Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 12:1-16

  • Shaịshak lụsoro Jeruselem agha (1-12)

  • Mgbe Eze Rehoboam nwụrụ (13-16)

12  Ozugbo aka siri Rehoboam ike n’ọchịchị,+ alaeze ya esiekwa ezigbo ike, ya na ndị Izrel niile hapụrụ Iwu Jehova.+  N’afọ nke ise n’ọchịchị Eze Rehoboam, Shaịshak+ eze Ijipt bịara lụso Jeruselem agha, n’ihi na ha nupụụrụ Jehova isi.  Shaịshak ji otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị abụọ (1,200) si Ijipt bịa. Puku mmadụ iri isii (60,000) ndị na-agba ịnyịnya, na imirikitiimi ndị agha sokwa ya bịa, ma ndị Libia ma ndị Sọkiyim ma ndị Etiopia.+  O weghaara obodo ndị a rụsiri ike dị na Juda, mechaakwa rute Jeruselem.  Shemaya+ onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndị isi Juda, ndị gbakọrọ na Jeruselem n’ihi Shaịshak, sị ha: “Jehova kwuru, sị, ‘Unu hapụrụ m. N’ihi ya, mụnwa enyefeekwala unu n’aka Shaịshak.’”+  Ndị isi Izrel na eze wee weda onwe ha ala,+ sị: “Ihe Jehova mere dị mma.”  Mgbe Jehova hụrụ na ha ewedala onwe ha ala, Jehova gwara Shemaya, sị: “Ha ewedala onwe ha ala. Agaghị m ebibi ha.+ M ga-anapụta ha n’oge na-adịghị anya. Agaghị m ewesa Jeruselem iwe ma nyefee ha n’aka Shaịshak.  Ma, ha ga na-ejere ya ozi, ka ha wee mara ihe dị iche n’ijere m ozi na ijere eze* ndị obodo ọzọ ozi.”  Shaịshak eze Ijipt bịara lụso Jeruselem agha. O bukọọrọ akụ̀ dị n’ụlọ Jehova+ nakwa akụ̀ dị n’ụlọ* eze. O buuru ihe niile, ma ọta ọlaedo ndị Solomọn rụrụ.+ 10  Eze Rehoboam wee were ọla kọpa rụọ ọta ọ ga-eji dochie ha. O nyefekwara ha n’aka ndị isi ndị nche,* ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọ eze nche. 11  Mgbe ọ bụla eze bịara n’ụlọ Jehova, ndị nche ahụ na-abata buru ha. Ha na-emechakwa bughachi ha n’ụlọ ndị nche. 12  Ebe ọ bụ na eze wedara onwe ya ala, iwe Jehova na-ewesa ya dajụrụ.+ Ọ laghịkwa ha n’iyi kpamkpam.+ Ihe ọzọkwa bụ na a ka nwere ihe dị mma a na-eme na Juda.+ 13  Eze Rehoboam nọ na-achị, na-emekwa ka ọchịchị ya sie ike na Jeruselem. Rehoboam dị afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jeruselem, bụ́ obodo Jehova họọrọ n’ime ebo niile n’Izrel ka a nọrọ na-eto aha ya. Aha nne Rehoboam bụ Neama. Ọ bụ nwaanyị Amọn.+ 14  Ma Rehoboam nọ na-eme ihe ọjọọ, n’ihi na obi ya adịghị n’ime ihe Jehova chọrọ.+ 15  E dere akụkọ gbasara Rehoboam, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. Ọ bụ Shemaya+ onye amụma na Ido+ onye ọhụụ dere ya n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche. Rehoboam na Jeroboam nọkwa na-alụ agha oge niile.+ 16  N’ikpeazụ, Rehoboam nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. E likwara ya n’Obodo Devid.+ Abaịja nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “alaeze.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”