Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 5:1-21

  • Iyiri ụlọ dị n’eluigwe otú e si eyiri uwe (1-10)

  • Ozi nke na-eme ka mmadụ na Chineke dị ná mma (11-21)

    • Onye Chineke kere ọhụrụ (17)

    • Ndị nnọchiteanya na-eje ozi n’aha Kraịst (20)

5  Anyị ma na a kwatuo ụlọ anyị n’ụwa, ya bụ, ụlọikwuu a,+ Chineke ga-enye anyị ụlọ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi n’eluigwe, nke a na-ejighịkwa aka rụọ.+  Anyị na-asụ ude n’ụlọ a bụ́ ahụ́ anyị, ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike iyiri ụlọ anyị nke dị n’eluigwe otú e si eyiri uwe,+  ka ọ ga-abụ, anyị yiri ya, anyị agaghị agba ọtọ.  N’eziokwu, anyị ndị nọ n’ụlọikwuu a na-asụ ude, anyị na-echegbukwa onwe anyị. Ọ bụghị maka na anyị chọrọ iyipụ ụlọikwuu a ka uwe, kama maka na anyị chọrọ ịnọ n’ụlọ anyị dị n’eluigwe,+ ka ndụ ebighị ebi nọchizie ahụ́ anyị a nwere ike ịnwụ anwụ.+  Ọ bụ Chineke kwadebere anyị maka ụdị ndụ a.+ O nyekwala anyị mmụọ nsọ iji mesie anyị obi ike na anyị ga-enweta ngọzi na-abịa.+  N’ihi ya, obi siri anyị ike mgbe niile, anyị makwa na, ebe ọ bụ na anụ ahụ́ anyị bụ ụlọ anyị, anyị anọghị Onyenwe anyị nso.+  Anyị ma ihe a n’ihi na anyị nwere okwukwe, ọ bụghị n’ihi ihe anya anyị hụrụ.  Ma, obi siri anyị ike, ọ kakwaara anyị mma na anyị gara ka anyị na Onyenwe anyị biri, kama ịdị ndụ n’ahụ́ anyị a.+  N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ na-eme ihe dị ya mma, ma anyị na ya ò bi ma anyị na ya ebighị. 10  N’ihi na anyị niile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Kraịst, ka e kpee onye ọ bụla ikpe mgbe ọ ka dị ndụ n’ahụ́ anyị a, ma kpebie onye mere ihe ọma na onye mere ihe ọjọọ.+ 11  N’ihi ya, ebe anyị ma na anyị kwesịrị ịtụ egwu Onyenwe anyị, anyị na-agwa ụmụ mmadụ okwu otú na-eme ka ha kwere, ma, Chineke ma anyị nke ọma. Echekwara m na akọnuche unu enyerela unu aka ịma ụdị mmadụ anyị bụ. 12  Anyị anaghị agwa unu ihe a iji jaa onwe anyị mma, kama ọ bụ iji mee ka unu jiri anyị na-anya isi, ka unu wee mara ihe unu ga-aza ndị ji otú mmadụ dị n’elu ahụ́ na-anya isi+ kama iji otú obi mmadụ dị na-anya isi. 13  N’ihi na ọ bụrụ na isi ezughị anyị okè,+ ọ bụ maka Chineke. Ma, ọ bụrụ na isi zuru anyị okè, ọ bụ maka unu. 14  Ịhụnanya Kraịst na-akpa ike n’ahụ́ anyị, n’ihi na ihe a ka anyị ghọtara: otu onye nwụrụ maka mmadụ niile+ ebe ọ bụ na mmadụ niile anwụọla.* 15  Ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịna-eme ihe masịrị ha,+ kama ka ha na-eme ihe masịrị onye nwụrụ maka ha, nke a kpọlitekwara. 16  N’ihi ya, si ugbu a gawa, anyị agaghị eji naanị ihe anyị hụrụ ekpe mmadụ ibe anyị ikpe.+ Ọ bụrụgodị na anyị sibu otú ahụ na-ele Kraịst anya, anyị anaghịzi eme otú ahụ.+ 17  N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ na Kraịst dị n’otu, ọ bụ onye Chineke kere ọhụrụ.+ Ihe ochie agaala. Ọ bụ ihe ọhụrụ dịzi. 18  Ma ihe niile si n’aka Chineke, onye si n’aka Kraịst mee ka anyị na ya dị ná mma,+ ziekwa anyị ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ya na ha dị ná mma.+ 19  Nke a pụtara na Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ndị mmadụ dị ná mma,+ ọ naghịkwa agụkọrọ ha mmehie ha.+ O ziekwala anyị ka anyị na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ya na ha dị ná mma.+ 20  N’ihi ya, anyị bụ ndị nnọchiteanya Chineke,+ ndị na-eje ozi n’aha Kraịst,*+ dị ka à ga-asị na Chineke si n’ọnụ anyị na-arịọ ndị mmadụ arịrịọ. Ebe anyị bụ ndị na-eje ozi n’aha Kraịst, anyị na-arịọ, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.” 21  Kraịst emeghị mmehie.+ Ma, Chineke ji ya chụọ àjà maka mmehie anyị, ka anyị wee si n’aka ya bụrụ ndị ezi omume n’anya Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ ikpe ọnwụ a mara ụmụ mmadụ maka na ha bụ ndị mmehie ka a na-ekwu ebe a.
Ma ọ bụ “ndị nnọchiteanya na-arụ ọrụ Kraịst.”