Ndị Eze nke Abụọ 16:1-20

  • Ehaz malitere ịchị Juda (1-6)

  • Ehaz nyere ndị Asiria onyinye (7-9)

  • Ehaz rụrụ ụdị ebe ịchụàjà ọ hụrụ ndị na-ekpere arụsị rụrụ (10-18)

  • Ehaz nwụrụ (19, 20)

16  N’afọ nke iri na asaa n’ọchịchị Pika nwa Remalaya, Ehaz+ nwa Jotam eze Juda malitere ịchị.  Ehaz dị afọ iri abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Devid nna nna ya mere ihe dị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke ya, ma o meghị ka Devid.+  Kama, ọ kpara àgwà ka ndị eze Izrel.+ Ọ kpọdịrị nwa ya ọkụ iji chụọ àjà.+ Ihe a o mere bụ arụ mba ndị+ Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel na-akpa.  Ọ nọkwa na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu,+ n’ugwu dị iche iche, nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+  Ọ bụ n’oge ahụ ka Rizin eze Siria na Pika nwa Remalaya eze Izrel bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha.+ Ha nọchibidoro Ehaz na ndị obodo ya, ma ha emerilighị ha.  N’oge ahụ, Rizin eze Siria nyeere ndị Ịdọm aka ha enwetaghachi Ilat.+ O mechakwara chụpụ ndị Juu* n’Ilat, ndị Ịdọm agazie biri na ya ruo taa.  N’ihi ya, Ehaz ziri ndị mmadụ ha agaa zie Tiglat-piliza+ eze Asiria, sị: “Abụ m ohu gị, bụrụkwa nwa gị. Bịa napụta m n’aka eze Siria nakwa n’aka eze Izrel, ndị na-alụso m agha.”  Ehaz nyeziri eze Asiria aka azụ.+ O nyere ya ọlaọcha na ọlaedo ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze.  Eze Asiria mekwara ihe ọ rịọrọ ya. Ọ gara merie Damaskọs, dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Kia,+ gbuokwa Rizin.+ 10  Eze Ehaz gaziri Damaskọs ka ọ hụ Tiglat-piliza eze Asiria. Mgbe o ruru hụ ebe ịchụàjà dị na Damaskọs, o zigaara Yuraịja onye nchụàjà ebe e sere otú e si rụọ ebe ịchụàjà ahụ.+ 11  Yuraịja+ onye nchụàjà rụkwara ebe ịchụàjà+ dị nnọọ ka nke ahụ e sere ese Eze Ehaz si Damaskọs zitere ya. Ọ rụchara ya tupu Eze Ehaz esi Damaskọs lọta. 12  Mgbe eze lọtara ma hụ ebe ịchụàjà ahụ, ọ gara chụọ àjà n’elu ya.+ 13  Ọ chụkwara àjà a na-esu ọkụ, àjà ọka, na àjà mmanya n’elu ya, fesakwa ọbara anụ o ji chụọ àjà udo na ya. 14  O bupụkwara ebe ịchụàjà ọla kọpa+ na-adị n’ihu ụlọ Jehova, ya bụ, n’agbata ebe ịchụàjà ọhụrụ ahụ na ụlọ Jehova. O bugara ya n’ebe ugwu nke ebe ịchụàjà ọhụrụ ahụ. 15  Eze Ehaz gwara Yuraịja+ onye nchụàjà, sị: “Na-achụ àjà n’elu nnukwu ebe ịchụàjà a,+ ma àjà a na-esu ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ, ma àjà ọka a na-achụ ná mgbede,+ ma àjà a na-esu ọkụ eze wetara, ma àjà ọka o wetara. Na-achụkwa àjà ndị ọzọ niile wetara n’elu ya, ma àjà a na-esu ọkụ ma àjà ọka ma àjà mmanya. Na-efesakwa ọbara anụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ na ọbara anụ e ji chụọ àjà ndị ọzọ niile n’elu ya. E mechaa, m ga-ekwu ihe a ga-ejizi ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ na-eme.” 16  Yuraịja onye nchụàjà mekwara ihe niile Eze Ehaz gwara ya mee.+ 17  Eze Ehaz gbukasịrị akụkụ dị iche iche nke ihe ndị e ji ebu ihe+ ma wepụ efere ndị dị n’elu ha.+ O si n’elu oké ehi ndị e ji ọla kọpa kpụọ+ bupụ nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma busa ya na pevment e ji nkume rụọ.+ 18  O wepụkwara ihe e ji kpuchie elu otu ihe a rụrụ n’akụkụ ụlọ nsọ maka Ụbọchị Izu Ike, mechiekwa ụzọ eze si abata n’ụlọ Jehova. O mere ihe a n’ihi ụjọ ọ na-atụ eze Asiria. 19  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ehaz na ihe ndị o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+ 20  Ehaz mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Hezekaya*+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị Juda.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Hezekaya pụtara “Jehova Na-eme Ka E Nweta Ike.”