Ndị Eze nke Abụọ 12:1-21

  • Jehoash malitere ịchị Juda (1-3)

  • Jehoash rụziri ụlọ nsọ (4-16)

  • Obodo ndị Siria lụsoro agha (17, 18)

  • E gburu Jehoash (19-21)

12  Ọ bụ n’afọ nke asaa n’ọchịchị Jihu+ ka Jehoash+ malitere ịchị. Jehoash chịrị afọ iri anọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Zibia onye Bia-shiba.+  Jehoash nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova n’oge niile Jehoyada onye nchụàjà bụ onye ndụmọdụ ya.  Ma, o bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.  Jehoash wee sị ndị nchụàjà: “Chịkọtanụ ego niile a na-eweta n’ụlọ Jehova ka ha bụrụ onyinye dị nsọ,+ ma ụtụ onye ọ bụla kwesịrị ịtụ,+ ma ego ndị nchụàjà na-anata onye* kwere nkwa, ma ego onye nke ọ bụla si n’obi ya weta n’ụlọ Jehova.+  Ndị nchụàjà ga-anata onye ọ bụla ego o wetara,* ka e jiri ya rụzie ebe ọ bụla mebiri emebi*+ n’ụlọ nsọ.”  Ma, n’afọ nke iri abụọ na atọ n’ọchịchị Jehoash, ndị nchụàjà arụzibeghị ebe ndị mebiri emebi+ n’ụlọ nsọ.  N’ihi ya, Eze Jehoash kpọrọ Jehoyada+ onye nchụàjà na ndị nchụàjà ndị ọzọ, sị ha: “Gịnị mere na unu anaghị arụzi ebe ndị mebiri emebi n’ụlọ nsọ? Unu anatazila ndị mmadụ ego ma ọ bụrụ na unu agaghị eji ya rụzie ụlọ nsọ.”+  Ndị nchụàjà wee kwere na ha agaghịzi na-anata ndị mmadụ ego nakwa na ọ bụghịzi ha ga na-arụzi ebe ndị mebiri emebi n’ụlọ nsọ.  Jehoyada onye nchụàjà gaziri bute otu igbe+ ma kpọpuo okwuchi ya, dọsakwa ya n’aka nri ma a na-abata n’ebe ịchụàjà, n’ụlọ Jehova. Ebe ahụ ka ndị nchụàjà na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ na-etinye ego niile a na-enweta n’ụlọ Jehova.+ 10  Ọ na-abụ a hụ na ego dị n’igbe ahụ ehiela nne, odeakwụkwọ eze na nnukwu onye nchụàjà agaa wepụta ya,* gụọkwa ya ka ha mara ego ole e nwetara n’ụlọ Jehova.+ 11  Ha na-ewerekwa ya nye ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova. Ndị ahụ na-ewerezi ya kwụọ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova+ ụgwọ, ma ndị na-arụ ọrụ ndị e ji osisi arụ ma ndị na-arụ ụlọ, 12  ma ndị na-edo nkume ma ndị na-awa nkume. Ha na-ejikwa ya azụ osisi na nkume a wara awa ka e jiri rụzie ebe ndị mebiri emebi n’ụlọ Jehova. Ha na-ejikwa ego ahụ eme ihe ndị ọzọ niile gbasara ịrụzi ụlọ ahụ. 13  Ma, e jighị ego ahụ a na-eweta n’ụlọ Jehova rụọ efere ọlaọcha, ihe e ji emenyụ ọkụ, ọkwá, opi,+ ma ọ bụ ụdị arịa ọlaedo ọ bụla ma ọ bụkwanụ ụdị arịa ọlaọcha ọ bụla dị n’ụlọ Jehova.+ 14  Ọ bụ naanị ndị na-arụ ọrụ ka ha na-enye ego, ha ejiri ya na-arụzi ụlọ Jehova. 15  Ha anaghịkwa agwa ndị ahụ ha na-enye ego ha ga-eji kwụọ ndị na-arụ ọrụ ụgwọ ka ha kwuo otú ha si mefuo ego, n’ihi na ha tụkwasịrị ha obi.+ 16  Ma, a naghị eweta ego ndị mmadụ na-enye maka àjà ikpe ọmụma+ na nke ha na-enye maka àjà mmehie n’ụlọ Jehova. Ọ bụ nke ndị nchụàjà.+ 17  Ọ bụ n’oge ahụ ka Hazel+ eze Siria gara lụso Gat+ agha ma weghara ya, mechaakwa bịawa ịlụso Jeruselem agha.+ 18  Jehoash eze Juda wee zigara Hazel bụ́ eze Siria+ onyinye niile dị nsọ, ndị Jehoshafat, Jehoram, na Ehazaya, bụ́ ndị nna nna ya bu ya ụzọ chịa Juda, doro nsọ. O zigakwaara ya onyinye dị nsọ yanwa nyere nakwa ọlaedo niile dị ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze, Hazel alaghachizie, hapụ ịlụso Jeruselem agha. 19  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoash na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 20  Ma, ndị na-ejere Jehoash ozi gbaara ya izu,+ gbuo ya n’ụlọ Milo,*+ n’ụzọ e si aga Sila. 21  Ọ bụ Jozaka nwa Shimeat nakwa Jehozabad nwa Shoma, bụ́ ndị na-ejere ya ozi, gburu ya.+ Ha likwara ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Amazaya nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ga-anata ndị ha ma ego.”
Ma ọ bụ “gbawara agbawa.”
Ma ọ bụ “tinye ya n’akpa.” Na Hibru, “kechie ya.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “na Bet-milo.”