Ndị Eze nke Abụọ 1:1-18

  • Ịlaịja kwuru na Ehazaya ga-anwụrịrị (1-18)

1  Mgbe Ehab nwụchara, ndị Moab+ malitere inupụrụ ndị Izrel isi.  N’oge ahụ, Ehazaya dara ada ma merụọ ahụ́. O si n’ihe e ji kpuchie oghere dị n’ọnụ ụlọ ya dị n’elu na Sameria daa. N’ihi ya, o ziri ndị mmadụ, sị: “Gaanụ jụọ Belzibọb, bụ́ chi ndị Ekrọn,+ ma ahụ́ a m merụrụ ọ̀ ga-alakwa.”+  Ma, mmụọ ozi Jehova gwara Ịlaịja*+ onye Tishbe, sị: “Bilie, gakwuru ndị ahụ eze Sameria ziri ozi, sị ha, ‘Ọ̀ bụ na e nweghị Chineke n’Izrel mere unu ji aga ịjụ Belzibọb, bụ́ chi ndị Ekrọn, ase?+  N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: “Ị gaghị esi n’àkwà* a i dina bilie, maka na ị ga-anwụrịrị.”’” Mgbe Ịlaịja kwuchara ihe a, ya alawa.  Ozugbo ndị ozi ahụ laghachikwuuru Ehazaya, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji lọghachite?”  Ha asị ya: “E nwere otu nwoke bịakwutere anyị, sị, ‘Laghachikwurunụ eze ahụ ziri unu ozi, sịkwanụ ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ̀ bụ na e nweghị Chineke n’Izrel mere i ji zie ndị mmadụ ka ha gaa jụọ Belzibọb, bụ́ chi ndị Ekrọn, ase? N’ihi ya, ị gaghị esi n’àkwà a i dina bilie, maka na ị ga-anwụrịrị.’”’”+  Ya asị ha: “Olee otú nwoke ahụ gwara unu ihe a dị?”  Ha asị ya: “O yi uwe e ji ajị anụ dụọ,+ o kekwara ájị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù.”+ Ehazaya asị ozugbo ahụ: “Ọ bụ Ịlaịja onye Tishbe.”  O wee zie onyeisi ndị agha iri ise na ndị agha iri ise na-eso ya ka ha gaa kpọọ Ịlaịja. Mgbe onyeisi ndị agha ahụ ruru, Ịlaịja nọ ọdụ n’elu ugwu. Ya asị Ịlaịja: “Onye nke ezi Chineke,+ eze sị gị bịa.” 10  Ma Ịlaịja sịrị onyeisi ndị agha iri ise ahụ: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke, ka ọkụ si n’eluigwe bịa+ regbuo gị na ndị agha iri ise so gị.” Ọkụ wee si n’eluigwe bịa regbuo ya na ndị agha iri ise so ya. 11  Ehazaya zikwara onyeisi ndị agha iri ise ọzọ na ndị agha iri ise na-eso ya, ha agaa zie Ịlaịja, sị: “Onye nke ezi Chineke, eze sịrị gị bịa ọsọ ọsọ.” 12  Ma Ịlaịja sịrị ha: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke ezi Chineke, ka ọkụ si n’eluigwe bịa regbuo gị na ndị agha iri ise so gị.” Chineke wee si n’eluigwe zite ọkụ, ya eregbuo ya na ndị agha iri ise so ya. 13  Ehazaya zigakwara onyeisi ndị agha iri ise nke atọ na ndị agha iri ise na-eso ya. Ma, onyeisi ndị agha iri ise nke a bịara gbuo ikpere n’ala n’ihu Ịlaịja, malite ịrịọ ya ka o meere ya amara. Ọ sịrị ya: “Onye nke ezi Chineke, biko, ka ihe gbasara ndụ* mụ na ndị ohu gị iri ise a metụ gị n’obi. 14  Ọkụ si n’eluigwe bịa regbuo onyeisi ndị agha iri ise nke mbụ na nke abụọ nakwa ndị agha iri ise so onye nke ọ bụla n’ime ha. Ma ugbu a, ka ihe gbasara ndụ* m metụ gị n’obi.” 15  Mmụọ ozi Jehova wee gwa Ịlaịja, sị: “Soro ya gawa. Atụla ya egwu.” O wee bilie soro ya gawa na nke eze. 16  Ịlaịja wee sị eze, “Jehova kwuru, sị: ‘Ihe i ji zie ndị mmadụ ka ha gaa jụọ Belzibọb, bụ́ chi ndị Ekrọn,+ ase ọ̀ bụ n’ihi na e nweghị Chineke n’Izrel?+ Gịnị mere ị jụghị ya ase? N’ihi ya, ị gaghị esi n’àkwà ahụ i dina bilie, n’ihi na ị ga-anwụrịrị.’” 17  Ọ nwụkwara otú ahụ Jehova si n’ọnụ Ịlaịja kwuo. Ebe ọ bụkwa na ọ mụtaghị nwa, Jehoram*+ nọchiri ya, malite ịchị. Ọ malitere ịchị n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Jehoram+ nwa Jehoshafat eze Juda. 18  Ma, e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ehazaya+ na ihe ndị o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ịlaịja pụtara “Chineke M Bụ Jehova.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ya bụ, nwanne Ehazaya.