Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 3:1-18

  • Akwụkwọ ozi e ji aja mma (1-3)

  • Ndị ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ (4-6)

  • Otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ si dị ebube karịa nke ochie (7-18)

3  Ànyị kwesịrị ịgwa unu ndị anyị bụ ọzọ? Ka ànyị kwesịrị idetara unu akwụkwọ ozi iji jaa onwe anyị mma otú ahụ ụfọdụ na-eme, ma ọ bụ nata unu akwụkwọ ozi unu dere iji jaa anyị mma?  Ọ bụ unu bụ akwụkwọ ozi anyị,+ nke e dere n’obi anyị, nke mmadụ niile ma, na-agụkwa.  N’ihi na o doro anya na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị bụ́ ndị ozi dere,+ nke a na-ejighị ịnk dee, kama nke e ji mmụọ Chineke dị ndụ dee. Anyị edeghị ya ná mbadamba nkume,+ kama anyị dere ya n’obi.*+  Chineke esila n’aka Kraịst mee ka obi sie anyị ike n’okwu a.  Anyị erughị eru n’onwe anyị ịrụ ọrụ Chineke, kama, Chineke mere ka anyị ruo eruo ịrụ ọrụ ya.+  N’eziokwu, ọ bụ ya mere ka anyị nwee ike ịbụ ndị ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ọ bụghị ndị ozi nke iwu e dere ede,+ kama nke mmụọ nsọ. N’ihi na iwu e dere ede na-ama ndị mmadụ ikpe ọnwụ,+ ma mmụọ nsọ na-eme ka ndị mmadụ dị ndụ.+  Ma, a ga-emecha wepụ Iwu Mosis nke na-ama ndị mmadụ ikpe ọnwụ, nke e dekwara na nkume.+ Iwu a dị ebube nke na ndị Izrel elegidelighị Mosis anya n’ihu n’ihi otú ihu ya si na-egbuke egbuke.+  Ọ bụrụ na Iwu Mosis dị ebube, gịnịzi mere mmụọ nsọ+ a na-enye na-agaghị eji dị ebube karịa ya?+  N’ihi na ọ bụrụ na Iwu Mosis nke na-ama ndị mmadụ ikpe+ dị ebube,+ ọrụ na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị ezi omume kwesịrị ịdị ebube karịa ya.+ 10  N’eziokwu, ebube Iwu Mosis dị enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ebube ọgbụgba ndụ ọhụrụ.+ 11  N’ihi na ọ bụrụ na nke a ga-ewepụ ewepụ dị ebube mgbe e wetara ya,+ nke ahụ dị ugbu a dị ebube karịa ya.+ 12  Ebe obi siri anyị ike otú a,+ ọnụ na-aka anyị ma anyị na-ekwu okwu. 13  Ma, anyị anaghị eme ka Mosis, onye na-eji ákwà ekpuchi ihu ya+ ka ndị Izrel ghara ịhụ ihe ga-emecha mee ihe ahụ a ga-ewepụ ewepụ. 14  Ma, ha enweghị ike ịghọta ihe ọ bụla.+ Ruokwa taa, ha aghọtabeghị ọgbụgba ndụ ochie ahụ, n’ihi na n’anya ha, a ka ji ákwà kpuchie ya.+ Naanị Kraịst ka e nwere ike isi n’aka ya wepụ ákwà ahụ.+ 15  N’eziokwu, obi ha ka kpọchiri akpọchi dị ka è ji ákwà kpuchie ya,+ nke mere na ha enweghị ike ịghọta ihe Mosis dere.+ 16  Ma mgbe mmadụ lọghachikwutere Jehova,* a na-ewepụ ákwà ahụ.+ 17  Jehova* bụ Mmụọ,+ ndị nwekwara mmụọ Jehova* enwerela onwe ha.+ 18  Anyị niile, ndị wepụrụla ákwà ahụ e ji kpuchie ihu anyị, dị ka enyo nke na-egosi ebube Jehova.* A na-agbanwe anyị niile ka anyị dị ka Chineke ma na-adịkwu ebube otú Jehova,* onye bụ́ Mmụọ, chọrọ ka anyị dịrị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “kama ná mbadamba nkume bụ́ anụ ahụ́, ya bụ, n’obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.