Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 11:1-23

  • Ihe Rehoboam mere mgbe ọ na-achị (1-12)

  • Ndị Livaị ndị ji obi ha niile na-efe Chineke gara biri na Juda (13-17)

  • Ezinụlọ Rehoboam (18-23)

11  Ozugbo Rehoboam lọrutere Jeruselem, ọ kpọkọrọ otu narị puku na puku iri asatọ (180,000) ndị agha a zụrụ azụ,* bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin,+ ka ha gaa lụso ndị Izrel ndị ọzọ agha, ka Rehoboam nwee ike nwetaghachi alaeze ahụ niile.+  Jehova wee gwa Shemaya,+ onye nke ezi Chineke, sị:  “Gwa Rehoboam nwa Solomọn eze Juda na ndị Izrel niile bi na Juda nakwa na Benjamin, sị,  ‘Jehova kwuru, sị: “Unu agala ịlụso ụmụnne unu agha. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ ya, n’ihi na ọ bụ m mere ihe a ji na-eme.”’”+ Ha wee laghachi otú Jehova kwuru. Ha alụsoghịkwa Jeroboam agha.  Rehoboam bi na Jeruselem n’oge ahụ. Ọ rụrụ obodo dị iche iche na Juda, rụsiekwa ha ike.  Obodo ndị ọzọ ọ rụsiri ike bụ Betlehem,+ Itam, Tekoa,+  Bet-zọọ, Soko,+ Adọlam,+  Gat,+ Marisha, Zif,+  Adoreyim, Lekish,+ Azika,+ 10  Zora, Aịjalọn,+ na Hebrọn.+ Obodo ndị a a rụsiri ike dị na Juda na Benjamin. 11  Ọ rụsikwuru ebe ndị a rụsiri ike ike, dowekwa ndị agha na ha, na-ebugakwa nri, mmanụ, na mmanya n’ebe ndị ahụ. 12  O dowekwara ọta ukwu na ube n’obodo ndị ahụ niile. Ọ rụsikwuru ha nnọọ ike. Ọ nọgidekwara na-achị ndị Juda na ndị Benjamin. 13  Ndị nchụàjà na ndị Livaị, ndị bi n’ebe niile n’Izrel, si n’ebe dị iche iche ha bi bịa na-akwado ya. 14  Ndị Livaị hapụrụ ala ha nakwa ala anụmanụ ha na-ata ahịhịa+ bịa na Juda nakwa na Jeruselem, n’ihi na Jeroboam na ụmụ ya kwụsịrị ha ịrụ ọrụ ndị nchụàjà ha na-arụrụ Jehova.+ 15  Jeroboam họpụtaziri ndị nchụàjà nke ya ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu+ na-efe ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu*+ na ụmụ ehi ndị ọ kpụrụ.+ 16  Ndị ji obi ha niile na-achọ Jehova bụ́ Chineke Izrel si n’ebo niile n’Izrel soro ndị nchụàjà na ndị Livaị bịa Jeruselem ịchụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha àjà.+ 17  Ha mere ka alaeze Juda sie ike, kwadokwa Rehoboam nwa Solomọn ruo afọ atọ, n’ihi na ha sooro ụzọ Devid na Solomọn ruo afọ atọ. 18  Rehoboam lụrụ Mehalat nwa Jerimọt nwa Devid. Nne Mehalat bụ Abihel nwa Elayab nwa Jesi.+ 19  Mehalat mụụrụ ya ụmụ nwoke. Ha bụ Jiọsh, Shemaraya, na Zeham. 20  O mechakwara lụọ Meaka nwa nwa Absalọm.+ Ka oge na-aga, ọ mụụrụ ya Abaịja,+ Ataị, Zaịza, na Shelomit. 21  Rehoboam hụrụ Meaka nwa nwa Absalọm n’anya karịa ndị nwunye ya ndị ọzọ niile na ndị iko ya.+ Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na asatọ, nweekwa ndị iko iri isii. Ha mụtakwaara ya ụmụ nwoke iri abụọ na asatọ na ụmụ nwaanyị iri isii. 22  Rehoboam mekwara Abaịja nwa Meaka onyeisi na onye ndú ụmụnne ya, n’ihi na o bu n’obi ime ya eze. 23  Ma, o ji akọ* kesasịa ụfọdụ n’ime ụmụ ya ndị nwoke ná mpaghara niile n’obodo niile a rụsiri ike na Juda na Benjamin,+ nyekwa ha nnukwu ihe oriri ma lụọrọ ha ọtụtụ ụmụ nwaanyị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “a họrọ ahọ.”
Na Hibru, “ewu dị iche iche.”
Ma ọ bụ “o gosiri na o nwere nghọta.”