Ndị Eze nke Abụọ 8:1-29

  • E nyeghachiri nwaanyị Shunem ala ya (1-6)

  • Ịlaịsha, Ben-hedad, na Hazel (7-15)

  • Jehoram malitere ịchị Juda (16-24)

  • Ehazaya malitere ịchị Juda (25-29)

8  Ịlaịsha gwara nwaanyị ahụ ọ kpọlitere nwa ya n’ọnwụ,+ sị: “Gị na ezinụlọ gị kwapụ, kwaganụ obodo ọ bụla ọzọ dị unu mma, n’ihi na Jehova ekwuola na ụnwụ ga-ada+ n’ala a afọ asaa.”  Nwaanyị ahụ wee kwapụ otú onye nke ezi Chineke gwara ya. Ya na ezinụlọ ya kwapụrụ gaa biri n’ala ndị Filistia+ ruo afọ asaa.  Mgbe afọ asaa gara, nwaanyị ahụ si n’ala ndị Filistia lọta ma gaa ka ọ rịọ eze ka e nyeghachi ya ụlọ ya na ubi ya.  Eze nọkwa na-agwa Gehezaị bụ́ onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi, sị: “Biko, kọọrọ m oké ihe niile Ịlaịsha mere.”+  Mgbe ọ nọ na-akọrọ eze otú Ịlaịsha si kpọlite mmadụ n’ọnwụ,+ nwaanyị ahụ Ịlaịsha kpọlitere nwa ya n’ọnwụ bịakwutere eze, na-arịọ ya ka e nyeghachi ya ụlọ ya na ubi ya.+ Gehezaị sịrị ozugbo ahụ: “Onyenwe m eze, onye a bụ nwaanyị ahụ. Onye a bụkwa nwa ya ahụ Ịlaịsha kpọlitere n’ọnwụ.”  Eze wee jụọ nwaanyị ahụ otú ihe ahụ si mee, ya akọọrọ ya. Eze akpọọ otu onye na-eje ozi n’obí ya, sị ya: “Nyeghachi nwaanyị a ihe niile bụ́ nke ya, kwụọkwa ya ụgwọ ihe niile ọ gaara enweta n’ubi ya malite n’ụbọchị ọ hapụrụ ala a ruo taa.”  Ịlaịsha gara Damaskọs+ mgbe Ben-hedad+ eze Siria na-arịa ọrịa, a gaa gwa Ben-hedad, sị: “Onye nke ezi Chineke+ bịara ebe a.”  Eze asị Hazel:+ “Were onyinye gakwuru onye nke ezi Chineke.+ Gwa ya ka ọ jụọrọ m Jehova ma m̀ ga-agbake n’ọrịa a.”  Hazel weere ụdị ihe ọma niile dị na Damaskọs, ihe kamel iri anọ ga-ebu, gawa ịhụ ya. Mgbe o ruru, ọ gara guzoro n’ihu ya, sị: “Ben-hedad nwa gị nwoke, bụ́ eze Siria, ziri m ka m jụọ gị ma ọ̀ ga-agbake n’ọrịa ọ na-arịa.” 10  Ịlaịsha asị ya: “Gaa gwa ya na ọ ga-agbake, ma Jehova egosila m na ọ ga-anwụrịrị.”+ 11  O legidekwara Hazel anya ruo mgbe ihere mewere ya. Onye nke ezi Chineke bewekwara ákwá. 12  Hazel ajụọ ya, sị: “Gịnị mere onyenwe m ji na-ebe ákwá?” Ya asị: “N’ihi na ama m ihe ị ga-eme ndị Izrel.+ Ị ga-agba ebe ndị ha rụsiri ike ọkụ. Ị ga-eji mma agha gbuo ụmụ nwoke ha bụ́ ndị dike. Ị ga-eji iwe gbuo ụmụaka ha. Ị ga-abọwakwa ụmụ nwaanyị ha dị ime afọ.”+ 13  Hazel asị: “Olee otú ohu gị bụ́ nkịta efu ga-esi enwe ike ime ihe a?” Ma Ịlaịsha sịrị: “Jehova egosila m na ị ga-abụ eze Siria.”+ 14  Mgbe Ịlaịsha kwuchara ihe a, Hazel lawara gakwuru onyenwe ya, ya ajụọ ya, sị: “Gịnị ka Ịlaịsha gwara gị?” Ya asị: “Ọ gwara m na ị ga-agbake.”+ 15  Ma n’echi ya, Hazel chịịrị ákwà e ji afụchi àkwà,* sụnye ya na mmiri, were ya bịagide n’ihu onyenwe ya ruo mgbe ọ nwụrụ.+ Ọ nọchiziri ya, malite ịchị.+ 16  Mgbe Jehoshafat ka bụ eze Juda, Jehoram+ nwa ya malitere ịchị Juda n’afọ nke ise n’ọchịchị Jehoram+ nwa Ehab eze Izrel. 17  Ọ dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem. 18  Ọ nọ na-akpa àgwà ka ndị eze Izrel,+ otú ndị ezinụlọ Ehab kpara,+ n’ihi na ọ lụrụ nwa Ehab.+ Ọ nọkwa na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 19  Ma Jehova achọghị ịla Juda n’iyi n’ihi Devid ohu ya,+ maka na o kwere ya nkwa na a ga-enwe onye si n’ezinụlọ ya ga na-achị.*+ 20  Ọ bụ n’oge Jehoram na-achị ka ndị Ịdọm nupụụrụ Juda isi,+ nwee eze nke ha.+ 21  Jehoram na ndị agha ya wee jiri ụgbọ ịnyịnya ya niile gaa Zea. O bilikwara n’abalị lụso ndị Ịdọm gbara ya na ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu agha, meriekwa ha. Ndị agha ahụ gbalakwara n’ụlọikwuu ha. 22  Ma Ịdọm ka na-enupụrụ ndị Juda isi ruo taa. N’oge ahụ, ndị Libna+ nupụkwaara ha isi. 23  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoram na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 24  Jehoram mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Ehazaya+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị. 25  N’afọ nke iri na abụọ n’ọchịchị Jehoram nwa Ehab eze Izrel, Ehazaya nwa Eze Jehoram malitere ịchị Juda.+ 26  Ehazaya dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara otu afọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Atalaya+ nwa nwa* Ọmraị+ eze Izrel. 27  Ọ nọkwa na-akpa àgwà ka ndị ezinụlọ Ehab+ ma na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, otú ndị ezinụlọ Ehab mere, n’ihi na nna ya lụrụ nwaanyị n’ezinụlọ Ehab.+ 28  O sooro Jehoram nwa Ehab gaa lụso Hazel eze Siria agha na Remọt-gilied.+ Ma ndị Siria merụrụ Jehoram ahụ́.+ 29  Eze Jehoram lawaziri Jezril+ ka ọ nọrọ ebe ahụ ka ahụ́ ahụ ndị Siria merụrụ ya laa. E merụrụ ya ahụ́ ahụ na Rema mgbe ọ gara lụso Hazel eze Siria agha.+ Ehazaya nwa Jehoram eze Juda gakwara Jezril ka ọ hụ Jehoram nwa Ehab n’ihi ahụ́ ahụ e merụrụ ya.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Na Hibru, “na ọkụ ya na ụmụ ya ga na-enwu mgbe niile.”
Na Hibru, “nwa.”
Ma ọ bụ “n’ihi ọrịa ọ na-arịa.”