Ndị Eze nke Abụọ 6:1-33

  • Ịlaịsha mere ka isi anyụike see n’elu mmiri (1-7)

  • Ịlaịsha na ndị Siria (8-23)

    • E meghere anya onye na-ejere Ịlaịsha ozi (16, 17)

    • E mere ka ndị Siria kpuo ìsì (18, 19)

  • Oké ụnwụ dara na Sameria mgbe ndị Siria nọchibidoro ya (24-33)

6  E nwere otu ụbọchị ụmụ ndị amụma+ gwara Ịlaịsha, sị: “Ebe a anyị na gị bi abaghị anyị.  Biko, ka anyị gaa n’akụkụ Osimiri Jọdan. Ka onye ọ bụla n’ime anyị gaa ebe ahụ gbute osisi ka anyị jiri ya rụọ ebe anyị ga-ebi.” Ya asị ha: “Gawanụ.”  Otu onye n’ime ha asị ya: “Biko, ị̀ ga-esonụ ndị ohu gị gaa?” Ya asị ya: “M ga-eso unu.”  O wee soro ha, ha agaruo n’akụkụ Osimiri Jọdan malite igbutusị osisi.  Ka otu onye nọ na-egbutu osisi, isi anyụike ya dabara na mmiri, ya etie mkpu, sị: “Ewoo, nna m ukwu, arịọtara m ya arịọta!”  Onye nke ezi Chineke asị ya: “Olee ebe ọ danyere?” Ya egosi ya ebe ọ danyere. Ya egbute osisi tụnye ebe ahụ, isi anyụike ahụ esee n’elu mmiri.  Ya asị ya: “Were ya.” Ya amatịa aka were ya.  E nwere oge eze Siria chọrọ ịlụso ndị Izrel agha.+ Ya na ndị na-ejere ya ozi agaa kwurịta otú ha ga-esi aga. Ya ekwuo ebe ndị ha ga-amagasị ụlọikwuu.”  Onye nke ezi Chineke+ wee zigara eze Izrel ozi, sị: “Lezie anya ka ị ghara isi ebe dị otú a ebe dị otú a gafee, n’ihi na ndị Siria ga-aga ebe ahụ.” 10  Eze Izrel wee gwa ndị ya nọ ebe ahụ ihe onye nke ezi Chineke gwara ya. Ọ gwara ya ụdị ihe a ugboro ugboro. Ọ gafeghịkwa ebe ndị ahụ ọ gwara ya.+ 11  Ihe a kpasuru eze Siria ezigbo iwe, nke mere na ọ kpọkọrọ ndị na-ejere ya ozi, sị ha: “Gwanụ m, ònye n’ime anyị dịnyeere eze Izrel?” 12  Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi asị: “Onyenwe m eze, e nweghị onye n’ime anyị dịnyeere ya. Ọ bụ Ịlaịsha onye amụma nọ n’Izrel na-akọrọ eze Izrel ihe niile ị na-ekwu n’ụlọ ị na-anọ ehi ụra.”+ 13  Ya asị: “Gaanụ chọpụta ebe ọ nọ, ka m ziga ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya.” Ha mechara bịa kọọrọ ya, sị: “Ọ nọ na Dotan.”+ 14  Ozugbo ahụ, o ziri ìgwè ndị agha, ha ejiri ịnyịnya na ụgbọ agha gaa ebe ahụ. Ha gara n’abalị gbaa obodo ahụ gburugburu. 15  Mgbe onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi biliri n’isi ụtụtụ pụta n’èzí, ọ hụrụ ìgwè ndị agha ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. Ya asị Ịlaịsha ozugbo: “Ewoo, nna m ukwu! Gịnị ka anyị ga-eme?” 16  Ma ọ sịrị: “Atụla egwu,+ n’ihi na ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.”+ 17  Ịlaịsha malitekwara ikpe ekpere, sị: “Jehova, biko, meghee anya ya ka ọ hụ ụzọ.”+ Ozugbo ahụkwa, Jehova meghere anya onye ahụ na-eje ozi, ya ahụ na ihe juru n’ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu bụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha ndị na-acha ọkụ ọkụ,+ ndị gbara Ịlaịsha gburugburu.