Ndị Eze nke Abụọ 25:1-30

  • Nebukadneza nọchibidoro Jeruselem (1-7)

  • E bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ a rụrụ na ya, dọrọkwa ndị nke abụọ n’agha (8-21)

  • A họpụtara Gedalaya ka ọ bụrụ gọvanọ (22-24)

  • E gburu Gedalaya, ndị mmadụ agbaga Ijipt (25, 26)

  • A kpọpụtara Jehoyakin n’ụlọ mkpọrọ na Babịlọn (27-30)

25  N’abalị iri n’ọnwa iri, n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya, Nebukadneza+ eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara ịlụso Jeruselem agha.+ Ọ mara ụlọikwuu ọ ga-anọ lụso ya agha, rụọkwa mgbidi gburugburu ya ka o nwee ike nọchibido ya.+  Ọ nọchibidokwara Jeruselem ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya.  N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ ahụ, ụnwụ bịara ka njọ+ na Jeruselem, ndị mmadụ ahụghịkwa nri ha ga-eri.+  Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem.+ Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Eze gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+  Ma ndị agha Kaldia chụwara ya, chụkwute ya n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ.  Ndị Kaldia jidere ya,+ kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. Ha makwara ya ikpe.  Ha gburu ụmụ ya ndị nwoke n’ihu ya. Nebukadneza rụkpọsịkwara Zedekaya anya, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn.+  N’abalị asaa n’ọnwa ise, n’afọ nke iri na itoolu n’ọchịchị Nebukadneza eze Babịlọn, Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche, onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara Jeruselem.+  Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova+ ma ụlọ* eze+ ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama.+ 10  Ndị agha Kaldia niile ha na onyeisi ndị nche+ ahụ so bịa kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu. 11  Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị fọrọ na Jeruselem n’agha, dọrọ ndị chịliiri eze Babịlọn aka elu ma na-akwadozi ya, dọrọkwa ndị ọzọ fọrọnụ.+ 12  Ma, ọ hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ka ha na-arụ ọrụ n’ubi vaịn nakwa n’ubi ọ bụla ọzọ a manyere ha ịrụ ọrụ.+ 13  Ndị Kaldia kụrisịrị ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova, gbukasịakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ dị n’ụlọ Jehova nakwa otu nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ a na-akpọ Oké Osimiri.+ Ha bukwaara ọla kọpa e ji rụọ ihe ndị a laa Babịlọn.+ 14  Ha bukọkwaara ite, shọvel, ihe ndị e ji emenyụ ọkụ, iko, na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ, ndị e ji arụ ọrụ n’ụlọ nsọ. 15  Onyeisi ndị nche ahụ bukọkwaara ihe ndị e ji agụrụ ọkụ na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo+ na ezigbo ọlaọcha rụọ.+ 16  A bịa n’ihe gbasara arịa niile Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova, ma ogidi abụọ ma nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma ihe ndị e ji ebu ihe, a gaghị atụli ọla kọpa o ji rụọ ha atụ̀, n’ihi na ha karịrị akarị.+ 17  Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit* iri na asatọ.+ E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke mbụ. Ogo ihe a a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit atọ. E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe yiri ihe a kpara akpa+ na ihe yiri mkpụrụ pomigranet ndị e ji gbaa ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu. Otú a ogidi nke mbụ dị, ka nke abụọ dịkwa. 18  Onyeisi ndị nche ahụ kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà, na Zefanaya+ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 19  Ndị ọzọ ọ kpụụrụ n’obodo ahụ bụ otu onye na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onyeisi ndị agha, mmadụ ise nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị ndụmọdụ eze, odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị obodo ma a chọọ ịga agha, nakwa ụmụ nwoke iri isii ndị obodo ahụ, bụ́ ndị nkịtị fọrọ n’obodo. 20  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche kpụụrụ ha kpụtara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla.+ 21  Eze Babịlọn wee gbuo ha na Ribla nke dị na Hemat.+ Otú a ka e si dọrọ ndị Juda n’agha pụọ n’obodo ha.+ 22  Nebukadneza eze Babịlọn họpụtaziri Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ ka ọ bụrụ gọvanọ ndị ọ hapụrụ na Juda.+ 23  Ozugbo ndị niile bụ́ ndị isi ndị agha na ndị agha ha nụrụ na eze Babịlọn họpụtara Gedalaya, ha bịakwutere Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. Ndị isi ndị agha ahụ bụ: Ishmel nwa Netanaya, Johenan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet onye Netofa, na Jeazanaya nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha.+ 24  Gedalaya ṅụụrụ ha na ndị agha ha iyi ma sị ha: “Unu atụla egwu ijere ndị Kaldia ozi. Birinụ n’ala a jewere eze Babịlọn ozi, ihe ga-agazikwara unu.”+ 25  N’ọnwa nke asaa, Ishmel+ nwa Netanaya nwa Elishama, onye si n’ezinụlọ eze, na mmadụ iri ọzọ, bịara gbuo Gedalaya. Ha gbukwara ndị Juu na ndị Kaldia ya na ha nọ na Mizpa.+ 26  Ụjọ jidere mmadụ niile n’ihi ndị Kaldia+ mgbe ha gbuchara ha. N’ihi ya, ma onye ukwu ma onye nta ma ndị isi ndị agha gbara ọsọ gbaga Ijipt.+ 27  N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa iri na abụọ, n’afọ nke iri atọ na asaa a dọọrọ Jehoyakin+ eze Juda n’agha, Ivil-merodak eze Babịlọn si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin eze Juda.+ Ọ bụ n’afọ ahụ ka Ivil-merodak malitere ịchị. 28  O medara obi gwa Jehoyakin okwu, buliekwa ya n’ọkwá, ya akara ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babịlọn. 29  Jehoyakin wee yipụ uwe ndị mkpọrọ o yi. Ya na eze rikọwara nri na tebụl oge niile ọ dị ndụ. 30  Eze na-enyekwa ya nri ọ na-eri kwa ụbọchị oge niile ọ dị ndụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obí.”
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.