Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 1:1-17

  • Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (1-12)

  • Akụnụba Solomọn (13-17)

1  Ọchịchị Solomọn nwa Devid nọ na-esikwu ike. Jehova Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ.+  Solomọn kpọkọkwara ndị Izrel niile, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha, ndị ikpe, nakwa ndị isi niile nọ n’Izrel, ya bụ, ndị isi ọnụmara dị iche iche.  Ya na ndị Izrel niile ahụ ọ kpọkọrọ gakwara n’ebe dị elu dị na Gibiọn,+ n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ụlọikwuu nzute nke ezi Chineke dị. Ọ bụ Mosis ohu Jehova nọ n’ala ịkpa rụọ ya.  Ma, Devid adịla mbụ si na Kiriat-jierim+ bute Igbe ezi Chineke n’ebe ọ maara ya ụlọikwuu na Jeruselem.+ Ọ bụ ebe ahụ ka ọ rụrụ ka a na-adọsa ya.  A dọsakwara ebe ịchụàjà Bezalel+ nwa Yuraị nwa Họọ ji ọla kọpa rụọ+ n’ihu ụlọikwuu Jehova. Solomọn na ndị Izrel na-anọkwa n’ihu ya ekpe ekpere.*  Solomọn nọkwa ebe ahụ chụọ àjà n’ihu Jehova. Ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ,+ nke dị n’ihu ụlọikwuu nzute, jiri otu puku (1,000) anụmanụ chụọ àjà a na-esu ọkụ.  N’abalị ahụ, Chineke mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ, sịkwa ya: “Rịọ m ihe ị chọrọ ka m nye gị.”+  Solomọn asị Chineke: “I gosiri Devid nna m+ na ị hụrụ ya nnọọ n’anya.* I meekwala m eze, mụ anọchie ya.+  Ugbu a, Jehova Chineke, biko mezuo nkwa i kwere Devid nna m,+ n’ihi na ọ bụ gị mere m eze ka m chịwa ndị a dị ọtụtụ ka ájá dị n’ala.+ 10  Nye m amamihe, meekwa ka m mata otú m ga-esi chịa ndị a,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?”+ 11  Chineke wee sị Solomọn: “Ebe ọ bụ ihe a bụ mkpa gị, ebe ọ bụkwa na ị rịọghị ka m nye gị akụnụba, meekwa ka a na-asọpụrụ gị, ị rịọghịkwa ka ndị kpọrọ gị asị nwụọ ma ọ bụkwanụ ka m nye gị ogologo ndụ, kama ị rịọrọ ka m nye gị amamihe, ka m meekwa ka ị mata otú ị ga-esi na-ekpe ndị m m mere gị eze ha ikpe,+ 12  m ga-enye gị amamihe, meekwa ka ị mara ihe. M ga-enyekwa gị akụnụba, meekwa ka a na-asọpụrụ gị. O nweghị eze bu gị ụzọ chịa ma ọ bụkwanụ nke ga-achị ma ị chịchaa ga-ahụ azụ gị anya n’ihe ndị a m ga-enye gị.”+ 13  Solomọn wee si n’ebe dị elu dị na Gibiọn,+ ebe ụlọikwuu nzute dị, lọta Jeruselem. Ọ nọkwa na-achị Izrel. 14  Solomọn nọkwa na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya.* O nwere otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ (1,400) nakwa puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya+ nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+ 15  Ọlaọcha na ọlaedo eze webatara na Jeruselem dị ọtụtụ ka nkume.+ Osisi sida o butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila.*+ 16  Solomọn sikwa n’Ijipt+ na-atụbata ịnyịnya. Ọ bụkwa ndị na-azụrụ ya ahịa na-atụbata ha n’ìgwè n’ìgwè.*+ 17  Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii (600) esi n’Ijipt atụbata otu ụgbọ ịnyịnya, na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise (150) atụbata otu ịnyịnya. Ha na-eresịkwa ha ndị eze niile na-achị ndị Het na ndị nke na-achị ndị Siria.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-anọkwa ebe ahụ ajụ Chineke ase.”
Ma ọ bụ “I gosiri Devid nna m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
O nwere ike ịbụ, “Solomọn sikwa n’Ijipt nakwa na Kiu na-atụbata ịnyịnya; ndị na-azụrụ eze ahịa na-aga Kiu zụta ha.” Kiu a nwere ike ịbụ Silishia.