Ndị Eze nke Abụọ 15:1-38

  • Azaraya malitere ịchị Juda (1-7)

  • Ndị eze ikpeazụ chịrị Izrel bụ: Zekaraya (8-12), Shalọm (13-16), Menahem (17-22), Pekahaya (23-26), Pika (27-31)

  • Jotam malitere ịchị Juda (32-38)

15  N’afọ nke iri abụọ na asaa n’ọchịchị Jeroboam* eze Izrel, Azaraya*+ nwa Amazaya+ eze Juda malitere ịchị.+  Ọ dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na abụọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jekọlaya. Ọ bụ onye Jeruselem.  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Amazaya nna ya mere.+  Ma, o bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+  Jehova mere ka eze rịawa ekpenta. Ọ rịagidekwara ya+ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. O bikwa n’ụlọ a rụpụrụ iche.+ Jotam+ nwa ya nọzi na-ahụ maka otú ihe si na-aga n’ụlọ* ya, na-ekpekwara ndị obodo ahụ ikpe.+  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Azaraya+ na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.  Azaraya mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ e lie ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Jotam nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.  N’afọ nke iri atọ na asatọ n’ọchịchị Azaraya+ eze Juda, Zekaraya+ nwa Jeroboam nọ na Sameria malite ịchị Izrel. Ọ chịkwara ọnwa isii.  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, otú nna nna ya hà mere. Ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 10  Ka oge na-aga, Shalọm nwa Jebesh gbaara ya izu, gbuokwa ya+ n’Ibliam.+ Mgbe o gbuchara ya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 11  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Zekaraya n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 12  Otú a ka ihe Jehova gwara Jihu si mezuo. Ọ gwara ya, sị: “Ụmụ gị ndị nwoke ga-anọ n’ocheeze Izrel+ ruo ọgbọ anọ.”+ Ihe a mekwara otú ahụ. 13  Shalọm nwa Jebesh malitere ịchị n’afọ nke iri atọ na itoolu n’ọchịchị Ọzaya+ eze Juda. Ọ nọ na Sameria chịa otu ọnwa zuru ezu. 14  Menahem nwa Gedaị sizi Teza+ bịa gbuo Shalọm+ nwa Jebesh na Sameria. Mgbe o gbuchara ya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 15  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalọm na izu ọjọọ ọ gbara n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 16  Mgbe Menahem si na Teza pụta, ndị Tifsa emeghereghị ya ọnụ ụzọ ámá. N’ihi ya, ọ lụsoro Tifsa agha ma bibie ya, gbuokwa ndị niile bi na ya, nakwa ndị bi n’obodo ndị gbara ya gburugburu. Ọ bọwakwara ụmụ nwaanyị dị ime na Tifsa afọ. 17  N’afọ nke iri atọ na itoolu n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Menahem nwa Gedaị malitere ịchị Izrel. Ọ nọkwa na Sameria chịa afọ iri. 18  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. N’oge niile ọ dị ndụ, ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 19  Pul+ eze Asiria bịara ka ọ lụso ndị Izrel agha. N’ihi ya, Menahem nyere ya otu puku (1,000) talent* ọlaọcha, ka o nyere ya aka mee ka ọchịchị ya sie ike.+ 20  Otú Menahem si nweta ọlaọcha ahụ o nyere ya bụ na o kere ndị aka ji akụ̀ a ma ama+ nọ n’Izrel ụtụ. Ọ natara onye nke ọ bụla n’ime ha shekel* ọlaọcha iri ise ma nye ha eze Asiria. Eze Asiria hapụziri ịlụso obodo ahụ agha, laghachi. 21  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Menahem+ na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 22  Menahem mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, Pekahaya nwa ya anọchie ya, malite ịchị. 23  N’afọ nke iri ise n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Pekahaya nwa Menahem nọ na Sameria malite ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. 24  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ hapụghị mmehie Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 25  Ka oge na-aga, Pika+ nwa Remalaya, bụ́ osote onyeisi ndị agha ya, gbaara ya izu ma gbuo ya na Agọb na Araye n’ebe a rụsiri ike n’ụlọ* eze na Sameria. Ụmụ nwoke ndị Gilied iri ise sokwa ya. Mgbe Pika gbuchara Pekahaya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 26  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Pekahaya na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 27  N’afọ nke iri ise na abụọ n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Pika+ nwa Remalaya malitere ịchị Izrel. Ọ nọkwa na Sameria chịa afọ iri abụọ. 28  Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ hapụghị mmehie Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 29  N’oge Pika na-achị Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria lụsoro obodo ụfọdụ agha ma weghara ha. Obodo ndị ahụ bụ Aịjọn, Ebel-bet-meaka,+ Janoa, Kidesh,+ Hezọ, Gilied,+ na Galili, ya bụ, obodo Naftalaị niile.+ Ọ dọkwaara ndị bi n’obodo ndị a n’agha laa Asiria.+ 30  Hoshia+ nwa Ịla mechakwara gbaara Pika nwa Remalaya izu ma gbuo ya. Ọ nọchikwara ya, malite ịchị n’afọ nke iri abụọ n’ọchịchị Jotam+ nwa Ọzaya. 31  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Pika na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 32  N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Pika nwa Remalaya eze Izrel, Jotam+ nwa Ọzaya+ eze Juda malitere ịchị. 33  Ọ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jerusha nwa Zedọk.+ 34  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Ọzaya nna ya mere.+ 35  Ma, o bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ Ọ bụ ya rụrụ ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago n’ụlọ Jehova.+ 36  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jotam na ihe ndị o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 37  N’oge ahụ, Jehova mere ka Rizin eze Siria na Pika+ nwa Remalaya malite ịlụso Juda agha.+ 38  Jotam mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid bụ́ nna nna ya. Ehaz nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.
Azaraya pụtara “Jehova Nyere Aka.” A kpọrọ ya Ọzaya ná 2 Eze 15:13; 2 Ihe 26:1-23; Aịza. 6:1; na Zek. 14:5.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’obí.”