Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 10:1-19

  • Ndị Izrel gwara Rehoboam na o nweghị ihe jikọrọ ha na ya (1-19)

10  Rehoboam gawara Shikem,+ n’ihi na ndị Izrel niile gara Shikem ka ha chie ya eze.+  Ozugbo Jeroboam+ nwa Nibat nụrụ ya, (ọ ka nọ n’Ijipt n’oge ahụ n’ihi na ọ gbagara ebe ahụ maka Eze Solomọn)+ o si n’Ijipt lọta.  Ndị Izrel ziri Jeroboam ozi ka ọ bịa, ya na ndị Izrel niile abịa gwa Rehoboam, sị:  “Nna gị boro anyị ibu arọ.+ Ma, ọ bụrụ na i mee ka ihe dịtụrụ anyị mfe n’ọrụ siri ike nna gị nyere anyị, meekwa ka ibu* o boro anyị dị mfe, anyị ga na-ejere gị ozi.”  Ya asị ha: “Bịaghachinụ n’abalị atọ taa.” Ha wee lawa.+  Eze Rehoboam wee kpọọ ndị okenye, ndị jeere Solomọn nna ya ozi mgbe ọ dị ndụ, ka ha tụọrọ ya aro ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gịnị ka m ga-aza ndị a?”  Ha asị ya: “Ọ bụrụ na i mete ndị a mma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, zaakwa ha ihe dị mma, ha ga na-ejere gị ozi mgbe niile.”  Ma, ọ nabataghị aro a ndị okenye ahụ tụụrụ ya. Ọ kpọrọ ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, ndị ya na ha tokọrọ, ka ha tụọrọ ya aro.+  Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka anyị ga-aza ndị a bịara gwa m, sị, ‘Mee ka ibu* nna gị boro anyị dị mfe’?” 10  Ụmụ okorobịa ahụ ya na ha tokọrọ asị ya: “Ebe ọ bụ na ha sịrị gị, ‘Nna gị mere ka ibu anyị dị arọ, gịnwa mee ka ọ dịrị anyị mfe,’ ihe a ka ị ga-agwa ha, ‘Mkpịsị aka m nke ntakịrị ga-adị okpotokpo karịa úkwù nna m. 11  Nna m boro unu ibu arọ, ma m ga-atụkwasị ihe n’ibu unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.’” 12  Jeroboam na ndị Izrel niile bịakwutere Rehoboam n’ụbọchị nke atọ, otú ahụ eze gwara ha ka ha bịaghachi n’ụbọchị nke atọ.+ 13  Ma eze ji olu ike gwa ha okwu. Otú a ka Eze Rehoboam si hapụ aro ndị okenye tụụrụ ya. 14  Ọ gwara ndị Izrel ihe ụmụ okorobịa ahụ tụụrụ ya aro ka ọ gwa ha. Ọ gwara ha, sị: “M ga-eme ka ibu unu dịkwuo arọ, m ga-atụkwasịkwa ihe na ya. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.” 15  Otú a ka eze si hapụ ime ihe ndị Izrel rịọrọ ya. Ọ bụ Jehova mere ka ọ hapụ ime ya, ka ezi Chineke+ wee mezuo ihe o si n’ọnụ Ahaịja+ onye Shaịlo gwa Jeroboam nwa Nibat. 16  Ebe ọ bụ na eze emeghị ihe ndị Izrel niile rịọrọ ya, ha sịrị ya: “Gịnị jikọrọ anyị na Devid? E nweghị ihe nwa Jesi anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya. Devid, lekọtawa ụlọ gị.”+ Ndị Izrel niile wee laa n’ụlọ* ha.+ 17  Ma Rehoboam nọ na-achị ndị Izrel bi n’obodo ndị dị n’ebo Juda.+ 18  Eze Rehoboam ziri Hedoram,+ onye na-elekọta ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ, ka ọ gaa hụ ndị Izrel, ma ha ji nkume tụgbuo ya. Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya ya gbalaa Jeruselem.+ 19  Ndị Izrel nọkwa na-enupụrụ ndị ezinụlọ Devid isi ruo taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “yok dị arọ.”
Ma ọ bụ “yok.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu.”