Ndị Eze nke Abụọ 13:1-25

  • Jehoahaz malitere ịchị Izrel (1-9)

  • Jehoash malitere ịchị Izrel (10-13)

  • Ịlaịsha gwara Jehoash ihe ọ ga-eme ka ọ mara ma ọ̀ na-anụ ọkụ n’obi (14-19)

  • Ịlaịsha nwụrụ, ọkpụkpụ ya mekwara ka otu nwoke si n’ọnwụ bilie (20, 21)

  • Amụma ikpeazụ Ịlaịsha buru mezuru (22-25)

13  N’afọ nke iri abụọ na atọ n’ọchịchị Jehoash+ nwa Ehazaya+ eze Juda, Jehoahaz nwa Jihu+ malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na asaa na Sameria.  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, na-akpakwa àgwà ka Jeroboam nwa Nibat, onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie.+ Ọ kwụsịghị ịkpa àgwà ka ya.  Jehova wee wesa ndị Izrel+ ezigbo iwe,+ nyefeekwa ha n’aka Hazel+ eze Siria na Ben-hedad+ nwa ya, ha ana-emesi ha ike oge niile.  Ka oge na-aga, Jehoahaz rịọrọ Jehova ka o meere ya amara, Jehova anụ arịrịọ ya, n’ihi na ọ hụrụ otú eze Siria si na-emesi ndị Izrel ike.+  N’ihi ya, Jehova mere ka e nwee onye zọpụtara ndị Izrel+ n’aka ndị Siria, ha ebirikwa n’ụlọ ha otú ha bibu.*  (Ma, ha akwụsịghị ime mmehie e ji mara ezinụlọ Jeroboam, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ Ha nọ na-eme mmehie a, ha egbutughịkwa ogwe osisi arụsị*+ ndị dị na Sameria.)  Ihe fọọrọ Jehoahaz bụ mmadụ iri ise ndị na-agba ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya iri, na puku ndị agha iri (10,000) ji ụkwụ aga, n’ihi na eze Siria bibiri ndị ọzọ,+ zọpịakwa ha, ha adịrị ka uzuzu na-adị n’oge a na-azọcha ọka.+  Ma e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara ndụ Jehoahaz, ihe niile o mere, na ike ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.  Jehoahaz mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya na Sameria,+ Jehoash nwa ya anọchie ya, malite ịchị. 10  N’afọ nke iri atọ na asaa n’ọchịchị Jehoash eze Juda, Jehoash+ nwa Jehoahaz malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na isii na Sameria. 11  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ kwụsịghị ime mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, ndị mekwara ka ndị Izrel mehie.+ Ọ nọgidere na-eme ha. 12  Ma, e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara ndụ Jehoash, ihe niile o mere, ike ọ kpara, na otú o si lụso Amazaya eze Juda agha,+ n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 13  Jehoash mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, Jeroboam*+ anọchie n’ocheeze ya. E likwara Jehoash na Sameria ebe e liri ndị eze Izrel ndị ọzọ.+ 14  Mgbe Ịlaịsha+ dara ọrịa nke mechara gbuo ya, Jehoash eze Izrel gakwuuru ya, na-ebesara ya ákwá, sị: “Nna m, nna m! M na-ahụ ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị Izrel na-agba ịnyịnya!”+ 15  Ịlaịsha asị ya: “Were ụta, chịrịkwa akụ́.” Ya ewere ụta, chịrịkwa akụ́. 16  Ịlaịsha asị eze Izrel: “Dọọ ụta ahụ.” Ya adọọ ya, Ịlaịsha atụkwasị aka ya n’aka eze, 17  sị: “Meghee windo chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.” Ya emeghee ya. Ịlaịsha asị: “Gbaa!” Ya agbaa. Ịlaịsha asịzie: “Akụ́ Jehova ji emeri,* akụ́ e ji emeri Siria! Ị ga na-egbu* ndị Siria n’Efek+ ruo mgbe i gbuchara ha.” 18  O kwukwara, sị: “Chịrị akụ́,” eze Izrel achịrị ha. Ịlaịsha asị ya: “Tie ha n’ala.” Ya etie ha n’ala ugboro atọ kwụsị. 19  Ihe a o mere kpasuru onye nke ezi Chineke ezigbo iwe, ya asị: “A sị na i tiri ha n’ala ugboro ise ma ọ bụ isii, ị gaara na-egbu ndị Siria ruo mgbe i gbuchara ha. Ma ugbu a, ugboro atọ ka ị ga-emeri ndị Siria.”+ 20  Mgbe ihe a mechara, Ịlaịsha nwụrụ, e liekwa ya. Ma, e nwere ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga+ na-esi Moab abata n’Izrel ná mmalite afọ ọ bụla. 21  Otu ụbọchị, ka ndị mmadụ na-eli otu nwoke, ha hụrụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ahụ. N’ihi ya, ha tụbara ozu nwoke ahụ ozugbo n’ebe e liri Ịlaịsha ma gbaa ọsọ. Mgbe ozu nwoke ahụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, nwoke ahụ si n’ọnwụ bilie+ ma guzoro n’ụkwụ ya. 22  Ma, Hazel+ eze Siria nọ na-emesi ndị Izrel ike+ n’oge niile Jehoahaz dị ndụ. 23  Ma, Jehova meere ha amara, meere ha ebere,+ gosikwa na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi, n’ihi ndụ ya na Ebreham+ na Aịzik+ na Jekọb+ gbara. Ọ chọghị ibibi ha. Ọ chụpụghịkwa ha n’ihu ya ruo taa. 24  Mgbe Hazel eze Siria nwụrụ, Ben-hedad nwa ya nọchiri ya, malite ịchị. 25  Jehoash nwa Jehoahaz gakwara nata Ben-hedad nwa Hazel obodo ndị Hazel naara Jehoahaz nna ya n’agha. Jehoash meriri Ben-hedad ugboro atọ,+ natakwa ya obodo ndị Izrel nwe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, n’udo na n’obi iru ala.”
Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.
Ma ọ bụ “azọpụta.”
Ma ọ bụ “na-emeri.”