Ndị Eze nke Abụọ 10:1-36

  • Jihu gburu ndị ezinụlọ Ehab (1-17)

    • Jehonadab nyeere Jihu aka (15-17)

  • Jihu gburu ndị na-efe Bel (18-27)

  • Otú ọchịchị Jihu si gaa (28-36)

10  Ma, ụmụ Ehab+ ndị nwoke iri asaa nọ na Sameria. N’ihi ya, Jihu dere akwụkwọ ozi, e ziga ya Sameria, nye ya ndị isi Jezril, ndị okenye,+ na ndị na-elekọta ụmụ Ehab.* Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ:  “Unu na ụmụ onyenwe unu nọ. Ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya na ngwá agha ndị dị ebe ahụ dịkwa unu n’aka. Unu bikwa n’obodo a rụsiri ike. Akwụkwọ ozi a ruo unu aka,  họpụtanụ nwa onyenwe unu nke kacha mma, kachakwa ruo eruo ịbụ eze, chiekwanụ ya eze ka ọ nọrọ n’ocheeze nna ya. Lụọkwaranụ ezinụlọ onyenwe unu agha.”  Ma, egwu tụrụ ha, ha asị: “Ndị eze abụọ emerilighị ya,+ ọ̀ bụzi anyịnwa ga-emerili ya?”  N’ihi ya, onye na-elekọta obí* eze, onyeisi obodo ahụ, ndị okenye, na ndị na-elekọta ụmụ eze zigaara Jihu ozi, sị: “Anyị bụ ndị ohu gị. Anyị ga-eme ihe niile ị ga-agwa anyị. Anyị agaghị echi onye ọ bụla eze. Mee ihe ọ bụla dị mma n’anya gị.”  N’ihi ya, o degaara ha akwụkwọ ozi nke abụọ, sị: “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu dị njikere irubere m isi, buterenụ m isi ụmụ onyenwe unu ụdị oge a echi na Jezril.” N’oge ahụ, ụmụ eze, ndị nwoke iri asaa, nọ n’ụlọ ndị na-azụ ha, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù n’obodo ahụ.  Ozugbo akwụkwọ ozi ahụ ruru ha aka, ha kpọọrọ ụmụ eze, ndị nwoke iri asaa,+ gbuo, wụnye isi ha na nkata, burukwa ha bugara Jihu na Jezril.  Otu onye batara bịa gwa Jihu, sị: “Ha ebutela isi ụmụ eze.” Ya asị: “Kposanụ ha ụzọ abụọ n’ọnụ ụzọ ámá, ka ha dịrịkwa ebe ahụ ruo ụtụtụ.”  Mgbe Jihu pụtara ebe ahụ n’ụtụtụ, ọ gara guzoro n’ihu mmadụ niile nọ ebe ahụ, sị: “Aka unu dị ọcha.* N’eziokwu, ọ bụ m gbara izu gbuo onyenwe m.+ Ma, ònye gburu ndị a niile? 10  Maranụ na o nweghị ihe ọ bụla Jehova kwuru, nke Jehova kwuru ga-eme ezinụlọ Ehab, na-agaghị emezu.+ Jehova emeela ihe o si n’ọnụ ohu ya bụ́ Ịlaịja kwuo.”+ 11  Jihu gbukwara ndị ezinụlọ Ehab niile fọrọ na Jezril, ha na ndị niile a na-akwanyere ùgwù na-ejere Ehab ozi, ndị enyi ya, na ndị nchụàjà ya.+ O nweghị onye n’ime ha ọ hapụrụ ndụ.+ 12  Mgbe o gbuchara ha, ọ lawara Sameria. E nwekwara ụlọ ndị na-azụ atụrụ na-anọ akpacha ajị atụrụ dị n’ụzọ o si lawa. 13  Ka Jihu na-eru ebe ahụ, ọ hụrụ ụmụnne Ehazaya+ eze Juda. Ya ajụọ ha, sị, “Ùnu bụ ole ndị?” Ha asị: “Anyị bụ ụmụnne Ehazaya. Anyị na-aga ka anyị mara otú ụmụ eze na ndị nne eze* mụrụ mere.” 14  Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Jidenụ ha!” Ha wee jide ha, gbuo ha n’olulu mmiri dị n’ụlọ ahụ a na-anọ akpacha ajị atụrụ. Ha dị ụmụ nwoke iri anọ na abụọ. Ọ hapụghị otu onye n’ime ha ndụ.+ 15  Ka o si ebe ahụ na-aga, ọ hụrụ Jehonadab+ nwa Rikab+ ka ọ na-abịa izute ya. Mgbe o kelere* ya, ọ sịrị ya: “Ì ji obi gị niile na-akwado m otú m si jiri obi m niile na-akwado gị?” Jehonadab asị: “Ee.” Jihu asị ya: “Ọ bụrụ otú ahụ, nye m aka gị.” Ya enye ya aka ya, Jihu adọgote ya n’ụgbọ ịnyịnya, 16  gwakwa ya, sị: “Soro m gaa ka ị hụ na anaghị m agbachi ndị na-enupụrụ Jehova isi nkịtị.”*+ Jihu wee buru ya n’ụgbọ ịnyịnya agha ya na-aga. 17  Jihu mechara lọrute Sameria, gbuokwa ndị niile fọrọ n’ezinụlọ Ehab nọ ebe ahụ. O gbugidere ha ruo mgbe o gbuchara ha niile,+ otú Jehova gwara Ịlaịja.