Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 13:1-22

  • Abaịja malitere ịchị Juda (1-22)

    • Abaịja meriri Jeroboam (3-20)

13  N’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Jeroboam eze Izrel, Abaịja malitere ịchị Juda.+  Ọ chịrị afọ atọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Mịkaya,+ nwa Yurayel onye Gibia.+ Abaịja na Jeroboam lụsokwara ibe ha agha.+  Ndị agha Abaịja chị gaa agha ahụ dị narị puku anọ (400,000). Ha bụ ndị dike a zụrụ azụ.*+ Ndị agha nke Jeroboam dịkwa narị puku asatọ (800,000). Ha bụkwa ndị dike a zụrụ azụ.* Jeroboam haziri ha n’usoro maka agha ahụ.  Abaịja wee guzoro n’Ugwu Zemareyim, nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, sị: “Jeroboam na ndị Izrel niile, geenụ m ntị.  Ọ̀ bụ na unu amaghị na Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere Devid na ụmụ ya+ alaeze ka ha na-achị ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi?+ O nyere ha alaeze a mgbe ya na Devid gbara ndụ ga-adịru ebighị ebi.*+  Ma Jeroboam+ nwa Nibat, onye na-ejere Solomọn nwa Devid ozi, nupụụrụ onyenwe ya isi.+  Ndị na-abaghị uru, na-enweghịkwa ihe ha na-arụ sokwa ya nupụrụ Rehoboam nwa Solomọn isi, maka na Rehoboam bụ obere nwa, isi akabeghịkwa ya. O nweghịkwa ihe o nwere ike ime ha.  “Ugbu a, unu chere na unu ga-anapụli ụmụ Devid alaeze Jehova dị ha n’aka maka na unu dị ọtụtụ, nweekwa chi ụmụ ehi Jeroboam ji ọlaedo kpụọrọ unu.+  Unu chụpụrụ ndị nchụàjà Jehova,+ bụ́ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livaị. Unu họpụtakwara ndị nchụàjà nke unu otú ndị ala ọzọ na-eme.+ Ọ na-abụ, onye weta otu oké ehi na ebule asaa, ya aghọọ onye nchụàjà nke ihe ndị na-abụghị chi. 10  Ma, ọ bụ Jehova bụ Chineke anyị.+ Anyị ahapụghịkwa ya. Ndị nchụàjà anyị, bụ́ ụmụ Erọn, na-ejere Jehova ozi, ndị Livaị ana-enyekwara ha aka. 11  N’ụtụtụ ọ bụla nakwa ná mgbede ọ bụla, ha na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ na-amụnyekwa insens na-esi ísì ọma.+ Ha na-edosa achịcha a na-enye Chineke+ na tebụl e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ. Ná mgbede ọ bụla, ha na-aga n’ihe e ji ọlaedo rụọ e ji adọsa ọkụ,* mụnye ọkụ na ya.+ Ha na-eme ihe ndị a n’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị chọrọ ka anyị na-eme ha. Ma ununwa anaghịzi eme ha. 12  Ma, ezi Chineke nọnyeere anyị, na-edukwa anyị. Ndị nchụàjà ya jikwa opi ha ga-afụ iji gbaara anyị àmà ka anyị lụso unu agha. Ndị Izrel, unu alụsokwala Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà agha, n’ihi na unu agaghị emeri.”+ 13  Ma, Jeroboam ziri ụfọdụ ndị agha ya ka ha gaa zoo n’azụ ndị Juda, nke mere ka ndị agha ya nọrọ ndị Juda n’ihu, ndị agha ya ndị nke zoro ezo anọrọkwa ha n’azụ. 14  Mgbe ndị Juda tụgharịrị, ha hụrụ na e si ihu na azụ na-abịa ịlụso ha agha. Ha wee malite ịkpọku Jehova,+ ka ndị nchụàjà nọ na-afụsi opi ike. 15  Ndị Juda malitekwara iti mkpu agha. Mgbe ha tiwere ya, ezi Chineke mere ka Abaịja na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel niile. 16  Ndị Izrel gbaara ndị Juda ọsọ. Chineke nyefekwara ha n’aka ha. 17  Abaịja na ndị agha ya sụrụ ha akwụ, gbuo narị puku ndị agha ise (500,000) a zụrụ azụ.* 18  Otú a ka e si menye ndị Izrel ihere n’oge ahụ. Ma, ndị Juda meriri ha maka na ha tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha obi.+ 19  Abaịja nọkwa na-achụ Jeroboam, narakwa ya obodo dị iche iche. Ọ naara ya Betel+ na ime obodo ndị dị ya nso,* Jeshana na ime obodo ndị dị ya nso, nakwa Ifren+ na ime obodo ndị dị ya nso. 20  N’oge Abaịja na-achị, Jeroboam esighịzi ike otú o siburu. Jehova takwara ya ahụhụ, ya anwụọ.+ 21  Ma Abaịja mere ka alaeze ya sikwuo ike. Ka oge na-aga, ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na anọ,+ ha amụtara ya ụmụ nwoke iri abụọ na abụọ na ụmụ nwaanyị iri na isii. 22  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara ndụ Abaịja n’akwụkwọ, ma ihe ndị o mere ma ihe ndị o kwuru. Ọ bụ Ido onye amụma dere ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “a họrọ ahọ.”
Na Hibru, “a họrọ ahọ.”
Na Hibru, “gbara ọgbụgba ndụ nnu.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Hibru, “a họrọ ahọ.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”