Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 12:1-21

  • Ọhụụ Pọl hụrụ (1-7a)

  • Nsogbu Pọl dị ka ogwu ọ̀ na-adụ ya n’ahụ́ (7b-10)

  • O nweghị ihe ndị na-eme ka hà bụ ndịozi kacha mma ji kara Pọl (11-13)

  • Ihe mere Pọl ji na-echegbu onwe ya maka ndị Kọrịnt (14-21)

12  M kwesịrị ịnya isi. Ka m kwuo gbasara ọhụụ Onyenwe anyị mere ka m hụ+ na ozi o ziri m,+ n’agbanyeghị na o nweghị uru ọ ga-abara m.  E nwere otu onye na-eso ụzọ Kraịst m ma. Afọ iri na anọ gara aga, Onyenwe anyị kpọgara ya n’eluigwe nke atọ. Amaghị m ma ọ̀ gara n’anụ ahụ́. Ọ bụ Chineke ma.  N’eziokwu, ama m onye ahụ. A kpọgara ya na paradaịs. Amaghị m ma ọ̀ gara n’anụ ahụ́. Ọ bụ Chineke ma.  Mgbe ọ nọ na paradaịs, ọ nụrụ okwu ụmụ mmadụ na-ekwesịghị ikwu.  M ga-eji onye ahụ nyaa isi, ma, agaghị m eji onwe m nyaa isi. Kama, ọ bụ ihe ndị na-egosi na mụ adịghị ike ka m ga-eji nyaa isi.  Ọ bụrụgodị na m chọrọ ịnya isi, ọ pụtaghị na anaghị m eche echiche nke ọma, n’ihi na m ga-ekwu eziokwu. Ma, agaghị m anya isi, ka naanị ihe unu ga-eji maka ya kwuo okwu ọma banyere m bụrụ ụdị onye unu hụrụ m bụ ma ọ bụ ihe unu nụrụ m kwuru.  Onye ọ bụla ekwesịghị ibuli m elu n’agbanyeghị na ihe ahụ Chineke mere ka m mata pụrụ iche. N’ihi ya, e nwere ihe na-enye anụ ahụ́ m nsogbu dị ka ogwu ọ̀ na-adụ m n’ahụ́,+ ya adị ka à ga-asị na mmụọ ozi Setan na-ama m ụra.* Ihe a na-eme m ka e wee ghara ibuli m elu karịa otú o kwesịrị.  M rịọrọ Onyenwe anyị ugboro atọ ka o wepụrụ m ihe ahụ dị ka ogwu.  Ma ọ sịrị m: “Amara m ezuolara gị, n’ihi na ọ bụ mgbe ị na-adịghị ike ka m na-egosi ike m.”+ N’ihi ya, obi dị m ezigbo ụtọ na m ga-eji ike m na-adịghị nyaa isi ka Kraịst wee nye m ike.* 10  Ọ bụ ya mere obi ji adị m ụtọ ma ọ bụrụ n’ihi Kraịst ka m ji ghara ịdị ike, ka e ji akparị m, ka m ji nọrọ ná mkpa, ka e ji na-akpagbu m, ka ihe jikwa siere m ike. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-adị ike.+ 11  Ọ bụ unu mere m ji na-ekwu okwu ka onye na-anaghị eche echiche nke ọma. Ma, a sị na unu kwuru okwu ọma banyere m, agaraghị m esi otú a na-ekwu okwu. Ọ bụrụgodị na ọ dịghị onye m bụ, o nweghị ihe ọ bụla ndịozi unu ahụ ndị na-eme ka ọ̀ bụ ha kacha mma ji kara m.+ 12  N’eziokwu, egosiri m unu na m bụ onyeozi. Otú m si gosi ya unu bụ na m tachiri nnọọ obi,+ rụọ ọrụ ebube, meekwa ihe ndị dị ịtụnanya na ihe ndị pụrụ iche.+ 13  Naanị ihe m na-emereghị unu nke m meere ọgbakọ ndị ọzọ bụ na abụrụghị m unu ibu arọ. Ihe a m mere ọ̀ bụ ihe ọjọọ?+ Ya bụrụ ihe ọjọọ, biko, gbagharanụ m. 14  Nke a bụ nke ugboro atọ m ga-abịa hụ unu, agaghịkwa m abụrụ unu ibu arọ ma m bịa. N’ihi na ọ bụ unu ka m na-achọ, ọ bụghị ihe unu nwere.+ N’ihi na a naghị atụ anya ka ụmụ+ kpata akụ̀ dowere ndị mụrụ ha, kama a na-atụ anya ka ndị nne na nna kpata akụ̀ dowere ụmụ ha. 15  Obi ga-atọ m ụtọ iji ndụ m na ihe niile m nwere meere unu* ihe.+ Ọ bụrụ na m ji obi m niile hụ unu n’anya, ọ̀ bụ na unu ekwesịghị iji obi unu niile hụkwa m n’anya? 16  Ma, n’agbanyeghị na abụrụghị m unu ibu arọ,+ unu na-asị na m ghọgburu unu, matakwa unu n’ọnyà. 17  È nwere onye ọ bụla n’ime ndị ahụ m ziteere unu m si n’aka ya rigbuo unu? 18  Ọ bụ m gwara Taịtọs ka ọ bịa hụ unu. Ọ bụkwa m zipụrụ nwanna ahụ so ya. O doro anya na Taịtọs erigbughị unu.+ Ọ̀ bụ na mụ na ha ejighị otu obi rụkọọ ọrụ? Ọ̀ bụ na mụ na ha akpaghị otu àgwà? 19  Ọ bụrụ na unu na-eche na ihe a anyị na-eme bụ ịzara ọnụ anyị, ọ bụghị ya. Kama, anyị na-ekwu eziokwu n’ihu Chineke n’ihi na anyị na-eso ụzọ Kraịst. Ndị m hụrụ n’anya, anyị na-eme ihe a niile iji gbaa unu ume. 20  N’ihi na ọ dị m ka ùnu ga na-eme ihe m na-achọghị ma m bịa, mụnwa ana-emekwa ihe unu na-achọghị. M nwere ike ịhụ ndị na-ese okwu, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị na-azọ ihe, ndị na-ekwu okwu azụ, ndị na-agba asịrị, ndị mpako, na ndị na-akpata ọgba aghara. 21  Ma, Chineke m nwere ike ime ka ihere mee m ma m bịa ọzọ. Obi nwere ike ịjọ m njọ maka na ọtụtụ ndị mere mmehie n’oge gara aga echegharịbeghị. Ha echegharịbeghị n’ihe na-asọ oyi ha na-eme, n’iko ha na-akwa,* nakwa n’ihe ọjọọ ha na-eme n’asọghị anya.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-eti m ihe.”
Na Grik, “ka ike nke Kraịst wee kpuchie m dị ka ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “n’ihe ọjọọ ha na-eme n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.