Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti 5:1-25

  • Otú mmadụ kwesịrị isi na-agwa ma ndị na-eto eto ma ndị okenye okwu (1, 2)

  • Ilekọta ndị di ha nwụrụ (3-16)

    • Mmadụ igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha (8)

  • Na-akwanyere ndị okenye na-agbasi mbọ ike ùgwù (17-25)

    • “Na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị” (23)

5  Ejila iwe agwa okenye okwu.+ Kama, na-agwa ya okwu otú i si agwa nna gị, na-agwakwa ụmụ okorobịa okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwoke.  Na-agwakwa ụmụ nwaanyị merela agadi okwu otú i si agwa ndị nne, na-agwakwa ụmụ agbọghọ okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwaanyị, n’ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi.  Na-akwanyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ndị nọ ná mkpa,* ùgwù, na-elekọtakwa ha.+  Ma ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla di ya nwụrụ mụrụ ụmụ ma ọ bụ na o nwere ụmụ ụmụ, ha buru ụzọ lekọta ndị ezinụlọ ha+ iji gosi na ha na-efe Chineke. Ha kwesịrị ịna-emere ndị nne na nna ha na ndị nne nne ha na ndị nna nna ha ihe ha kwesịrị imere ha.+ Ọ na-amasị Chineke ma ha na-eme otú a.+  Ma nwaanyị isi mkpe, nke nọ ná mkpa n’eziokwu, atụkwasịla Chineke obi.+ Ọ na-arịọsikwa ya arịrịọ ike, na-ekpe ekpere ehihie na abalị.+  Ma nwaanyị isi mkpe, nke na-eme ihe na-agụ ahụ́ ya agụụ,* nwụrụ anwụ, ọ bụ eziokwu na ọ dị ndụ.  N’ihi ya, na-akụziri ha ihe ndị a, ka a ghara ịna-ekwujọ ha.  N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ anaghị egboro ndị nke ya mkpa ha, nke ka nke, ndị ezinụlọ ya, onye ahụ ajụla Chineke, jọkarịakwa onye na-ekweghị na Chineke ná njọ.+  Ka nwaanyị karịrịla afọ iri isii, nke di ya nwụrụ, soro ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa. Ọ ga-abụkwa onye na-agbaghị n’èzí mgbe di ya nọ ndụ.* 10  O kwesịkwara ịbụ onye e ji ịrụ ọrụ ọma mara,+ onye zụrụ ụmụ ya nke ọma,+ onye lere ọbịa,+ onye sara ụkwụ ndị nsọ,+ onye nyeere ndị nọ n’ahụhụ aka,+ onye jikwa ụdị ọrụ ọma niile kpọrọ ihe. 11  Ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-emebeghị agadi, esoghị ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa, n’ihi na ịlụ di na-abụ mkpa ha mgbe agụụ mmekọahụ chịwara ha, kama ijere Kraịst ozi. 12  A ga-ama ha ikpe n’ihi na ha emeghịzi ihe ha kwere ná nkwa na mbụ. 13  Ha na-anọkwa nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha na-anọ nkịtị, ha na-agbakwa asịrị, na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha,+ na-ekwukwa ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu. 14  N’ihi ya, achọrọ m ka ụmụ nwaanyị na-emebeghị agadi, ndị di ha nwụrụ, lụọ di.+ Ka ha mụọkwa ụmụ,+ na-elekọta ezinụlọ ha, ka a ghara inwe ihe ndị na-emegide anyị ga-eji kwujọọ anyị. 15  N’eziokwu, ụfọdụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ akwụsịla ife Chineke, sorozie Setan. 16  Ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla bụ́ Onye Kraịst nwere ndị ikwu bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ya nyere ha aka, ka ọgbakọ ghara ibu ibu ha. Ọ ga-eme ka ọgbakọ nwee ike ịna-enyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ ná mkpa aka.*+ 17  E kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụ ọrụ ha nke ọma+ ùgwù okpukpu abụọ,+ karịchaa, ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.+ 18  N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”*+ Ọ sịkwara, “E kwesịrị ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya.”+ 19  Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla ma è nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbara akaebe ya.+ 20  Nọrọ n’ihu mmadụ niile dọọ ndị na-eme mmehie+ aka ná ntị,+ ka ụjọ ime mmehie wee tụọ ndị ọzọ. 21  Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke, na n’ihu Kraịst Jizọs, na n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ, ka i lezie anya na-eme ihe ndị a n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu.+ 22  Ebikwasịla onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa.*+ Aka gị adịkwala ná mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha. 23  Aṅụzila mmiri ọzọ,* kama na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị na ọrịa ị na-arịakarị. 24  E nwere ụfọdụ ndị mmehie ha na-agba n’anwụ ozugbo, ya emee ka a maa ha ikpe. Ma, mmehie ndị nke ọzọ na-agba n’anwụ ka oge na-aga.+ 25  Otú ahụkwa ka ndị mmadụ na-ama mgbe a rụrụ ọrụ ọma.+ A gaghịkwa ezochili ọrụ ọma ọ bụla ndị mmadụ na-amaghị mgbe a rụrụ ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ndị a na-ekwu ebe a bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-enweghị onye na-elekọta ha.
O nwere ike ịbụ agụụ mmekọahụ ka a na-ekwu ebe a.
Na Grik, “nwunye nke otu di.”
Ndị a na-ekwu ebe a bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ma o nweghị onye na-elekọta ha.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ya bụ, ahọpụtala onye ọ bụla ọkụ ọkụ.
Ma ọ bụ “Aṅụla naanị mmiri.”