Ndị Eze nke Abụọ 21:1-26

  • Manase malitere ịchị Juda. O gburu ọtụtụ mmadụ (1-18)

    • A ga-ebibi Jeruselem (12-15)

  • Emọn malitere ịchị Juda (19-26)

21  Manase+ dị afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na ise na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Hefziba.  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, na-akpa ụdị arụ mba ndị+ ahụ Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel nọ na-akpa.+  Ọ rụghachiri ebe ndị dị elu Hezekaya nna ya bibiri.+ Ọ rụụrụ Bel ebe ịchụàjà, rụọkwa ogwe osisi arụsị,*+ otú Ehab eze Izrel mere.+ Ọ nọ na-akpọrọ ihe niile dị n’eluigwe isiala, na-efekwa ha.+  Ọ rụkwara ebe ịchụàjà dị iche iche n’ụlọ Jehova.+ Ụlọ a bụ ụlọ Jehova kwuru gbasara ya, sị: “M ga-eme ka a nọrọ na Jeruselem na-eto aha m.”+  Ọ rụkwaara ihe niile dị n’eluigwe+ ebe ịchụàjà dị iche iche n’ogige abụọ ndị dị n’ụlọ Jehova.+  Ọ kpọkwara nwa ya ọkụ iji chụọ àjà. O mere anwansi,* gbaakwa afa ka ọ mata ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Ọ họpụtakwara ndị ga na-agba afa na ndị ga na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.  O dowere arụsị ọ pịrị apị, ya bụ, ogwe osisi arụsị*+ n’ụlọ ahụ Jehova gwara Devid, gwakwa Solomọn nwa ya gbasara ya, sị: “N’ụlọ a nakwa na Jeruselem, bụ́ ebe m họọrọ n’ime ebo niile n’Izrel, ka a ga-anọ na-eto aha m mgbe niile.+  Ọ bụrụhaala na ndị Izrel elezie anya na-eme ihe niile m si n’ọnụ Mosis gwa ha ka ha na-eme,+ ya bụ, na-edebe Iwu m niile, o nweghị ihe ga-eme ka m chụpụ ha n’ala m nyere ndị nna nna ha.”+  Ma ha erubeghị isi, kama Manase nọ na-eduhie ha, na-eme ka ha na-eme ihe ọjọọ karịa mba ndị ahụ Jehova lara n’iyi mgbe ndị Izrel weghaara ala ha.+ 10  Jehova sikwa n’ọnụ ndị amụma, bụ́ ndị ohu ya,+ na-ekwu, sị: 11  “Manase eze Juda akpaala arụ ndị a niile. O meela ihe ọjọọ karịa nke ndị Amọraịt niile,+ ndị biri ebe ahụ tupu yanwa.+ O jirila arụsị ya dị iche iche na-asọ oyi* mee ka ndị Juda mehie. 12  N’ihi ya, Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị Jeruselem+ na Juda, nke na ntị ọ bụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.+ 13  M ga-esetị eriri e ji atụ̀ ihe+ na Jeruselem, jiri ya tụọ ya otú ahụ m si jiri ya tụọ Sameria.+ M ga-ejikwa ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị* tụọ Jeruselem, otú ahụ m si jiri ya tụọ ezinụlọ Ehab.+ M ga-ehichakwa Jeruselem otú ahụ mmadụ si ehicha efere, ya hichaa ya, ya ekpuwe ya ihu n’ala.+ 14  M ga-ahapụ ndị fọdụrụ ná ndị nke m,+ nyefeekwa ha n’aka ndị iro ha. Ndị iro ha niile ga-adọrọ ha n’agha, kwakọrọkwa ihe ha.+ 15  Ihe a ga-eme ha maka na ha nọ na-eme ihe dị njọ n’anya m, na-akpasukwa m iwe malite n’oge ndị nna nna ha si n’Ijipt pụta ruo taa.’”+ 16  Manase gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha. O gburu ndị mmadụ si n’otu isi na Jeruselem ruo n’isi nke ọzọ.+ E wezụgakwa nke ahụ, o mere ihe dị njọ n’anya Jehova, nke mere ka ndị Juda mehie. 17  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Manase, ihe niile o mere, na mmehie ndị o mere, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 18  Manase mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya n’ubi dị n’obí ya, n’ubi Ọza.+ Emọn nwa ya nọchikwara ya, malite ịchị. 19  Emọn+ dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ abụọ na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Meshọlemet nwa Herọz onye Jọtba. 20  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Manase nna ya mere.+ 21  Ọ nọ na-akpa àgwà ka nna ya, na-efe arụsị ndị na-asọ oyi nna ya fere, na-akpọkwara ha isiala.+ 22  Otú ahụ ka o si hapụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ya. Ọ kpaghịkwa àgwà otú Jehova chọrọ.+ 23  N’ikpeazụ, ndị na-ejere Eze Emọn ozi gbaara ya izu ma gbuo ya n’ụlọ ya. 24  Ma, ndị obodo ahụ gburu ndị niile ahụ gbaara Eze Emọn izu. Ha chikwara Josaya nwa ya eze, ya anọchie ya.+ 25  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Emọn na ihe o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 26  Ha liri ya n’ili ya dị n’ubi Ọza.+ Josaya+ nwa ya nọchikwara ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “majik.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Ma ọ bụ “ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ.”