Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 2:1-18

  • Solomọn kwadebere maka ịrụ ụlọ nsọ (1-18)

2  Solomọn mechakwara kwuo ka e bido ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova+ nakwa obí eze yanwa ga-anọ na-achị.+  Solomọn họpụtara puku mmadụ iri asaa (70,000) ka ha na-arụ ọrụ ndị nkịtị na-arụ,* họpụtakwa puku mmadụ iri asatọ (80,000) ka ha na-awa nkume n’ugwu.+ Ọ họpụtakwara puku mmadụ atọ na narị isii (3,600) ka ha na-elekọta ha.+  Solomọn zikwara Haịram+ eze Taya ozi, sị: “Butere m osisi sida otú ahụ i buteere Devid nna m nke o ji rụọ ụlọ* o bi.+  M chọrọ ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke m. M ga-edoro ya ụlọ ahụ nsọ, na-anọkwa na ya amụnyere ya insens na-esi ísì ọma.+ Achịcha a na-enye Chineke+ ga na-adịkwa ebe ahụ mgbe niile. M ga na-achụkwa àjà a na-esu ọkụ n’ụtụtụ, ná mgbede,+ n’Ụbọchị Izu Ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ nakwa n’oge ememme dị iche iche+ a na-emere Jehova Chineke anyị. Ihe a ka ndị Izrel ga na-eme.  Ụlọ m na-aga ịrụ ga-ebu ezigbo ibu, n’ihi na Chineke anyị karịrị chi ọ bụla ọzọ.  O nweghị onye ga-arụli ụlọ ọ ga-ebi n’ihi na eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba ya.+ Ònyezi ka m bụ ịrụrụ ya ụlọ? Naanị ihe m ga-emeli bụ ịrụ ụlọ a ga-anọ na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ.  Ugbu a, zitere m onye omenkà bụ́ aka ochie n’iji ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa,+ na ígwè akpụ ihe. Ọ ga-amakwa otú e si akpa ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie* nakwa nke na-acha anụnụ anụnụ. Onye ahụ na ndị omenkà Devid nna m kpọtaara m+ ga-anọ na Juda nakwa na Jeruselem na-arụ ọrụ.  Si na Lebanọn butere m osisi sida, osisi junipa+ nakwa osisi algọm,+ n’ihi na ama m na igbutu osisi ndị dị na Lebanọn+ doro ndị na-ejere gị ozi anya. Ndị na-ejere m ozi ga-eso ndị na-ejere gị ozi rụọ ọrụ+  ka ha gbutere m ọtụtụ osisi, n’ihi na ụlọ m na-aga ịrụ ga-ebu nnukwu ibu. 10  M ga-ebunye ndị na-ejere gị ozi na-egbutu osisi ndị ahụ nri.+ M ga-enye ha ọka wit dị puku kọọ* iri abụọ (20,000), ọka bali dị puku kọọ iri abụọ (20,000), mmanya dị puku bat* iri abụọ (20,000) nakwa mmanụ dị puku bat iri abụọ (20,000).” 11  Haịram eze Taya wee zigara Solomọn akwụkwọ ozi, sị: “Jehova hụrụ ndị ya n’anya, ọ bụ ya mere o ji mee gị eze ha.” 12  Haịram kwukwara, sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye kere eluigwe na ụwa, n’ihi na o nyere Eze Devid nwa ma ihe,+ nke dị akọ, na-aghọtakwa ihe.+ Nwa ya a ga-arụrụ Jehova ụlọ, rụọkwara onwe ya obí eze. 13  M ga-ezitere gị Haịram-ebaị,+ nwoke nwere nkà, na-aghọtakwa ihe nke ọma. 14  Ọ bụ nwa otu nwaanyị si n’ebo Dan. Ma nna ya bụ onye Taya. Ọ bụ aka ochie n’iji ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, ígwè, na nkume akpụ ihe. Ọ makwa otú e si eji osisi arụ ọrụ nakwa otú e si akpa ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha anụnụ anụnụ, ákwà ọma, na ákwà na-acha uhie uhie.+ Ọ makwa otú e si akpụ ụdị ihe ọ bụla a na-akpụ akpụ nakwa otú e si arụpụta ụdị ihe ọ bụla e nyere ya rụọ.+ Ya na ndị omenkà gị nakwa ndị omenkà onyenwe m Devid bụ́ nna gị ga na-arụkọ ọrụ. 15  Ugbu a, ka gịnwa bụ́ onyenwe m butere ndị na-ejere gị ozi ọka wit, ọka bali, mmanụ na mmanya i kwere ná nkwa.+ 16  Anyịnwa ga-esi Lebanọn+ gbutere gị osisi, ole ọ bụla ị chọrọ. Anyị ga-eke ha n’ùkwù n’ùkwù si n’oké osimiri butere gị ha Jọpa,+ gị agazie ebe ahụ buru ha buga Jeruselem.”+ 17  Solomọn wee gụọ ụmụ nwoke niile bụ́ ndị mbịarambịa bi n’Izrel ọnụ,+ otú ahụ Devid nna ya gụrụ ndị mmadụ ọnụ.+ Ọ gụtara otu narị puku mmadụ na puku iri ise na atọ na narị mmadụ isii (153,600). 18  Ọ gwaziri puku mmadụ iri asaa (70,000) n’ime ha ka ha na-arụ ọrụ ndị nkịtị na-arụ,* gwa puku iri asatọ (80,000) ka ha na-awa nkume+ n’ugwu, gwakwa puku mmadụ atọ na narị isii (3,600) ka ha na-elekọta ndị ọrụ, hụkwa na ha na-arụ ọrụ ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ka ha na-ebu ibu dị arọ.”
Ma ọ bụ “obí eze.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ka ha na-ebu ibu dị arọ.”