Ndị Eze nke Abụọ 7:1-20

  • Ịlaịsha buru amụma mgbe oké ụnwụ ahụ ga-akwụsị (1, 2)

  • Ndị Izrel hụrụ nri ndị Siria hapụrụ ebe ha mara ụlọikwuu gbaa ọsọ (3-15)

  • Amụma Ịlaịsha buru mezuru (16-20)

7  Ma, Ịlaịsha sịrị, “Nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova kwuru, sị: ‘N’ụdị oge a echi n’ọnụ ụzọ ámá* Sameria, otu sia* ntụ ọka e gwere nke ọma ga-ada otu shekel,* sia abụọ ọka bali juru ga-adakwa otu shekel.’”+  Osote onyeisi ndị agha, onye eze tụkwasịrị obi, gwara onye nke ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na Jehova emeghee eluigwe, nri ezowe ka mmiri, ihe a ò nwere ike ime eme?+ Ịlaịsha asị ya: “Ị ga-eji anya gị hụ ya,+ ma ị gaghị eri ya.”+  E nwere ndị ekpenta anọ nọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ.+ Ha gwara ibe ha, sị: “Gịnị mere anyị ga-eji nọrọ ebe a nwụọ?  Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Ka anyị banye n’ime obodo,’ ebe ọ bụ na ụnwụ dị ebe ahụ,+ anyị ga-anwụ ebe ahụ. Ọ bụrụkwa na anyị anọrọ ebe a, anyị ga-anwụkwa. Ka anyị gaanụ ebe ndị agha Siria mara ụlọikwuu. Ọ bụrụ na ha ahapụ anyị ndụ, anyị adịrị ndụ. Ma ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị anwụọnụ.”  Mgbe chi jiri, ha biliri gawa ebe ndị Siria mara ụlọikwuu. Mgbe ha ruru nso ebe ahụ, o nweghị onye nọ ya.  Ọ bụ Jehova mere ka ndị agha Siria nụ ụda ụgbọ agha, ụda ịnyịnya, na ụda ìgwè ndị agha,+ ha asị ibe ha: “Eze Izrel agaala goo ndị eze ndị Het na ndị eze Ijipt ka ha bịa lụso anyị agha!”  Ozugbo ahụ, ha biliri gbaa ọsọ n’abalị ahụ, hapụ ụlọikwuu ha, ịnyịnya ha, na jakị ha. Ha hapụrụ ihe niile dị ebe ahụ ha mara ụlọikwuu gbaa ọsọ ndụ.*  Mgbe ndị ekpenta a ruru nso n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu, ha banyere n’otu ụlọikwuu rie nri, ṅụọkwa mmanya. Ha chịkwaara ọlaọcha na ọlaedo na uwe ndị dị ebe ahụ gaa zoo ha. Ha lọghachikwara banye n’ụlọikwuu ọzọ were ihe ndị dị ebe ahụ gaa zoo ha.  N’ikpeazụ, ha sịrị ibe ha: “Ihe a anyị na-eme adịghị mma. Anyị kwesịrị ịga kọọrọ ndị ọzọ ihe ọma a merenụ. Ọ bụrụ na anyị egbuo oge chere chi abọọ, e kwesịrị ịta anyị ahụhụ. Ka anyị gaanụ n’obí eze kọọ ihe merenụ.” 10  Ha gakwara kpọọ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha ma kọọrọ ha, sị: “Anyị banyere ebe ndị Siria mara ụlọikwuu, ma, o nweghị onye nọ ebe ahụ, anyị anụghịkwa mkpọtụ mmadụ. Naanị ihe ndị anyị hụrụ bụ ịnyịnya na jakị ndị e liwere eliwe na ụlọikwuu ndị ha hapụrụ.” 11  Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá tiri mkpu ozugbo, gwa ndị nọ n’obí eze ihe a. 12  Eze biliri ozugbo n’abalị ahụ, gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Biko, ka m gwa unu ihe ndị Siria chọrọ ime anyị. Ha ma na agụụ ji anyị.+ Ọ bụ ya mere ha ji si ebe ha mara ụlọikwuu pụọ gaa zoo n’ọhịa, sị, ‘Ha si n’obodo ha pụta, anyị ejide ha ná ndụ, banyekwa n’obodo ha.’”+ 13  Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi asị: “Biko, ka ụfọdụ ndị jiri ịnyịnya ise n’ime ndị fọdụrụ n’obodo anyị gaa. Ha ga-anwụ otú ndị Izrel niile fọdụrụ ga-anwụkwa. Ha ga-anwụ otú ndị Izrel niile nwụrụ anwụ si nwụọ. Ka anyị zie ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.” 14  Ha wee jiri ụgbọ ịnyịnya abụọ, eze ezipụ ha ka ha gaa ebe ndị agha Siria mara ụlọikwuu. Ọ gwakwara ha, sị: “Gaanụ chọpụta ihe merenụ.” 15  Ha gbaara gawa ruo Osimiri Jọdan, hụ na ihe juru n’ụzọ ahụ niile bụ uwe na arịa ndị Siria tụhapụrụ ka ha ji ụjọ na-agbapụ. Ndị ahụ eze ziri ozi laghachikwara kọọrọ eze ihe merenụ. 16  Ndị Izrel gara ebe ahụ ndị agha Siria mara ụlọikwuu bukọrọ ihe ndị dị ebe ahụ. Ihe a mekwara ka otu sia ntụ ọka e gwere nke ọma daa otu shekel, sia abụọ ọka bali juru adaakwa otu shekel, otú Jehova kwuru.+ 17  Eze họpụtara osote onyeisi ndị agha, bụ́ onye ọ tụkwasịrị obi, ka ọ na-elekọta ọnụ ụzọ ámá. Ma, ndị mmadụ nọ na-azọ ya ụkwụ n’ọnụ ụzọ ámá ahụ zọgbuo ya. Ọ nwụrụ otú onye nke ezi Chineke gwara eze oge ahụ eze bịakwutere ya. 18  Ihe niile mere nnọọ otú ahụ onye nke ezi Chineke gwara eze na ha ga-esi mee. Ọ gwara ya, sị: “N’ụdị oge a echi, n’ọnụ ụzọ ámá Sameria, sia abụọ ọka bali juru ga-ada otu shekel. Otu sia ntụ ọka e gwere nke ọma ga-adakwa otu shekel.”+ 19  Ma, osote onyeisi ndị agha ahụ gwara onye nke ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na Jehova emeghee eluigwe, nri ezowe ka mmiri, ihe a i kwuru ò nwere ike ime eme?” Ịlaịsha asị ya: “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eri ya.” 20  Ọ bụkwa nnọọ ihe mere ya, n’ihi na ndị mmadụ nọ na-azọ ya ụkwụ n’ọnụ ụzọ ámá zọgbuo ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ahịa.”
Sia bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu sia bụ lita 7.33. Gụọ B14.
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “gbaa ọsọ maka mkpụrụ obi ha.”