị ahụ furu abalị atọ gara aga,+ n’ihi na a hụla ha. A sị ka e kwuwe, ọ bụ gị na ezinụlọ nna gị niile nwe ihe niile bara ezigbo uru n’Izrel.”+ 21  Sọl asị ya: “Abụ m onye ebo Benjamin. Ebo anyị kacha nta n’ebo niile n’Izrel.+ E nweghịkwa ihe ezinụlọ anyị bụ ma a bịa n’ezinụlọ niile dị n’ebo Benjamin. Gịnịzi mere i ji gwa m ihe a ị gwara m?” 22  Samuel wee kpọrọ Sọl na onye na-ejere Sọl ozi kpọbata ha n’ụlọ a na-anọ eri ihe, gwa ha ka ha nọdụ n’isi oche n’ebe ndị a kpọrọ òkù nọ. Ha niile dịkwa ihe dị ka mmadụ iri atọ. 23  Samuel gwara onye na-esi nri, sị: “Nye m ihe ahụ m nyere gị ka i dowe iche.” 24  Onye ahụ na-esi nri wee bupụtara Sọl ụkwụ anụ nke anụ e ji chụọ àjà. Samuel asị Sọl: “E butarala gị anụ e dowere iche. Rie ya, n’ihi na e doweere gị ya ka i rie n’oriri a. Agwara m ha na e nwere ndị m kpọrọ òkù.” Sọl na Samuel wee rikọọ ihe n’ụbọchị ahụ. 25  E mechaa, ha si n’ebe ahụ dị elu+ banye n’ime obodo. Samuel na Sọl gakwara n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu, Samuel ana-akọrọ ya ihe ọ nọ na-akọrọ ya. 26  N’echi ya, ha tetara n’isi ụtụtụ, Samuel agwa Sọl n’elu ụlọ, sị: “Jikere ka m dupụ gị.” Sọl wee jikere, ya na Samuel apụwa. 27  Ka ha na-eru ná ngwụcha ngwụcha obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl: “Gwa onye na-ejere gị ozi+ ka ọ gafere anyị gatụwa. Ma gịnwa, guzoro ebe a ka m gwa gị ihe Chineke kwuru.” Onye na-ejere Sọl ozi wee gatụwa n’ihu ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nne jakị.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Na Hibru, “ihe niile dị gị n’obi.”