Ndị Eze nke Abụọ 22:1-20
22 Josaya+ dị afọ asatọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri atọ na otu na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Jedaịda nwa Adaya onye Bọzkat.+
2 O mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, kpaakwa àgwà ka Devid nna nna ya.+ Ọ hapụghị ime ihe ziri ezi mewe ihe ọzọ.
3 N’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Eze Josaya, o ziri Shefan, bụ́ odeakwụkwọ, bụrụkwa nwa Azalaya nwa Meshọlam, ka ọ gaa n’ụlọ Jehova.+ Ọ gwara ya, sị:
4 “Gakwuru Hilkaya+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, gwa ya ka o wekọta ego niile a na-eweta n’ụlọ Jehova,+ nke ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nakọtara ndị mmadụ.+
5 Hụkwa na e nyere ya ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova. Ndị ahụ ga-enyezi ya ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova, bụ́ ndị ga-arụzi ebe ndị mebiri emebi* n’ụlọ ahụ,+
6 ya bụ, ndị omenkà, ndị na-arụ ụlọ, na ndị na-edo ụlọ, ka ha jirikwa ya zụọ osisi na nkume ndị a wara awa a ga-eji rụzie ụlọ ahụ.+
7 Ma, a gaghị agwa ha ka ha kwuo otú ha si mefuo ego, n’ihi na a tụkwasịrị ha obi.”+
8 Hilkaya bụ́ nnukwu onye nchụàjà mechara gwa Shefan bụ́ odeakwụkwọ,+ sị: “Ahụrụ m akwụkwọ e dere Iwu Mosis+ n’ụlọ Jehova.” Hilkaya wee nye Shefan akwụkwọ ahụ, ya amalite ịgụ ya.+
9 Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee gakwuru eze ma sị ya: “Ndị na-ejere gị ozi awụpụtala ego e nwetara n’ụlọ ahụ, ha enyekwala ya ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọrụ ahụ a na-arụ n’ụlọ Jehova.”+
10 Shefan bụ́ odeakwụkwọ gwakwara eze, sị: “E nwere akwụkwọ+ Hilkaya onye nchụàjà nyere m.” Shefan maliteziri ịgụrụ ya eze.
11 Ozugbo eze nụrụ ihe e dere n’akwụkwọ ahụ e dere Iwu Mosis, ọ dọwara uwe ya.+
12 Eze gwaziri Hilkaya onye nchụàjà, Ahaịkam+ nwa Shefan, Akbọ nwa Mịkaya, Shefan bụ́ odeakwụkwọ, nakwa Asaya bụ́ onye na-ejere eze ozi, sị:
13 Gaanụ jụọ Jehova ase n’aha m, n’aha ndị ala anyị, nakwa n’aha ndị Juda niile. Jụọnụ ya gbasara ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ, n’ihi na Jehova ga-ewesa anyị ezigbo iwe+ maka na nna nna anyị hà emeghị ihe o kwuru. Ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a ka anyị mee.”
14 Hilkaya onye nchụàjà na Ahaịkam na Akbọ na Shefan na Asaya wee gakwuru Họlda onye amụma nwaanyị.+ Họlda bụ nwunye Shalọm nwa Tikva nwa Hahas, onye na-elekọta uwe. N’oge ahụ, Họlda bi n’ebe a na-akpọ Obodo Ọhụrụ na Jeruselem. Ha gara ebe ahụ gwa ya ihe mere ha ji bịa.+
15 Ya asị ha: “Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị, ‘Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịa hụ m, sị:
16 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị obodo a na ndị bi na ya. Ihe niile e dere n’akwụkwọ ahụ eze Juda gụrụ ga-emezu.+
17 Ebe ọ bụ na ha ahapụla m na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche+ àjà a na-esu ọkụ, si otú ahụ jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ na-akpasu m iwe,+ iwe m ga-ewesa obodo a ga-adị ọkụ. M gaghịkwa akwụsị iwesa ha iwe.’”+
18 Ma, gwanụ eze Juda, onye ziri unu ka unu jụọ Jehova ase, sị, “Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị: ‘A bịa n’ihe gbasara okwu ahụ ị nụrụ,
19 anụla m olu gị, ebe ọ bụ na ị kpọchighị obi gị, kama, i wedara onwe gị ala+ n’ihu mụnwa bụ́ Jehova ma dọwaa uwe gị,+ beekwa ákwá n’ihu m mgbe ị nụrụ ihe m kwuru m ga-eme obodo a na ndị bi na ya, ya bụ, na ọnụ m bụrụ ha ga-emezu nakwa na ọ ga-eju ndị mmadụ anya.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
20 “Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka e lie gị otú e liri nna nna gị hà. A ga-eli gị n’ili gị n’udo. Anya gị agaghịkwa ahụ ahụhụ niile m ga-ata obodo a.’”’” Ndị ozi ahụ wee gaa gwa eze ihe ha jetara.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “gbawara agbawa.”