Ndị Eze nke Abụọ 9:1-37

  • E tere Jihu mmanụ ka ọ bụrụ eze Izre (1-13)

  • Jihu gburu Jehoram na Ehazaya (14-29)

  • E gburu Jezibel, nkịta erie anụ ya (30-37)

9  Ịlaịsha onye amụma wee kpọọ otu n’ime ụmụ ndị amụma, sị ya: “Kesie ákwà gị ike n’úkwù, werekwa karama mmanụ a gaa Remọt-gilied+ ngwa ngwa.  I ruo ebe ahụ, chọwa Jihu+ nwa Jehoshafat bụ́ nwa Nimshaị. Ya na ụmụnna ya nọ. Ma, gị na ya banye n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime.  Werekwa karama mmanụ a wụọ ya mmanụ n’isi, kwuokwa, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ana m ete gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel.”’+ Megheekwa ụzọ gbapụ ozugbo.”  Onye ahụ na-ejere onye amụma ozi wee gawa Remọt-gilied.  Mgbe o ruru, ndị isi ndị agha nọ ọdụ ebe ahụ. Ya asị: “Onyeisi, o nwere ihe m chọrọ ịgwa gị.” Jihu ajụọ ya, sị: “Olee onye nke ọ bụ n’ime anyị?” Ya asị: “Onyeisi, ọ bụ gịnwa.”  Jihu wee bilie banye n’ime ụlọ, onye ozi ahụ awụsa mmanụ n’isi ya, gwakwa ya, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘Ana m ete gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị Izrel bụ́ ndị Jehova.+  Gbuo ndị ezinụlọ Ehab onyenwe gị. Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa otú ahụ bọọrọ ndị ohu m ọbọ ọbara ha, ma ndị amụma m ma ndị ohu m ndị ọzọ, ndị Jezibel gburu.+  M ga-ala ndị ezinụlọ Ehab n’iyi. M ga-egbukwa nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ Ehab, ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel.+  M ga-emekwa ka ezinụlọ Ehab dịrị ka ezinụlọ Jeroboam+ nwa Nibat nakwa ka ezinụlọ Beasha+ nwa Ahaịja. 10  Nkịta ga-eri Jezibel n’ala dị na Jezril,+ o nweghịkwa onye ga-eli ya.’” Mgbe o kwuchara ihe a, o meghere ụzọ gbapụ.+ 11  Mgbe Jihu gaghachiri ebe ndị na-ejere onyenwe ya ozi nọ, ha jụrụ ya, sị: “Ọ̀ dịkwa ná mma? Gịnị mere onye ara a ji bịa hụ gị?” Ya asị ha: “Unu manụ ụdị onye ọ bụ na otú o si ekwu okwu.” 12  Ma ha sịrị: “Ọ bụghị eziokwu. Biko, gwa anyị.” Ya asị: “O nwere ihe ndị ọ gwara m, kwuokwa na Jehova kwuru, sị: ‘Ana m ete gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel.’”+ 13  Onye ọ bụla n’ime ha chịịrị uwe ya ngwa ngwa wụsa n’ebe ọ ga-azọkwasị ụkwụ na steepụ.+ Ha fụwakwara opi, na-asị: “Jihu aghọọla eze!”+ 14  Jihu+ nwa Jehoshafat nwa Nimshaị kpaziri nkata ihe ọ ga-eme Jehoram. Jehoram na ndị Izrel niile nọ na-eche nche na Remọt-gilied+ n’ihi Hazel+ eze Siria. 15  Ma, Eze Jehoram mechara laghachi Jezril+ ka a gwọọ ya ahụ́ ndị Siria merụrụ ya mgbe ọ lụsoro Hazel eze Siria agha.+ Jihu wee sị: “Ọ bụrụ na unu* dịnyeere m, unu ekwela ka onye ọ bụla si n’obodo a gbapụ gaa Jezril kọọ ihe merenụ.” 16  Jihu wee gbara ụgbọ ịnyịnya ya gawa Jezril. Jehoram nọ ebe ahụ, o dinakwa edina n’ihi ahụ́ e merụrụ ya. Ehazaya bụ́ eze Juda gakwara ebe ahụ ka o leta ya. 17  Ka onye nche guzo n’ụlọ nche dị na Jezril, ọ hụrụ ìgwè ndị so Jihu na-abịa, ya ekwuo ozugbo ahụ, sị: “O nwere ìgwè mmadụ m na-ahụ ka ha na-abịa.” Jehoram asị: “Kpọọ onye agha na-agba ịnyịnya, zie ya ka ọ gaa hụ ha, ma jụọ ha ma udo ọ̀ dịkwa.” 18  Onye ahụ na-agba ịnyịnya wee gaa hụ ya, sị: “Eze sịrị m jụọ gị ma udo ọ̀ dịkwa.” Ma Jihu sịrị: “Ì ji ‘udo’ eme gịnị? Gafee m n’azụ!” Onye nche ahụ asị: “Onye ozi ahụ garuru ebe ha nọ, ma ọ lọghachibeghị.” 