+ 18  Mgbe ndị Siria bịawara ebe Ịlaịsha nọ, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Biko, mee ka ndị a* kpuo ìsì.”+ O wee mee ka ha kpuo ìsì* otú Ịlaịsha rịọrọ ka o mee. 19  Ịlaịsha asịzie ha: “Ebe a abụghị ụzọ. Obodo a abụghịkwa obodo unu na-aga. Soronụ m ka m duru unu gakwuru nwoke unu na-achọ.” Ma, o duuru ha ruo Sameria.+ 20  Mgbe ha rutere Sameria, Ịlaịsha sịrị: “Jehova, biko, meghee anya ha ka ha hụ ụzọ.” Jehova wee meghee anya ha, ha ahụ na ha nọ n’etiti Sameria. 21  Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ gwara Ịlaịsha, sị: “Onyenwe m, ọ̀ bụ m gbuo ha?” 22  Ma ọ sịrị: “Egbula ha. Ị̀ na-egbu ndị i ji mma agha gị na ụta gị dọrọ n’agha? Nye ha nri ka ha rie, nyekwa ha mmiri ka ha ṅụọ,+ ka ha lakwuru onyenwe ha.” 23  O wee meere ha nnukwu oriri, ha erie, ṅụọkwa. Mgbe ha richara ṅụchaa, ọ hapụrụ ha ka ha lakwuru onyenwe ha. Ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke ndị Siria+ abataghịkwa ọzọ n’Izrel. 24  Ka oge na-aga, Ben-hedad eze Siria kpọkọtara ndị agha ya niile, ha agaa nọchibido Sameria.+ 25  Oké ụnwụ+ mechara daa na Sameria. Ndị Siria nọchibidokwara ya ruo mgbe otu isi jakị+ dara mkpụrụ ego ọlaọcha iri asatọ, otu ụzọ n’ụzọ anọ kab* nsị nduru adaakwa mkpụrụ ego ọlaọcha ise. 26  Ka eze Izrel nọ na-aga n’elu mgbidi, otu nwaanyị tiri mkpu rịọ ya, sị: “Onyenwe m eze, biko, nyere anyị aka!” 27  Eze asị ya: “Ọ bụrụ na Jehova enyereghị gị aka, olee otú m ga-esi nyere gị aka? Ì chere na m nwere nri ma ọ bụ mmanya ma ọ bụ mmanụ m ga-enye gị?” 28  Eze jụkwara ya, sị: “Gịnị bụ nsogbu gị?” Ya asị: “Nwaanyị a sịrị m, ‘Weta nwa gị ka anyị rie taa, o ruo echi, anyị erie nwa nke m.’+ 29  N’ihi ya, anyị siri nwa m rie.+ N’echi ya, mụ asị ya, ‘Weta nwa gị ka anyị rie.’ Ma o zoro nwa ya.” 30  Ozugbo eze nụrụ ihe nwaanyị ahụ kwuru, ọ dọwara uwe ya.+ Ka ọ na-agakwa n’elu mgbidi ahụ, ndị mmadụ hụrụ na ihe o yi n’ime bụ ákwà iru uju. 31  Eze wee sị: “Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na mụ egbupụghị Ịlaịsha nwa Shefat isi taa!”+ 32  Ịlaịsha nọ ọdụ n’ụlọ ya, ya na ndị okenye nọkwa. Ma, eze ziri otu nwoke ka o buru ya ụzọ gawa, ma, tupu ya erute, Ịlaịsha sịrị ndị okenye ahụ: “Ùnu ahụla otú nwa ogbu mmadụ a+ si zie mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi? Lewenụ anya, ka ọ ga-abụ, onye ahụ rute, unu emechie ụzọ, ka ọ ghara ịbata. Ọ̀ kwa onyenwe ya sochiri ya azụ?” 33  Mgbe ya na ha ka nọ na-ekwu okwu, onye ozi ahụ bịakwutere ya. Eze bịakwara, sị: “Ọdachi a si n’aka Jehova. Gịnị mere m ga-eji ka na-eche ka Jehova nyere anyị aka?”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mba a.”
O nwere ike ihe a abụghị ikpu ìsì nkịtị. O nwere ike ịbụ na Chineke mere ka ha gharazie ịma ebe ha nọ.
Kab bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kab bụ lita 1.22. Gụọ B14.