Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 15:1-19

  • Ihe ọma dị iche iche Esa mere (1-19)

15  Mmụọ Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded,  ya agakwuru Esa, sị ya: “Esa na ndị Juda niile na ndị Benjamin niile, geenụ m ntị. Ọ bụrụhaala na unu ahapụghị Jehova, ọ ga-anọnyere unu.+ Ọ bụrụkwa na unu achọọ ya, unu ga-achọta ya,+ ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụkwa unu.+  O teela ndị Izrel hapụrụ ife ezi Chineke, nọrọ n’enweghị onye nchụàjà na-akụziri ha ihe, nọrọkwa n’enweghị iwu ha na-edebe.+  Ma, ha tawa ahụhụ, ha na-alọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel. Ha na-achọkwa ya ma chọta ya.+  N’oge ahụ, onye ọ bụla na-aga ihe na-achị obi n’aka,* n’ihi na ọgba aghara dị ná mpaghara niile n’Izrel.  Otu ndị na-ebibi ndị ọzọ, otu obodo ana-ebibikwa obodo ọzọ, n’ihi na Chineke ji ụdị nsogbu niile tinye ha n’ọgba aghara.+  Ma, obi sie unu ike, unu adakwala mbà,*+ n’ihi na a ga-akwụ unu ụgwọ maka ọrụ unu.”  Ozugbo Esa nụrụ ihe ndị a, nụkwa amụma a Oded onye amụma buru, obi siri ya ike, ya ewepụchaa arụsị dị iche iche na-asọ oyi,* ndị dị n’ala Juda+ na Benjamin niile nakwa n’obodo ndị o weghaara n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. Ọ rụzikwara ebe ịchụàjà Jehova dị n’ihu ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ Jehova.+  Ọ kpọkọtakwara ndị Juda niile, ndị Benjamin niile, na ndị mbịarambịa ndị si n’ebo Ifrem, n’ebo Manase, na n’ebo Simiọn bịa soro ha biri.+ Ndị mbịarambịa a si n’Izrel gbakwuru ya mgbe ha hụrụ na Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya. 10  Ha niile gbakọrọ na Jeruselem n’ọnwa nke atọ, n’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Esa. 11  N’ụbọchị ahụ, ha jikwa narị ehi asaa (700) na puku atụrụ asaa (7,000) so n’ihe ndị ha kwatara n’agha chụọrọ Jehova àjà. 12  Ha gbakwara ndụ na ha ga-eji obi ha niile na mkpụrụ obi* ha niile na-achọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.+ 13  Ha kwekọrịtakwara na a ga-egbu onye ọ bụla hapụrụ ịchọ Jehova bụ́ Chineke Izrel, ma ọ̀ bụ onye ukwu ma ọ̀ bụ onye nta, ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị.+ 14  Ha ji oké olu ṅụọrọ Jehova iyi, na-eti mkpu ọṅụ, na-afụkwa opi. 15  Ndị Juda niile ṅụrịkwara ọṅụ maka iyi ahụ ha ṅụrụ n’ihi na ha ji obi ha niile ṅụọ ya. Ha chọsiri Jehova ike ma chọta ya.+ O mekwara ka ha zuru ike n’ebe niile ha nọ.+ 16  Eze Esa chụtukwara Meaka+ bụ́ nne nna ya n’ọkwá ka ọ gharazie ịbụ nnukwu nwaanyị.* Ọ chụturu ya maka na o mere arụsị jọgburu onwe ya a na-eji efe ogwe osisi arụsị.*+ Esa gbuturu arụsị ahụ jọgburu onwe ya, gwerie ya ma kpọọ ya ọkụ na Ndagwurugwu Kidrọn.+ 17  N’agbanyeghị na Esa ebibighị ebe ndị dị elu n’Izrel,+ o ji obi ya niile* jeere Chineke ozi ná ndụ* ya niile.+ 18  O webatakwara ọlaọcha, ọlaedo, na arịa dị iche iche ya na nna ya doro nsọ n’ụlọ ezi Chineke.+ 19  N’oge Esa na-achị, o nweghị ndị ha na ha lụrụ agha ruo n’afọ nke iri atọ na ise n’ọchịchị ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “udo adịrịghị onye na-apụ apụ ma ọ bụ onye na-abata abata.”
Na Hibru, “unu akụdakwala aka.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “eze nwaanyị.”
Ma ọ bụ “obi zuru ezu.”
Na Hibru, “n’ụbọchị.”