19  O zikwara onye ọzọ na-agba ịnyịnya, onye ahụ agakwuru ha, sị Jihu: “Eze sịrị m jụọ gị ma udo ọ̀ dịkwa.” Ma Jihu sịrị: “Ì ji ‘udo’ eme gịnị? Gafee m n’azụ!” 20  Onye nche ahụ asị: “Ọ garuru ebe ha nọ, ma ọ lọghachibeghị. Otú onyeisi ha si agba ịnyịnya dị ka otú Jihu nwa nwa* Nimshaị si agba, n’ihi na ọ na-agba ịnyịnya ara ara.” 21  Jehoram asị: “Kwadebe ụgbọ ịnyịnya m!” Mgbe a kwadebere ụgbọ ịnyịnya agha ahụ, Jehoram eze Izrel na Ehazaya+ eze Juda anọrọ n’ụgbọ ịnyịnya agha ha gawa ịhụ Jihu. Ha hụrụ ya n’ala Nebọt+ onye Jezril. 22  Ozugbo Jehoram hụrụ Jihu, o kwuru, sị: “Jihu, udo ọ̀ dịkwa?” Ma ọ sịrị: “Olee otú udo ga-esi adị ebe ọ bụ na Jezibel+ nne gị na-agba akwụna,* na-agbagbukwa onwe ya n’afa?”+ 23  Jehoram tụgharịrị ụgbọ ịnyịnya agha ya ozugbo ka ọ gbaa ọsọ, gwakwa Ehazaya, sị: “Ehazaya, a gbaala anyị mgba okpuru!” 24  Jihu wee were ụta ya gbaa Jehoram n’azụ, akụ́ ụta ahụ esi n’obi ya pụta, ya adaa n’ụgbọ ịnyịnya agha ya, nwụọ. 25  Ọ gwakwara Bidka bụ́ osote ya, sị: “Bulite ya ma tụba ya n’ala Nebọt onye Jezril.+ Chetakwa na mụ na gị ji ụgbọ ịnyịnya na-eso Ehab nna ya n’azụ mgbe Jehova kwuru ihe ga-eme ya.+ 26  Jehova kwuru, sị: ‘Ahụrụ m otú e si gbuo Nebọt+ na ụmụ ya ụnyaahụ.’ Jehova kwukwara, sị: “Ọ bụkwa n’ala a ka m ga-akwụ gị ụgwọ+ ihe a i mere.” N’ihi ya, bulite ya ma tụba ya n’ala ahụ otú Jehova kwuru.”+ 27  Mgbe Ehazaya+ eze Juda hụrụ ihe na-emenụ, o si ụzọ e si aga ebe e nwere nnukwu ubi* gbaa ọsọ. (Jihu mechara chụwa ya, sị: “Gbatuokwanụ onye nke a!” Ha gbakwara ya akụ́ mgbe ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya na-agbaga Gọọ, nke dị nso n’Ibliam.+ Ma, ọ gbagidere ruo Megido nwụọ ebe ahụ. 28  Ndị na-ejere ya ozi wee buru ya n’ụgbọ ịnyịnya buga Jeruselem, liekwa ya n’ili ya dị n’Obodo Devid+ ebe e liri nna nna ya hà. 29  Ehazaya+ malitere ịchị Juda n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Jehoram nwa Ehab.) 30  Mgbe Jihu ruru Jezril,+ Jezibel+ anụ na o rutela, ya agaa tee uri anya na-eji oji n’anya ya, chịkọta ntutu isi ya nke ọma, gazie na windo na-ele ihe na-emenụ. 31  Mgbe Jihu si n’ọnụ ụzọ ámá bata, Jezibel sịrị: “Ihe ọ̀ gaziiri Zimraị mgbe o gburu onyenwe ya?”+ 32  Mgbe Jihu leliri anya elu ebe windo ahụ dị, ọ sịrị: “Ònye dịnyeere m? Ònye?”+ Ozugbo ahụ, mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ, ndị na-eje ozi n’obí eze, ledatara anya ebe ọ nọ. 33  Ya asị ha: “Tụdatanụ ya!” Ha wee tụda ya, ọbara ya efesa n’ahụ́ ụlọ ahụ nakwa n’ahụ́ ịnyịnya ndị dị ebe ahụ, Jihu ejiri ịnyịnya ya rịa ya elu. 34  Mgbe ihe a mechara, ọ gara rie ihe, ṅụọkwa mmanya. O kwuziri, sị: “Biko, gaanụ buru nwaanyị a a bụrụ ọnụ lie. A sị kwuwe, ọ bụ nwa eze.”+ 35  Ma mgbe ha gara ili ya, naanị ihe ha hụrụ bụ okpokoro isi ya, ụkwụ ya, na ọbụ aka ya.+ 36  Mgbe ha laghachiri kọọrọ Jihu, ọ sịrị: “Ihe Jehova si n’ọnụ ohu ya bụ́ Ịlaịja onye Tishbe kwuo emezuola.+ O kwuru, sị, ‘Nkịta ga-eri anụ Jezibel n’ala dị na Jezril.+ 37  Ozu Jezibel ga-adịkwa ka nsị anụ n’ubi dị n’ala ahụ dị na Jezril, ka onye ọ bụla hụrụ ya ghara ịma na ọ bụ Jezibel.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “nwa.”
Ma ọ bụ “na-ekpere arụsị.”
Na Hibru, “ụlọ ubi.”