+ 18  Jihu kpọkọtakwara mmadụ niile, sị ha: “Ehab efesighị Bel ike,+ ma Jihu ga-efesi ya ike. 19  Kpọkọtaranụ m ndị amụma Bel niile,+ ndị niile na-efe ya, na ndị nchụàjà ya niile.+ Ka a ghara ịchọ onye ọ bụla n’ime ha achọ, n’ihi na m ga-achụrụ Bel nnukwu àjà. Onye ọ bụla a chọrọ achọ agaghị adị ndụ.” Ma, Jihu chọrọ isi otú a rata ndị na-efe Bel ma bibie ha. 20  Jihu kwukwara, sị: “Kọsaanụ na a ga-enwe nzukọ pụrụ iche maka Bel.” Ha wee kọsaa ya. 21  Jihu zikwara ndị mmadụ ha agaa ebe niile n’Izrel kpọọ ndị niile na-efe Bel, ha abịa. O nweghị onye n’ime ha na-abịaghị. Ha niile banyekwara n’ụlọ Bel,+ ya eju n’ọnụ. 22  Jihu gwakwara onye na-elekọta ebe a na-achịsa ákwà, sị: “Chịpụtara ndị niile na-efe Bel uwe,” ya achịpụtara ha uwe ha ga-eyi. 23  Jihu na Jehonadab+ nwa Rikab banyeziri n’ụlọ Bel, Jihu asị ndị na-efe Bel: “Leruonụ anya ka unu jide n’aka na e nweghị onye ọ bụla na-efe Jehova nọ ebe a, kama na ọ bụ naanị ndị na-efe Bel nọ ebe a.” 24  N’ikpeazụ, ha malitere ịchụ àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ. Jihu gwara ụmụ nwoke iri asatọ ka ha guzoro n’èzí, sịkwa ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ahapụ nwoke ọ bụla n’ime ndị a m na-enyefe n’aka unu, onye ahụ ga-eji ndụ* ya kwụọ ụgwọ ya.” 25  Ozugbo a chụchara àjà ahụ a na-esu ọkụ, Jihu gwara ndị nche* na ndị na-esote ndị isi ndị agha, sị: “Batanụ, gbuo ha! Unu ekwela ka onye ọ bụla gbapụ.”+ Ndị nche na ndị na-esote ndị isi ndị agha maliteziri iji mma agha na-egbu ha, na-atụpụkwa ozu ha n’èzí. Ha gbugidere ha ruo n’ime ime ụlọ Bel. 26  Ha bupụtakwara ogidi arụsị+ ndị dị n’ụlọ Bel ma kpọọ ha ọkụ.+ 27  Ha kwatukwara ogidi arụsị+ Bel, kwatuokwa ụlọ Bel,+ mezie ka ọ bụrụ ebe a na-aga mposi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ruo taa. 28  Otú a ka Jihu si mee ka ndị Izrel kwụsị ife Bel. 29  Ma, Jihu ahapụchaghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, ndị mere ka ndị Izrel mehie. Ọ hapụrụ ndị Izrel ka ha na-efe ụmụ ehi ọlaedo ndị otu n’ime ha dị na Betel, otu adịrị na Dan.+ 30  Ma, Jehova sịrị Jihu: “I mere ihe niile m bu n’obi ime ezinụlọ Ehab.+ Ihe a i mere dị mma, o zikwara ezi n’anya m. N’ihi ya, ụmụ gị ndị nwoke ga-anọ n’ocheeze Izrel ruo ọgbọ anọ.”+ 31  Ma Jihu asaghị anya na mmiri jiri obi ya niile debe Iwu Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ Ọ hapụchaghị mmehie niile Jeroboam mere, ndị mere ka ndị Izrel mehie.+ 32  Ọ bụ n’oge ahụ ka Jehova gbara nkịtị ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-anara ndị Izrel ala ha.* Hazel sikwa ná mpaghara ala ha niile na-alụso ha agha.+ 33  Ọ malitere ná mpaghara ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ya bụ, obodo Gilied niile, ebe ebo Gad, ebo Ruben, na ebo Manase+ bi. Ụfọdụ n’ime obodo ndị ahụ si Aroa, nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo Gilied na Beshan.+ 34  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jihu, ihe niile o mere, na ike niile ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 35  Jihu mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya na Sameria, Jehoahaz+ nwa ya anọchie ya, malite ịchị. 36  Jihu nọ na Sameria chịa Izrel afọ iri abụọ na asatọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị na-elekọtara Ehab ihe.”
Na Hibru, “ụlọ.”
Ma ọ bụ “Unu bụ ndị ezi omume.”
Ya bụ, Jezibel nwunye eze, nne Eze Jehoram.
Ma ọ bụ “ọ gọziri.”
Ma ọ bụ “ka ị hụ otú m si anụ ọkụ n’obi maka Jehova.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”
Ma ọ bụ “na-eme ka ala ndị Izrel belata.”