Ndị Eze nke Abụọ 14:1-29

  • Amazaya malitere ịchị Juda (1-6)

  • Amazaya lụsoro ndị Ịdọm na ndị Izrel agha (7-14)

  • Jehoash eze Izrel nwụrụ (15, 16)

  • Amazaya nwụrụ (17-22)

  • Jeroboam nke Abụọ malitere ịchị Izrel (23-29)

14  N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Jehoash+ nwa Jehoahaz eze Izrel, Amazaya nwa Jehoash eze Juda malitere ịchị.  Ọ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jehoadin onye Jeruselem.+  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova, ma, o merughị ka Devid+ nna nna ya. O mere ihe niile otú Jehoash nna ya si mee.+  Ma, o bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+  Ozugbo alaeze ya siri ike, o gburu ndị na-ejere ya ozi, ndị gburu nna ya bụ́ eze.+  Ma o gbughị ụmụ ndị ahụ gburu nna ya, n’ihi na o mere ihe e dere n’akwụkwọ Mosis, ebe Jehova nyere iwu, sị: “A gaghị egbu ndị nna n’ihi ihe ụmụ ha mere, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere. Kama, ọ bụ mmehie mmadụ mere ka a ga-eji maka ya gbuo ya.”+  Amazaya gburu puku ndị Ịdọm+ iri (10,000) n’agha na Ndagwurugwu Nnu.+ O weghaara Sila n’agha ahụ,+ kpọwazie ya Jọktiel. Ọ bụkwa ihe a na-akpọ ya ruo taa.  Ka oge na-aga, Amazaya ziri ndị mmadụ ozi ha agaa gwa Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jihu eze Izrel, sị: “Bịa ka mụ na gị lụọ agha.”*+  Jehoash eze Izrel wee zigara Amazaya eze Juda ozi, sị: “Ahịhịa ogwu dị na Lebanọn zigaara osisi sida dị na Lebanọn ozi, sị, ‘Kpọnye nwa m nwoke nwa gị nwaanyị ka ọ lụwa.’ Ma, anụ ọhịa nke nọ na Lebanọn gafeere ma zọda ahịhịa ogwu ahụ. 10  Ama m na i meriela Ịdọm,+ ya ana-ebu gị isi. Nọrọ n’ụlọ* gị ka e towe gị. Gịnị mere ị ga-eji bido ọgụ a ga-emeri gị na ndị Juda?” 11  Ma Amazaya egeghị ya ntị.+ N’ihi ya, Jehoash eze Izrel buuru ọgụ gawa, ya na Amazaya eze Juda ebido ịlụ agha na Bet-shimesh+ nke dị na Juda.+ 12  Ndị Izrel wee merie ndị Juda, onye nke ọ bụla n’ime ha agbalaa n’ụlọ* ya. 13  Jehoash eze Izrel jidere Amazaya eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaya. O jidere ya na Bet-shimesh, mechaa kpụta ya Jeruselem. Ọ kwatukwara mgbidi Jeruselem, malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi.+ Mgbidi ahụ ọ kwaturu dị narị kubit anọ (400).* 14  O bukọkwaara akụ̀ ndị dị n’ụlọ eze nakwa ọlaedo na ọlaọcha niile na arịa niile dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị ebe a na-edebe akụ̀ n’ụlọ* eze. Ọ kpụkwaara ndị e jidere n’agha. Mgbe e mechara, ọ laghachiri Sameria. 15  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoash, ihe ndị o mere, ike ọ kpara, na otú o si lụso Amazaya eze Juda agha, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 16  Jehoash mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya na Sameria+ ebe e liri ndị eze Izrel, Jeroboam*+ nwa ya anọchie ya, malite ịchị. 17  Mgbe Jehoash nwa Jehoahaz eze Izrel+ nwụchara, Amazaya+ nwa Jehoash+ eze Juda nọkwuru ndụ afọ iri na ise. 18  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Amazaya n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 19  Ndị mmadụ mechara gbaara ya izu+ na Jeruselem, ya agbaga Lekish. Ma, ha ziri ndị mmadụ, ha achụrụ ya gaa Lekish, gbuo ya ebe ahụ. 20  Ha ji ịnyịnya bulata ya ma lie ya na Jeruselem ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ 21  Ndị Juda niile wee kpọrọ Azaraya,*+ chie ya eze, ya anọchie Amazaya+ nna ya. Ọ dị afọ iri na isii mgbe ahụ.+ 22  Mgbe Eze Amazaya nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ Azaraya weghaara Ilat+ ma mee ka ọ bụrụghachi obodo ndị Juda. 23  N’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Amazaya nwa Jehoash eze Juda, Jeroboam+ nwa Jehoash eze Izrel malitere ịchị na Sameria. Ọ chịkwara afọ iri anọ na otu. 24  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie.+ 25  O nwetaghachiri ala ndị Izrel malite na Libo-hemat*+ ruo n’Oké Osimiri Araba,*+ si otú a mezuo ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel si n’ọnụ ohu ya bụ́ Jona+ kwuo. Jona onye amụma bụ nwa Amitaị, bụrụkwa onye Gat-hifa.+ 26  Jehova kwuru ihe ahụ n’ihi na ọ hụrụ otú e si na-echi ndị Izrel ọnụ n’ala.+ E nweghị onye nọ n’Izrel ga-enyere ha aka. E nweghịdị ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume. 27  Ma, Jehova kwere nkwa na ya agaghị ehichapụ aha ndị Izrel n’ụwa.+ N’ihi ya, o si n’aka Jeroboam nwa Jehoash zọpụta ha.+ 28  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jeroboam, ihe niile o mere, ike ọ kpara, otú o si lụọ agha, na otú o si nwetaghachiri ndị Juda na ndị Izrel Damaskọs+ na Hemat,+ n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 29  Jeroboam mechara nwụọ otú nna nna ya hà, bụ́ ndị eze Izrel, nwụrụ, Zekaraya+ nwa ya anọchie ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ka anyị hụ ihu na ihu.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu.”
Ihe dị ka mita 178 (amaụkwụ 584). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.
Azaraya pụtara “Jehova Nyere Aka.” A kpọrọ ya Ọzaya ná 2 Eze 15:13; 2 Ihe 26:1-23; Aịza. 6:1; na Zek. 14:5.
Ma ọ bụ “n’ụzọ e si abanye Hemat.”
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.