Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 16:1-14

  • Esa gakwuuru ndị Siria ka ha nyere ya aka (1-6)

  • Hanenaị baara Esa mba (7-10)

  • Mgbe Esa nwụrụ (11-14)

16  N’afọ nke iri atọ na isii n’ọchịchị Esa, Beasha eze+ Izrel lụsoro Juda agha, malitekwa ịrụsi Rema ike+ ka onye nọ ebe Esa eze Juda nọ ghara isi ebe ahụ pụọ ma ọ bụ ka onye na-anọghị ebe Esa nọ ghara ịbanye ebe ọ nọ.*+  Esa wee si n’akụ̀ dị n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze wepụta ọlaọcha na ọlaedo+ bugara Ben-hedad eze Siria,+ onye bi na Damaskọs. Ọ gwakwara Ben-hedad, sị:  “Mụ na gị gbara ndụ. Nna m na nna gị gbakwara ndụ. M na-ebutere gị ọlaọcha na ọlaedo. Bịa mebie ọgbụgba ndụ gị na Beasha eze Izrel, ka o wee hapụ m.”  Ben-hedad gere Eze Esa ntị wee ziga ndị isi ndị agha ya, ha agaa lụso obodo ndị dị n’Izrel agha, bibie Aịjọn,+ Dan,+ Ebel-meyim, na ebe niile a na-akwasa ihe n’obodo ndị dị na Naftalaị.+  Ozugbo Beasha nụrụ ya, ọ kwụsịrị ịrụ Rema.  Eze Esa kpọọrọ ndị Juda niile, ha agaa buru nkume na osisi ndị Beasha ji na-arụsi Rema ike.+ O jikwa ha rụsie Giba na Mizpa ike.+  N’oge ahụ, Hanenaị+ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Esa eze Juda, sị ya: “Ebe ọ bụ na ị tụkwasịrị eze Siria obi kama ịtụkwasị Jehova bụ́ Chineke gị obi, ị gaghịzi emerili ndị agha eze Siria.+  Ọ̀ kwa ndị Etiopia na ndị Libia nwere imirikitiimi ndị agha, nweekwa ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya? Ma Jehova nyefere ha n’aka gị maka na ị tụkwasịrị ya obi.+  N’eziokwu, anya Jehova na-ahụzu ụwa niile+ iji gosi ike ya maka* ndị ji obi ha niile* na-efe ya.+ I zuzuru nzuzu n’ihe a i mere. Si ugbu a gawa, a ga na-alụso gị agha.”+ 10  Ma Esa wesara onye ọhụ ụzọ ahụ iwe, kpọchie ya n’ụlọ nga,* n’ihi na ezigbo iwe ji ya maka ihe ahụ o kwuru. N’oge ahụ, Esa malitekwara ichi ụfọdụ n’ime ndị obodo ya ọnụ n’ala. 11  Ma, e dere akụkọ gbasara ndụ Esa, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ e dere gbasara ndị eze Juda na Izrel.+ 12  N’afọ nke iri atọ na itoolu n’ọchịchị Esa, ihe mere ya n’ụkwụ, ya emechaakwa rịasiwe ọrịa ike. Ma, ọ rịọghịdị Jehova ka o mee ka ọ gbakee n’ọrịa a, kama ọ gara chọwa ndị na-agwọ ọrịa. 13  N’ikpeazụ, Esa nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ.+ Ọ nwụrụ n’afọ nke iri anọ na otu n’ọchịchị ya. 14  E liri ya ná nnukwu ili o gwuuru onwe ya n’Obodo Devid.+ E nyiwere ya n’àkwà* ihe juru na ya bụ mmanụ balsam na ụdị mmanụ otite dị iche iche a gwara n’ụdị pụrụ iche.+ Ha mụnyekwara ọtụtụ ihe na-esi ísì ọma ọkụ iji kwanyere ya ùgwù n’oge a na-eli ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “isi n’ebe Esa eze Juda na-achị pụọ ma ọ bụ ịbanye n’ebe ahụ.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “iji kwado.”
Ma ọ bụ “ji obi zuru ezu.”
Na Hibru, “n’ụlọ ọtọsị.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”