Ndị Eze nke Abụọ 2:1-25

  • Oké ifufe bugoro Ịlaịja n’eluigwe (1-18)

    • Ịlaịsha chịịrị uwe e ji mara Ịlaịja (13, 14)

  • Ịlaịsha mere ka mmiri Jeriko dị mma (19-22)

  • Anụ ọhịa bea abụọ dọriri ụmụaka ndị Betel (23-25)

2  Ịlaịja na Ịlaịsha+ si na Gilgal+ na-apụ mgbe Jehova chọrọ iji oké ifufe+ bugoo Ịlaịja+ n’eluigwe.*  Ịlaịja asị Ịlaịsha: “Biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa Betel.” Ma Ịlaịsha sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha wee gawa Betel.+  Ụmụ ndị amụma,* ndị nọ na Betel, pụtara bịakwute Ịlaịsha, sị ya: “Ị̀ makwa na taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ Ya asị ha: “Ama m. Gbanụ nkịtị.”  Ịlaịja asị ya: “Ịlaịsha, biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa Jeriko.”+ Ma ọ sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha nọkwa na-aga ruo Jeriko.  Ụmụ ndị amụma, ndị nọ na Jeriko, bịakwutere Ịlaịsha, sị ya: Ị̀ makwa na taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?” Ya asị ha: “Ama m. Gbanụ nkịtị.”  Ịlaịja asị ya: “Biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa n’Osimiri Jọdan.” Ma ọ sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha abụọ wee na-aga.  Ụmụ nwoke iri ise n’ime ụmụ ndị amụma gara guzoro ebe dịtụ anya. Ma ha abụọ guzo n’akụkụ Osimiri Jọdan.  Ịlaịja wee chịrị uwe e ji mara ya,+ fụkọta ya ma pịa ya na mmiri ahụ, ya ekewaa abụọ, ha abụọ esi n’ala nkịtị gafee.+  Ozugbo ha gafere, Ịlaịja sịrị Ịlaịsha: “Gwa m ihe ị chọrọ ka m meere gị tupu Chineke akpọpụ m ebe ị nọ.” Ịlaịsha asị: “Biko, m chọrọ inweta mmụọ* gị+ okpukpu abụọ.”+ 10  Ịlaịja asị: “Ihe a ị rịọrọ siri ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-akpọpụ m ebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ya.” 11  Ka ha nọ na-aga, na-ekwu okwu ka ha na-aga, n’otu ntabi anya, ụgbọ agha na-acha ọkụ ọkụ nke ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ+ dọkpụ bịara kewaa ha abụọ, oké ifufe ebugoo Ịlaịja n’eluigwe.*+ 12  Ka Ịlaịsha nọ na-ekiri ihe na-eme, o tiri mkpu, sị: “Nna m, nna m, m na-ahụ ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị Izrel na-agba ịnyịnya!”+ Mgbe ọ na-enweghịzi ike ịhụ Ịlaịja ọzọ, o tinyere aka n’uwe o yi ma dọwaa ya ụzọ abụọ.+ 13  O mechakwara chịlite uwe e ji mara Ịlaịja,+ nke si n’ahụ́ Ịlaịja dapụ, wee laghachi ma guzoro n’ụsọ Osimiri Jọdan. 14  Ọ chịịrị uwe ahụ e ji mara Ịlaịja, nke si n’ahụ́ ya dapụ, pịa ya na mmiri ahụ, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe Ịlaịsha pịara ya na mmiri ahụ, mmiri ahụ kewara abụọ, ya agafere.+ 15  Mgbe ụmụ ndị amụma, ndị nọ na Jeriko, hụrụ ya n’ebe dịtụ anya, ha sịrị: “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaịsha.”+ Ha gakwara zute ya ma kpọọrọ ya isiala. 16  Ha gwara ya, sị: “E nwere mmadụ iri ise gbasiri ike, ha na ndị ohu gị nọ. Biko, ka ha gaa chọọ nna gị ukwu. O nwere ike ịbụ na mmụọ* Jehova ebuliela ya, buga ya n’otu ugwu ma ọ bụ buda ya n’otu ndagwurugwu.”+ Ma ọ sịrị: “Unu ezigala ha.” 17  Ma, ha nọ na-agwa ya ihe a ruo mgbe o mewere ya ihere, ya asịzie ha: “Ziganụ ha.” Ha wee ziga ụmụ nwoke iri ise ahụ, ha agaa na-achọ ya ruo ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya. 18  Ha lọghachikwutere ya na Jeriko+ ebe ọ nọ. Ya asị ha: “Ọ̀ kwa m gwara unu agala?” 19  Ka oge na-aga, ndị obodo ahụ sịrị Ịlaịsha: “Nna anyị ukwu, ị manụ na obodo anyị a dị ebe dị mma,+ ma mmiri anyị adịghị mma. Ala anyị anaghịkwa eme nri.”* 20  Ya asị: “Wetaranụ m obere efere ọhụrụ, wụnyekwanụ nnu n’ime ya.” Ha agaa were ya wetara ya. 21  Ya ewere ya gaa n’isi mmiri ahụ wụnye nnu ahụ na ya,+ sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Emeela m ka mmiri a dị mma. Ọ gaghị egbu mmadụ ọzọ, ọ gaghịzikwa eme ka ndị mmadụ ghara ịmụta ụmụ.’”* 22  Otú a ka mmiri ahụ si dị mma ruo taa, otú ahụ Ịlaịsha kwuru. 23  Ịlaịsha sikwa ebe ahụ gawa Betel. Ka ọ nọ n’ụzọ, ụfọdụ ụmụntakịrị ndị nwoke si n’obodo ahụ pụta, malite ịkwa ya emo,+ na-asị ya: “Si ebe a pụọ, onye isi nkwọcha! Si ebe a pụọ, onye isi nkwọcha!” 24  N’ikpeazụ, ọ tụgharịrị, hụ ha ma jiri aha Jehova bụọ ha ọnụ. Nne anụ ọhịa bea abụọ+ wee si n’oké ọhịa pụta dọrie ụmụaka iri anọ na abụọ n’ime ha.+ 25  O sikwa ebe ahụ gagide ruo Ugwu Kamel,+ sikwa ebe ahụ laghachi Sameria.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na mbara igwe.”
O yiri ka “ụmụ ndị amụma” a na-ekwu gbasara ha bụ ndị a na-akụziri ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị amụma ma ọ bụkwanụ òtù ndị amụma.
Mmụọ a nwere ike ịbụ mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụkwanụ ụdị obi Ịlaịja nwere.
Ma ọ bụ “na mbara igwe.”
Ma ọ bụ “ifufe.”
O nwere ike ịbụ, “Ala anyị na-emekwa ka ime na-apụ ụmụ nwaanyị dị ime.”
O nwere ike ịbụ, “ka ime na-apụ ndị mmadụ.”